Ben-Hadad Gbara Sameria Gburugburu
Ben-Hadad chọrọ ka Ehab nye ya ọlaọcha ya, ndị nwunye ya, na ụmụ ya, Izrel wee chụsaa ya ugboro abụọ dịka Nna anyị kwere ná nkwa site nʼọnụ otu onye amụma. Ma Ehab kpọrọ eze ahụ e meriri nwanne ya ma hapụ ya ka ọ laa, otu onye amụma nwoghara onwe ya wee nwude Ehab nʼọnyà, mee ka o maa onwe ya ikpe.
20 1Ben-Hadad bụ eze Aram chịkọtara ndị agha ya niile—eze iri atọ na abụọ sonyeere ya, tinyere ịnyịnya na ụgbọ agha. Ọ gbagoro, nọchibido Sameria gburugburu, buso ya agha. 2O zigara ndị ozi baa nʼobodo ahụ ịhụ Ehab bụ eze Izrel, sị, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị: 3‘Ọlaọcha gị na ọlaedo gị bụ nke m, ndị kachasị mma nʼime ndị nwunye gị na ụmụ gị bụkwa nke m.’”
4Eze Izrel zara sị, “Dịka i kwuru, onyenwe m bụ eze: Abụ m nke gị, ya na ihe niile m nwere.”
5Ndị ozi ahụ lọghachiri sị, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị: ‘Ezigaara m gị ozi na-achọ ọlaọcha gị na ọlaedo gị, ndị nwunye gị na ụmụ gị. 6Ma nʼoge dịka nke a echi, aga m eziga ndị ohu m ka ha nyochaa ụlọeze gị na ụlọ ndị ohu gị, ha ga-ejide buru ihe niile i ji kpọrọ ihe.’”
7Eze Izrel kpọkọtara ndị okenye niile nke ala ahụ sị, “Leenụ hụ nke ọma na nwoke a na-achọ nsogbu. O zigaara ndị nwunye m, ụmụ m, ọlaọcha m na ọlaedo m, ma ajụghị m ya.”
8Ndị okenye niile na ndị niile gwara ya sị, “Egerela ya ntị, ekwekwarala ya.”
9Ya mere, ọ gwara ndị ozi Ben-Hadad sị, “Gwanụ onyenwe m bụ eze, ‘Ihe niile i buru ụzọ chọọ nʼaka ohu gị ka m ga-eme, ma arịrịọ a enweghị m ike imezu ya.’” Ndị ozi ahụ pụrụ buru ọsịsa ya laghachi.
10Mgbe ahụ, Ben-Hadad zigara ozi sị, “Ka chi ndị ahụ taa m ahụhụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na aja fọdụrụ na Sameria ga-ezuru inye onye ọbụla na-eso m otu aka.”
11Eze Izrel zara sị, “Gwanụ ya, ‘Ka onye na-ekekọ ihe agha ya ghara ịnya isi dịka onye na-eyipụ ya.’”
12Mgbe Ben-Hadad na ndị eze ahụ nọ na-aṅụ ihe nʼụlọikwuu ha, ọ nụrụ nke a, nye ndị ya iwu sị, “Doonụ onwe unu nʼọnọdụ agha.” Ha doro onwe ha megide obodo ahụ.
Nna Anyị Nyere Ehab Mmeri Ahụ
13Otu onye amụma bịakwutere Ehab bụ eze Izrel sị, “Otu a ka Nna anyị sịrị: Ị na-ahụ oke ìgwè agha a? Taa, aga m enyefe ya nʼaka gị, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Nna gị.”
14Ehab jụrụ sị, “Site nʼaka onye?” Onye amụma ahụ zara sị, “Otu a ka Nna anyị sịrị: Site nʼaka ndị ọrụ agha na-eto eto nke ndị ọchịagha mpaghara.” Ọ jụrụ, “Onye ga-ebu ụzọ malite agha ahụ?” Ọ sịrị, “Ọ bụ gị.”
