Amụma Nna anyị megide Babịlọn
Alaeze ukwu ahụ dọọrọ Juda nʼagha ka a mara ikpe nʼonwe ya: e mere Bel ihere, kwatuo mgbidi ya, hapụ ala ahụ nye nkịta ọhịa. Ka ọ dị ugbu a, Izrel na Juda na-alọghachi na-akwa ákwá, na-ajụ ụzọ Zayọn na Nna ha; a chọrọ ikpe ọmụma ha ma ọ dịghị nke a hụrụ, Onye Mgbapụta ha dịkwa ike.
50 1Okwu Nna anyị kwuru banyere Babịlọn, ala ndị Babịlọn, site nʼaka Jeremaya onye amụma:
2Kwupụta nʼetiti mba niile ma kwusaa ya; welie ọkọlọtọ ma kwusaa ya; ezola ihe ọbụla. Kwuo sị: A dọtala Babịlọn nʼagha; Bel emeela ihere, Maduk agbajiela. Oyiyi ya niile emeela ihere, arụsị ya niile agbajiela. a a v2 Bel na Maduk bụ chi ndị isi nke Babịlọn. 3Nʼihi na mba sitere nʼugwu na-abịa imegide ya; ọ ga-eme ka ala ya ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, o nweghịkwa onye ga-ebi nʼime ya. Ma mmadụ ma anụmanụ agbaala ọsọ; ha apụọla.
4Nʼoge ụbọchị ndị ahụ na nʼoge ahụ, ka Nna anyị kwupụtara, ụmụ Izrel ga-abịa, ha na ụmụ Juda ọnụ; ha ga-eji anya mmiri na-aga ije, ha ga-achọkwa Nna ha. 5Ha ga-ajụ ụzọ e si eje Zayọn, ihu ha chere nʼebe ahụ: “Bịanụ, ka anyị jikọọ onwe anyị na Nna anyị nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi nke a na-agaghị echefu echefu.” 6Ndị m bụ atụrụ furu efu; ndị ọzụzụ atụrụ ha duhiere ha, na-eme ka ha wagharịa nʼelu ugwu. Ha wagharịrị site nʼugwu ukwu ruo nʼugwu nta; ha chefuru ebe izuike ha. 7Ndị niile chọtara ha loro ha, ndị iro ha kwuru sị, “Anyị abụghị ndị ikpe mara, nʼihi na ha mehiere megide Onyenwe anyị, ezi ebe ịta nri ha, Onyenwe anyị, olileanya nke nna nna ha.” 8Gbapụnụ site nʼime Babịlọn; sinụ nʼala ndị Babịlọn pụọ, dịrịnụ ka mkpi ndị na-edu ìgwè atụrụ. 9Nʼihi na lee, ana m akpalite ma na-eweta megide Babịlọn ìgwè nke mba ukwu ndị si nʼala dị nʼugwu. Ha ga-ahazi onwe ha ibu agha megide ya, sitekwa nʼebe ahụ a ga-adọta ya nʼagha. Àkụ ha na-efe ka nke dike nʼagha maara ọrụ ya nke ọma, onye na-adịghị eji aka efu alọta. 10A ga-apụnara Babịlọnia ihe; ndị niile na-apụnara ya ihe ga-eju afọ, ka Nna anyị kwupụtara.
11Nʼihi na unu na-aṅụrị ọṅụ, nʼihi na unu na-eme mmemme, unu ndị na-apụnara ihe nketa m, nʼihi na unu na-awụgharị ka nwa ehi nwanyị na-azọcha ọka, na-eti mkpu ka ịnyịnya ndị oke, 12nne unu ga-eme nnọọ ihere; onye mụrụ unu ka a ga-emenye ihere. Lee, ọ ga-abụ nke ikpeazụ nʼetiti mba niile— ọzara, ala kpọrọ nkụ, ọzara tọgbọrọ nʼefu. 13Nʼihi iwe Nna anyị, a gaghị ebi nʼime ya; ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ kpamkpam nʼefu. Onye ọbụla gafere Babịlọn ga-eju anya ma fụọ ọnụ nʼihi ọnya ya niile. 14Dozienụ ọnọdụ unu megide Babịlọn nʼakụkụ niile, unu ndị niile na-agba ụta. Gbaanụ ya ụta; unu ejidola àkụ ọbụla, nʼihi na o mehiela megide Nna anyị. 15Tienụ mkpu megide ya nʼakụkụ niile; o nyefeela onwe ya. Ụlọ elu ya niile adaala; a kwatuola mgbidi ya niile. Ebe ọ bụ na nke a bụ ikpe ziri ezi nke Nna anyị, kpeenụ ya ikpe; meenụ ya dịka o mere. 16Site na Babilọn, bipụ onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewe ihe ubi. Nʼihu mma agha nke onye mmegbu, onye ọbụla ga-alaghachikwuru ndị nke ya, onye ọbụla ga-agbakwa ọsọ laa nʼala nke ya.
