A Kwara Ya Emo nʼOkpu Ogwu
E tiri Jisọs ihe, kpube ya okpueze ogwu, gosi ya ọha; e nyefere ya mgbe ndị nchụàjà kwuru na ha enweghị eze ọzọ karịa Siza. Ọ bu obe nke ya, nyefee nne ya nʼaka onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya, sị na e mezuola ya, wee nwụọ. Josef na Nikodimọs liri ya nʼogige.
19 1Mgbe ahụ, Paịlet kpọọrọ Jisọs ma mee ka a pịa ya ihe. 2Ndị agha ji ogwu kpaa okpu, kpukwasị ya nʼisi, ma yikwasị ya uwe mwụda na-acha odo odo. 3Ha nọ na-abịakwute ya, na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!” ma na-amakwa ya aka nʼihu.
4Paịlet pụkwara ọzọ sị ha, “Leenụ, ana m akpọpụtara unu ya, ka unu wee mara na ahụghị m ihe ọbụla m ga-eji maa ya ikpe.” 5Ya mere, Jisọs pụtara, yi okpu ogwu ahụ na uwe mwụda na-acha odo odo ahụ. Paịlet sịrị ha, “Lee nwoke ahụ!”
6Mgbe ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Paịlet sịrị ha, “Were ya onwe unu kpọgide ya nʼobe, ebe ọ bụ na ahụghị m ihe m ga-eji maa ya ikpe.”
7Ndị Juu zara ya sị, “Anyị nwere iwu; dịka iwu ahụ si dị, ọ ghaghị ịnwụ, nʼihi na o mere onwe ya Ọkpara Chineke.”
8Mgbe Paịlet nụrụ nke a, ụjọ tụrụ ya karịa. 9Ọ banyeghachiri nʼụlọeze ahụ ọzọ jụọ Jisọs, “Ebee ka i si?” Ma Jisọs azaghị ya okwu ọbụla. 10Ya mere, Paịlet sịrị ya, “Ị gaghị agwa m okwu? Ọ bụ na ị maghị na m nwere ikike ịhapụ gị, nweekwa ikike ịkpọgide gị nʼobe?”
11Jisọs zara ya sị, “I garaghị enwe ikike ọbụla nʼahụ m ma ọ bụrụ na e sighị nʼelu nye gị ya. Ọ bụ ya mere na onye nyefere m nʼaka gị bu mmehie dị ukwuu karịa.”
12Site na mgbe ahụ gaa nʼihu, Paịlet gbalịrị ịhapụ ya, ma ndị Juu tiri mkpu, “Ọ bụrụ na ị hapụ ya, ị bụghị enyi Siza. Onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-emegide Siza.”
13Mgbe Paịlet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs ma nọdụ ala nʼoche ikpe nʼebe a na-akpọ Ala Nkume—Gabata nʼasụsụ Arameik. 14Ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe nke Mmemme Ngabiga, ihe dị ka etiti ehihie. Ọ sịrị ndị Juu, “Lee Eze unu!”
15Ha tiri mkpu, “Wepụ ya! Wepụ ya! Kpọgide ya nʼobe!” Paịlet jụrụ ha, “M ga-akpọgide eze unu nʼobe?” Ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ ma ọ bụghị naanị Siza.”
E Nyefere Ya
16Ya mere, o nyefere ha ya ka a kpọgide ya nʼobe. Ya mere, ha kpọọrọ Jisọs, 17ọ buuru obe nke ya, pụọ gaa nʼebe a na-akpọ Ebe Okpokoro Isi, nke a na-akpọ Gọlgọta nʼasụsụ Arameik. 18Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ọzọ, otu nʼakụkụ nke ọ bụla, Jisọs nʼetiti. 19Paịlet dekwara ihe odide ma debe ya nʼobe ahụ: Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu. 20Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe odide a, ebe ọ bụ na ebe ahụ a kpọgidere Jisọs nʼobe dị nso nʼobodo ahụ; e dere ya nʼasụsụ Arameik, nʼasụsụ Latin, na nʼasụsụ Grik. 21Ya mere, ndịisi nchụaja ndị Juu sịrị Paịlet, “Edela ‘Eze ndị Juu,’ kama ‘Nwoke a sịrị, Abụ m Eze ndị Juu.’”