15Ya mere, Ehab kpọpụtara ndị ọrụ agha na-eto eto nke ndị ọchịagha mpaghara—mmadụ narị abụọ na iri atọ na abụọ. Mgbe ahụ, ọ kpọpụtara ndị fọdụrụ, bụ ụmụ Izrel niile—puku asaa nʼọnụ ọgụgụ ha niile. 16Ha pụrụ nʼehihie mgbe Ben-Hadad na ndị eze iri atọ na abụọ so ya nọ na-aṅụ mmanya ṅụbiga ókè nʼụlọikwuu ha. 17Ndị ọrụ agha na-eto eto nke ndị ọchịagha mpaghara buru ụzọ pụọ. Ben-Hadad ezigala ndị nledo, ndị gwara ya sị, “Ụfọdụ ndị ikom si na Sameria na-apụta.”
18O kwuru sị, “Ọ bụrụ na ha pụtara maka udo, jidenụ ha na ndụ; ọ bụrụkwa na ha pụtara maka agha, jidenụ ha na ndụ.”
19Ndị ọrụ agha na-eto eto nke ndị ọchịagha mpaghara si nʼobodo ahụ pụọ, ndị agha na-esokwa ha nʼazụ. 20Onye ọbụla gburu onye ya na ya na-alụ ọgụ. Ndị Aram gbara ọsọ, ụmụ Izrel na-achụkwa ha, ma Ben-Hadad bụ eze Aram gbanarịrị na-agba ịnyịnya, ya na ụfọdụ ndị na-agba ịnyịnya. 21Eze Izrel gara nʼihu merie ịnyịnya na ụgbọ agha, gbuo ọtụtụ ndị Aram. 22Emesịa, onye amụma ahụ bịakwutere eze Izrel sị, “Mee ka ọnọdụ gị sie ike, chebarakwa echiche nke ọma banyere ihe ị ga-eme, nʼihi na nʼoge opupu ihe ubi na-abịa, eze Aram ga-ebusokwa gị agha ọzọ.”
23Nʼoge ahụ, ndị isi ozi nke eze Aram gwara ya sị, “Chi ha bụ chi ugwu; ọ bụ ya mere ha ji merie anyị. Lụsonụ ha ọgụ nʼala dị larịị, nʼezie anyị ga-emerikwa ha. 24Mee nke a: wepụ ndị eze niile nʼọkwa ọchịagha ha, were ndị ọchịagha ndị ọzọ dochie ha. 25Chịkọta ndị agha dịka ndị ahụ i furu efu—ịnyịnya nʼọnọdụ ịnyịnya, ụgbọ agha nʼọnọdụ ụgbọ agha—lụso Izrel ọgụ nʼala dị larịị. Mgbe ahụ, nʼezie anyị ga-adị ike karịa.” O gere ha ntị, mee otu ahụ.
26Nʼoge opupu ihe ubi nke sochirinụ, Ben-Hadad chịkọtara ndị Aram, gbagoro Afek ịlụso Izrel ọgụ. 27Mgbe a chịkọtara ụmụ Izrel ma nye ha ihe oriri, ha pụrụ izute ha. Ụmụ Izrel mara ụlọikwuu chere ha ihu dịka igwe ewu abụọ dị nta, ebe ndị Aram jupụtara nʼala ahụ.
28Onye nke Chineke bịakwutere eze Izrel sị, “Otu a ka Nna anyị sịrị: Nʼihi na ndị Aram na-eche na Onyenwe anyị bụ chi nke ugwu, ọ bụghị chi nke ndagwurugwu, aga m enyefe oke ìgwè agha a niile nʼaka gị, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Nna gị.”
29Ruo ụbọchị asaa, ha mara ụlọikwuu chere ibe ha ihu; nʼụbọchị nke asaa, agha ahụ malitere. Nʼotu ụbọchị, ụmụ Izrel gburu narị puku ndị agha ji ụkwụ aga nke ndị Aram. 30Ndị fọdụrụ gbagara nʼAfek, ebe mgbidi dara daa nʼahụ mmadụ puku iri abụọ na asaa nʼime ha. Ben-Hadad gbabara nʼime obodo ahụ, zoo onwe ya nʼime ọnụụlọ dị nʼime.
