Nna Zigara Ịlaịja Ka Ọ Gakwuru Ehab
Ịlaịja laghachiri nʼime ụnwụ izute Ehab, ọ jụkwara Izrel ruo ole mgbe ka ha ga na-ete ngwụrọ nʼetiti echiche abụọ. Ndị amụma Baal tiri mkpu ma bee onwe ha ahụ ogologo ụbọchị niile nʼefu; ọkụ si nʼebe Nna anyị nọ dakwasịrị ebe ịchụ àjà ahụ mmiri dere, mmiri ozuzo wee soro.
18 1Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, nʼafọ nke atọ, okwu Nna anyị rutere Ịlaịja nʼaka, sị, “Gaa gosi Ehab onwe gị, m ga-ezitekwa mmiri ozuzo nʼala ahụ.”
2Ya mere Ịlaịja gara igosi Ehab onwe ya. Ugbu a, oke ụnwụ dị njọ na Sameria. 3Ehab kpọrọ Ọbadaya, onye na-elekọta ụlọeze. (Ugbu a, Ọbadaya na-atụ Nna anyị egwu nke ukwuu. 4Mgbe Jezebel nọ na-egbu ndị amụma Nna anyị, Ọbadaya kpọọrọ narị ndị amụma, zoo ha, iri mmadụ ise nʼime otu ọgba, nyekwa ha achịcha na mmiri.) 5Ehab gwara Ọbadaya sị, “Gaa gagharịa nʼala ahụ ruo nʼisi iyi niile na ndagwurugwu niile; ma eleghị anya anyị ga-achọta ahịhịa iji chebe ndụ ịnyịnya na ịnyịnya muul, ka anyị gharakwa ịla nʼiyi anụ ụlọ ọbụla.”
6Ya mere ha kere ala ahụ ụzọ abụọ ka ha gabiga ya; Ehab sooro otu ụzọ naanị ya, Ọbadaya sookwa ụzọ ọzọ naanị ya. 7Ka Ọbadaya nọ na-aga, Ịlaịja zutere ya na mberede. Mgbe ọ matara ya, ọ dara kpuo ihu nʼala, sị, “Ọ bụ gị, onyenwe m Ịlaịja?”
8Ọ sịrị ya, “Ọ bụ m. Gaa gwa onyenwe gị, sị, ‘Ịlaịja nọ ebe a.’”
9Ọbadaya jụrụ sị, “Olee mmehie m mere, nke mere na ị ga-arara ohu gị nye Ehab ka o gbuo m?” 10Dịka Nna gị si dị ndụ, ọ dịghị mba maọbụ alaeze ọbụla onyenwe m na-ezigaghị ozi ịchọ gị. Mgbe ha sịrị, “Ọ nọghị ebe a,” o mere ka alaeze ahụ maọbụ mba ahụ ṅụọ iyi na ha enweghị ike ịchọta gị. 11Ma ugbu a ị na-asị, “Gaa gwa onyenwe gị, sị, ‘Ịlaịja nọ ebe a.’” 12Ngwa ngwa m hapụrụ gị, Mmụọ nke Nna anyị ga-ebuga gị ebe m na-apụghị ịma; mgbe ahụ m bịa gwa Ehab, ọ chọta gị, o gbuo m—ma mụ onwe m bụ ohu gị na-atụ Nna anyị egwu site na mgbe m bụ okorobịa. 13Ọ bụ na a gwabeghị onyenwe m ihe m mere mgbe Jezebel na-egbu ndị amụma Nna anyị—otú m si zoo narị ndị amụma Nna anyị, iri mmadụ ise nʼime otu ọgba, nyejukwa ha achịcha na mmiri? 14“Ma ugbu a ị na-asị, ‘Gaa gwa onyenwe gị, sị, “Ịlaịja nọ ebe a”’—ọ ga-egbukwa m!”
15Ịlaịja sịrị, “Dịka Nna nke usuu ndị agha eluigwe si dị ndụ, onye m na-eguzo nʼihu ya, taa aghaghị m igosi ya onwe m.”