17Izrel bụ igwe atụrụ a chụsasịrị, nke ọdụm chụpụrụ. Nke mbụ, eze Asịrịa rikpọrọ ya, ugbu a, nʼikpeazụ, Nebukadneza eze Babilọn atakpọọla ọkpụkpụ ya.
18Nke a bụ ihe Nna nke usuu ndị agha nke eluigwe, Nna anyị nke Izrel, na-ekwu: Aga m ata eze Babilọn na ala ya ahụhụ dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ. 19Aga m akpọghachi Izrel nʼebe ịta nri nke ya, ọ ga-atakwa nri na Kamel na Bashan; nʼelu ugwu Ifrem na Gilead ka mkpụrụobi ya ga-eju afọ. 20Nʼụbọchị ndị ahụ na nʼoge ahụ, ka Nna anyị kwupụtara, a ga-achọ ikpe ọmụma Izrel ma ọ gaghị adị; a ga-achọ mmehie Juda ma a gaghị achọta ọ bụla, nʼihi na aga m agbaghara ndị fọdụrụ m hapụrụ ndụ.
21Rigoro buso ala Merataim agha, na ndị bi na Pekọd. Gbuo ha ma raa ha nye mbibi, ka Nna anyị kwupụtara; mee ihe niile m nyere gị nʼiwu. 22Mkpọtụ agha dị nʼala ahụ, na oke mbibi. 23Lee ka e si gbutuo ma kụjie hama nke ụwa niile! Lee ka Babilọn si ghọọ ihe egwu nʼetiti mba niile! 24Esiiri m gị ọnyà, Babilọn, e jidere gị tupu ị mata ya. A chọtara gị ma jide gị nʼihi na i soro Nna anyị lụọ ọgụ.
25Nna anyị emepeela ụlọ ngwa agha ya ma wepụta ngwa agha nke iwe ya, nʼihi na Nna nke usuu ndị agha nke eluigwe nwere ọrụ ọ ga-arụ nʼala ndị Babilọn. 26Sitenụ nʼakụkụ niile bịakwasị ya; megheenụ ọba ya niile; kpokọtaanụ ya dịka ikpo mkpụrụ ọka. Raanụ ya nye mbibi; ka ọ dịghị ihe ọ bụla ga-afọdụ nke ya. 27Gbuonụ ụmụ oke ehi ya niile; ka ha gbadaa nʼebe a na-egbu anụ. Ahụhụ dịịrị ha, nʼihi na ụbọchị ha abịala, oge ntaramahụhụ ha. 28Geenụ ntị—ndị gbapụrụ ọsọ na ndị gbara ọsọ ndụ si nʼala Babilọn, na-abịa na Zayọn ikwupụta ikpe ziri ezi nke Nna anyị, ikpe ziri ezi ya nʼihi ụlọnsọ ukwu ya. 29Kpọkọtaanụ ndị na-agba ụta ka ha buso Babilọn agha, ndị niile na-ekwe ụta. Manyeenụ ụlọ ikwu gburugburu ya nʼakụkụ niile; ka onye ọ bụla ghara ịgbanarị. Kwụghachinụ ya dịka omume ya si dị; meenụ ya ihe niile o mere. Nʼihi na ọ dịla mpako megide Nna anyị, megide Onye Nsọ nke Izrel.
30Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporo ụzọ ya, a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ, ka Nna anyị kwupụtara. 31Lee, emegidere m gị, gị onye mpako, ka Nna nke usuu ndị agha nke eluigwe kwupụtara, nʼihi na ụbọchị gị abịala, oge m ga-ata gị ahụhụ. 32Onye mpako ahụ ga-asụ ngọngọ daa, ọ dịghịkwa onye ga-eweli ya elu. Aga m amụnye ọkụ nʼobodo ya niile, ọ ga-erepịakwa ihe niile gbara ya gburugburu. 33Nke a bụ ihe Nna nke usuu ndị agha nke eluigwe na-ekwu: A na-emegbu ụmụ Izrel, na ụmụ Juda so ha. Ndị niile dọtara ha nʼagha jidesiri ha ike; ha jụrụ ịhapụ ha ka ha laa.
34Onye Mgbapụta ha dị ike; Nna nke usuu ndị agha nke eluigwe bụ aha ya. Ọ ga-ekwusizi ikpe ha ike, iweta izuike nʼụwa ma weta ọgba aghara nye ndị bi na Babilọn.
35Mma agha ga-emegide ndị Babilọn, ka Nna anyị kwupụtara, megidekwa ndị bi na Babilọn, megidekwa ndịisi ya na ndị amamihe ya! 36Mma agha ga-emegide ndị amụma ụgha, ha ga-aghọkwa ndị nzuzu! Mma agha ga-emegide ndị dike ya nʼagha, a ga-etipịakwa ha! 37Mma agha ga-emegide ịnyịnya ya na ụgbọ agha ya, megidekwa ndị agha mba ọzọ niile nọ nʼetiti ya, ha ga-adịkwa ka ụmụ nwanyị! Mma agha ga-emegide akụ ya, a ga-akwakọrọkwa ha! 38Ụkọ mmiri ga-emegide mmiri ya, ha ga-ata ata! Nʼihi na ọ bụ ala arụsị, ha na-ayị ara nʼihi oyiyi ha na-atụ egwu. 39Nʼihi ya, anụ ọhịa nke ọzara na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ, enyi nnụnụ ga-ebikwa nʼime ya. A gaghị ebikwa nʼime ya ọzọ, ọ dịghịkwa onye ga-ebi nʼime ya ruo ọgbọ niile. 40Dịka mgbe Nna anyị kwaturu Sọdọm na Gọmọra na obodo gbara ha gburugburu, ka Nna anyị kwupụtara, otu a ọ dịghị onye ga-ebi nʼebe ahụ; ọ dịghị mmadụ ga-anọ nʼime ya. 41Lee, otu usuu ndị agha si nʼugwu na-abịa; mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze na-ebili site nʼakụkụ ụwa dịkarịsịrị anya. 42Ha jidere ụta na ùbè; ha na-eme obi ọjọọ, ha enweghịkwa obi ebere. Ụzụ ha na-ada ka oké osimiri ka ha na-agba ịnyịnya, e doziri ha ka otu nwoke maka ịlụ gị ọgụ, gị Ada Babilọn. 43Eze Babilọn anụọla akụkọ banyere ha, aka ya adaala mba. Oke ihe mgbu ejidela ya, ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme. 44Lee, dịka ọdụm nke na-esi nʼoké ọhịa Jọdan arịgo ruo nʼebe ịta nri siri ike, nʼotu ntabi anya, m ga-achụpụ Babilọn site nʼala ya, m ga-ahọpụtakwa onye ọbụla m chọrọ ka ọ bụrụ onyeisi ya. Nʼihi na onye dị ka m? Onye pụrụ ịkpọ m? Olee onye ọzụzụ atụrụ nke pụrụ iguzo nʼihu m?
45Nʼihi ya, nụrụ atụmatụ Nna anyị mere megide Babilọn na nzube ọ chepụtara megide ala ndị Babilọn: Nʼezie, a ga-adọkpụrụ ụmụntakịrị nke igwe anụ ụlọ ha; nʼezie, ebe ịta nri ha ga-ama jijiji nʼihi ihe dakwasịrị ha. 46Mgbe a nụrụ ụzụ ejide Babilọn, ụwa ga-ama jijiji, a ga-anụkwa mkpu ákwá ya nʼetiti mba niile.