31Ndị ohu ya sịrị ya, “Anyị anụla na ndị eze nke ezinụlọ eze Izrel bụ ndị nwere obi ebere. Ka anyị jekwuru eze Izrel, kekwasị akwa mkpe nʼúkwù anyị, kekwasị ụdọ nʼisi anyị; ma eleghị anya, ọ ga-ahapụ gị ndụ.”
32Ya mere, ha kekwasịrị akwa mkpe nʼúkwù ha, ya na ụdọ nʼisi ha, bịakwute eze Izrel, rịọọ arịrịọ sị, “Ohu gị bụ Ben-Hadad sịrị, ‘Biko hapụ m ka m dịrị ndụ.’” Ọ zara sị, “Ọ ka dị ndụ? Ọ bụ nwanne m.”
33Ndị ikom ahụ weere ya dịka ihe ịrịba ama dị mma, jidesie okwu ya ike ngwa ngwa. Ha sịrị, “Ee, nwanne gị bụ Ben-Hadad!” Eze ahụ sịrị, “Gaa, kpọta ya.” Ya mere, Ben-Hadad pụtara, Ehab mekwara ka ọ rịgoro nʼime ụgbọ agha ahụ.
34Ben-Hadad sịrị, “Aga m eweghachi obodo ndị ahụ nna m napụrụ nna gị, ị pụkwara ịhazi ebe ahịa nke gị nʼime Damaskọs, dịka nna m mere na Sameria.” Ehab sịrị, “Nʼokwu ndị a, aga m ahapụ gị ka ị laa.” Ya mere, ya na ya gbara ndụ, hapụ ya ka ọ laa.
Otu Onye Amụma Guzogidere Eze Ahụ
35Site nʼokwu Nna anyị, otu onye nʼime ụmụ ndị amụma gwara enyi ya sị, “Biko tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ iti ya ihe.
36Onye amụma ahụ sịrị, “Nʼihi na i geghị olu Nna anyị ntị, nʼoge ị hapụrụ m, ọdụm ga-egbu gị.” Mgbe nwoke ahụ hapụrụ ya, ọdụm chọtara ya gbuo ya.
37Onye amụma ahụ chọtara nwoke ọzọ sị, “Biko tie m ihe.” Ya mere, nwoke ahụ tiri ya ihe, merụọ ya ahụ.
38Mgbe ahụ, onye amụma ahụ guzoro nʼakụkụ ụzọ na-echere eze ahụ, were ihe fụchie anya ya ka a ghara ịmata ya. 39Ka eze ahụ na-agafe, onye amụma ahụ tiri mkpu sị, “Ohu gị banyere nʼetiti ọgụ ahụ, otu nwoke wezụgara onwe ya, kpọtara m otu onye a dọtara nʼagha sị, ‘Chee nwoke a nche. Ọ bụrụ na ọ hapụ, ndụ gị ga-anọchi anya ndụ ya, ma ọ bụ ị kwụọ otu talenti ọlaọcha.’ 40Ebe ohu gị ji ọrụ nʼebe a na nʼebe ahụ, nwoke ahụ lawara.” Eze Izrel sịrị ya, “Nke ahụ bụ ikpe gị; ọ bụ gị onwe gị kpebiri ya.”
41Onye amụma ahụ wepụrụ ihe o ji fụchie anya ya ngwa ngwa, eze Izrel matara ya na ọ bụ otu onye nʼime ndị amụma.
42Ọ sịrị eze ahụ, “Otu a ka Nna anyị sịrị: Nʼihi na i hapụrụ nwoke ahụ m kwadoro maka mbibi ka ọ laa, ndụ gị ga-anọchi anya ndụ ya, ndị gị ga-anọchikwa anya ndị ya.”
43Were obi mwute na iwe, eze Izrel laghachiri nʼụlọ ya, lọta na Sameria.