16Ya mere Ọbadaya gara izute Ehab, kọọrọ ya, Ehab gakwara izute Ịlaịja. 17Mgbe Ehab hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị, gị onye na-eweta nsogbu nʼIzrel?”
18Ọ zara sị, “Ọ bụghị m wetaara Izrel nsogbu—kama ọ bụ gị na ụlọ nna gị, site nʼịhapụ iwu Nna anyị na iso arụsị Baal niile. 19Ya mere, ugbu a, zipu ozi, chịkọta Izrel niile bịakwute m nʼUgwu Kamel, ya na narị ndị amụma Baal anọ na iri ise, na narị ndị amụma Ashera anọ, bụ ndị na-eri nri na tebụl Jezebel.”
20Ya mere Ehab zipuru ozi nʼetiti ụmụ Izrel niile, chịkọta ndị amụma ahụ nʼUgwu Kamel. 21Ịlaịja bịakwutere ndị niile sị, “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọ na-atụgharị nʼetiti echiche abụọ? Ọ bụrụ na Nna anyị bụ Chineke, soronụ ya; ọ bụrụ na ọ bụ Baal, soronụ ya.” Ma ndị ahụ azaghị ya ọbụla okwu.
22Ịlaịja sịrị ndị ahụ, “Ọ bụ naanị m fọdụrụ dịka onye amụma Nna anyị, ma ndị amụma Baal dị narị mmadụ anọ na iri ise. 23Nyenụ anyị oke ehi abụọ. Ka ha họrọ otu, bọwaa ya, dọkwasị ya nʼelu nkụ, ma ha agbakwala ọkụ nʼokpuru ya; m ga-akwadebe nke ọzọ, dọkwasị ya nʼelu nkụ, agbaghịkwa ọkụ nʼokpuru ya. 24Mgbe ahụ, unu ga-akpọku aha chi unu, m ga-akpọkukwa aha Nna anyị; Chineke ahụ nke ga-eji ọkụ zaa, ya bụ Chineke.” Ndị niile sịrị, “Ọ bụ ezi okwu ka i kwuru.”
25Ịlaịja sịrị ndị amụma Baal, “Unu dị ọtụtụ, ya mere họrọnụ otu oke ehi, buru ụzọ kwadebe ya; mgbe ahụ kpọkuonụ aha chi unu—ma unu amụnyela ọkụ nʼokpuru ya.”
26Ya mere ha weere oke ehi ahụ e nyere ha kwadebe ya, kpọkuo aha Baal site nʼụtụtụ ruo nʼehihie, sị, “Baal, zaa anyị!” Ma o nweghị olu ọbụla, o nwekwaghị onye zara. Ha wee na-agbagharị gburugburu ebe ịchụàjà ahụ ha wuru.
27Nʼehihie, Ịlaịja kwara ha emo, sị, “Tienụ mkpu ike! Ọ bụ chi—ma eleghị anya ọ nọ nʼoké echiche, maọbụ na-anyụ nsị, maọbụ na-eme njem; maọbụ ọ na-arahụ ụra, ọ dị mkpa ịkpọte ya.”
28Ya mere ha tiri mkpu ike karịa, jiri mma agha na ùbe gbukaa onwe ha, dịka omenala ha si dị, ruo mgbe ọbara sọpụtara nʼahụ ha. 29Mgbe etiti ehihie gafere, ha nọgidere na-eyi ara ruo mgbe a na-achụ àjà nke uhuruchi, ma o nweghị olu ọbụla, o nweghị nzaghachi, o nwekwaghị onye ṅara ntị.
30Ịlaịja sịrị ndị niile, “Bịaruonụ m nso.” Ha niile bịarutere nso, o wee rụzie ebe ịchụàjà Nna anyị nke a kwaturu.
31Ịlaịja weere nkume iri na abụọ, otu maka ebo ọbụla nke ụmụ Jekọb, bụ ndị okwu Nna anyị bịakwutere, sị, “Aha gị ga-abụ Izrel.”