22Paịlet zara, “Ihe m deworo, e deela m ya.”
23Mgbe ha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ndị agha weere uwe ya kee ya ụzọ anọ, otu onye agha otu, weerekwa uwe ime ahụ ya. Uwe ime ahụ ahụ enweghị ihe akwụ, a kpara ya nʼotu mkpụrụ site nʼelu ruo nʼala. 24Ya mere, ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị ghara ịdọwa ya, kama ka anyị fee nza maka onye ga-enweta ya.” Nke a mere ka Akwụkwọ Nsọ ahụ nke na-ekwu mezuo, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, fekwaa nza maka uwe m.” Ya mere, ndị agha mere nke a.
25Nne ya, nwanne nne ya nwanyị, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzoro nso nʼobe Jisọs.
26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya nke ọ hụrụ nʼanya ka ha guzo nʼebe ahụ, ọ sịrị ya, “Nwanyị, lee nwa gị nwoke.” 27Mgbe ahụ, ọ sịrị onye na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, onye na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ ya.
Ọ Gwụchaala
28Mgbe nke a gasịrị, ebe Jisọs maara na ihe niile emezuola ugbu a, ọ sịrị, iji mezuo Akwụkwọ Nsọ, “Akpịrị na-akpọ m nkụ.”
29Otu ite jupụtara na mmanya gbara ụka dị nʼebe ahụ; ha denyere ogbo na ya, kwụba ya nʼosisi hisọp, welie ya ruo ọnụ ya.
30Jisọs ṅụrụ mmanya gbara ụka ahụ ma sị, “Ọ gwụchaala.” O hulatara isi ya ma nyefee mmụọ ya.
31Ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe, ha achọghịkwa ka ozu ndị ahụ nọgide nʼobe nʼụbọchị Izuike—nʼihi na ụbọchị Izuike ahụ bụ ụbọchị pụrụ iche—ndị Juu rịọrọ Paịlet ka a gbajie ha ụkwụ ma wepụ ozu ndị ahụ. 32Ya mere, ndị agha bịara gbajie ụkwụ nwoke mbụ ahụ, mgbe ahụ nke onye nke ọzọ a kpọgidekọrọ ya nʼobe. 33Ma mgbe ha bịakwutere Jisọs, hụ na ọ nwụọlarị, ha agbajighị ya ụkwụ. 34Ma otu nʼime ndị agha ji ùbe dupuo ya nʼakụkụ, ngwa ngwa ọbara na mmiri sọpụtara. a a v34 Jọn na-agwa anyị na ya onwe ya hụrụ ihe a, o wepụtakwa ya dịka ihe akaebe na-egosi na Jisọs nwụrụ nʼezie. 35Onye ahụ ji anya ya hụ ya agbaala akaebe—akaebe ya bụ eziokwu, ọ makwaara na ọ na-ekwu eziokwu—ka unu onwe unu wee kwere. 36Nʼihi na ihe ndị a mere iji mezuo Akwụkwọ Nsọ: “Ọ dịghị otu nʼime ọkpụkpụ ya a ga-agbaji.” 37Ọzọkwa, Akwụkwọ Nsọ ọzọ na-asị, “Ha ga-ele onye ahụ ha dupuru anya.”
Josef na Nikodimọs
38Mgbe nke a gasịrị, Josef onye Arimatia—onye na-eso ụzọ Jisọs, ma na nzuzo, nʼihi egwu ndị Juu—rịọrọ Paịlet ka o kwe ya wepụ ozu Jisọs. Paịlet kwere, ya mere ọ bịara wepụ ya. 39Nikodimọs, onye bịakwutere Jisọs na mbụ nʼabalị, bịakwara, bute ngwakọta nke máá na alos, ihe dị ka paụnd iri asaa na ise. 40Ha weere ozu Jisọs fụchie ya nʼakwa ọcha linin tinyere ụda na-esi isi ụtọ, dịka omenala olili ozu ndị Juu si dị. 41Nʼebe ahụ a kpọgidere ya nʼobe, e nwere ubi a gbara ogige, nʼime ogige ahụ e nwekwara ili ọhụrụ ebe e liibeghị onye ọbụla. 42Nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, ili ahụ dịkwa nso, ha dọbara Jisọs nʼebe ahụ.