32O jiri nkume ndị ahụ wuo ebe ịchụàjà nʼaha Nna anyị, gwuo olulu gburugburu ya, nke buru ibu nke ga-eri ihe dị ka lita iri na atọ nke mkpụrụ. 33O doziri nkụ ahụ, bọwaa oke ehi ahụ ntakịrị ntakịrị, dọkwasị ya nʼelu nkụ. Ọ sịrị, “Werenụ mmiri mejupụta ite anọ, wụsa ya nʼelu àjà nsure ọkụ na nkụ ahụ.” 34Ọ sịrị, “Meekwanụ ya ọzọ,” ha emekwaa ya ọzọ. Ọ sịkwara, “Meenụ ya nke ugboro atọ,” ha emee ya nke ugboro atọ. 35Mmiri ahụ wee gbaa gburugburu ebe ịchụàjà ahụ, o jirikwa mmiri mejupụta olulu ahụ.
36Mgbe a na-achụ àjà nke uhuruchi, Ịlaịja onye amụma bịarutere nso sị, “Nna anyị, Chineke nke Ebraham, Aịzik, na Izrel, ka a mara taa na ị bụ Chineke nʼIzrel, nakwa na mụ onwe m bụ ohu gị, nakwa na ọ bụ nʼokwu gị ka m jiri mee ihe ndị a niile. 37Zaa m, Nna anyị, zaa m, ka ndị a mara na gị, bụ Nna anyị, bụ Chineke, nakwa na ị meela ka obi ha laghachi azụ.”
38Mgbe ahụ, ọkụ Nna anyị dara, rechapụ àjà nsure ọkụ ahụ, na nkụ ahụ, na nkume ahụ, na aja ahụ, racha mmiri nke dị nʼolulu ahụ. 39Mgbe ndị niile hụrụ ya, ha dara kpuo ihu nʼala, tie mkpu, sị, “Nna anyị, ọ bụ Chineke! Nna anyị, ọ bụ Chineke!” a a v39 Ndị kpafuru soro Baal dara nʼala, kpọọ aha ezi Chineke ahụ — Nna ka na-adọghachi ụmụ ya kpafuru nʼebe ọ nọ.
40Ịlaịja sịrị ha, “Jidenụ ndị amụma Baal; ka ọ dịghị onye gbapụ.” Ha jidere ha, Ịlaịja wee kpụdata ha na Ndagwurugwu Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ.
41Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị Ehab, “Rigoo, rie ihe, ṅụọkwa ihe, nʼihi na enwere ụda mbigbọ nke oke mmiri ozuzo.”
42Ehab rigooro ka o rie ma ṅụọ ihe, ma Ịlaịja rigoro nʼelu ugwu Kamel. Nʼebe ahụ, ọ kpọrọ isi ala, tinye ihu ya nʼetiti ikpere ya abụọ. 43Ọ sịrị ohu ya, “Rigoo, lee anya nʼụzọ oké osimiri.” O rigoro, lee anya, sị, “O nweghị ihe dị ebe ahụ.” Ugboro asaa ka Ịlaịja sịrị, “Laghachi ọzọ.”
44Nʼugboro asaa, ohu ahụ sịrị, “Lee, otu obere ígwé ojii dị nta dịka aka mmadụ na-esite nʼoké osimiri arịgo.” Ịlaịja sịrị, “Rigoo gwa Ehab, sị, ‘Kwadebe ụgbọ ịnyịnya gị, rịdata tupu mmiri ozuzo egbochie gị.’”
45Nʼoge ahụ, mbara eluigwe gbara ọchịchịrị site nʼígwé ojii na ifufe, oke mmiri ozuzo wee bịa, Ehab wee nọkwasị nʼụgbọ gbaga Jezril. 46Aka Nna anyị dịkwasịrị Ịlaịja; o kechie uwe mwụda ya nʼukwu ya, gbaa ọsọ buru Ehab ụzọ ruo nʼọnụ ụzọ ama Jezril.