Ụmụ Nwanyị Ndị Soro Jisọs na-eje ije
A kpọrọ aha ndị inyom na-akwado ọrụ ahụ. Ilu gbasara ụdị ala na-akọwa ihe mere okwu Nna anyị anaghị amị mkpụrụ nʼime ụfọdụ. Ọ mere ka oké ifufe dajụọ, tọhapụ otu nwoke a na-akpọ Lijiọn bụ onye ndị agbata obi ya rịọrọ ya ka ọ pụọ, wee gwọọ otu nwanyị ọbara na-agba ma kpọlite nwa nwanyị Jaịrọs.
8 1Nʼoge na-adịghị anya, o jere nʼobodo ukwu na obodo nta dị iche iche, na-ekwusa ma na-ezisa oziọma banyere alaeze Nna anyị. Mmadụ iri na abụọ ahụ sokwa ya, 2sokwakwa ụfọdụ ụmụ nwanyị a gwọrọ site na mmụọ ọjọọ na ọrịa dị iche iche: Meri, nke a na-akpọ Magdalin, onye a chụpụrụ mmụọ ọjọọ asaa nʼime ya, 3na Joanna, nwunye Chuza, onye na-elekọta ihe Herọd, na Susanna, na ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị ji akụ ha onwe ha na-akwado ha.
4Mgbe oke igwe mmadụ gbakọrọ, ndị mmadụ si nʼobodo niile na-abịakwute ya, o kwuru okwu nʼilu, sị:
5“Otu onye ọrụ ubi pụrụ ịga kụọ mkpụrụ. Ka ọ na-akụ mkpụrụ, ụfọdụ dara nʼụzọ, a zọgbuo ya, nnụnụ nke eluigwe richapụkwara ya. 6Ụfọdụ dara nʼelu nkume; mgbe o pupụtara, ọ kpọnwụrụ nʼihi na mmiri adịghị. 7Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ahụ sooro ya too, kpagbuo ya. 8Mkpụrụ ndị ọzọ dara nʼala ọma, too, mịa mkpụrụ otu narị ụba.” Mgbe o kwuru nke a, o tiri mkpu sị, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
9Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara.
10Ọ sịrị, “E nyela unu ike ịmata ihe nzuzo nke alaeze Nna anyị; ma ndị fọdụrụ, ọ bụ nʼilu ka a na-agwa ha, ‘ka ha wee na-ele anya ma ghara ịhụ ụzọ, na-anụkwa ihe ma ghara ịghọta.’”
11“Ugbu a, nke a bụ ihe ilu ahụ pụtara: Mkpụrụ ahụ bụ okwu Nna anyị. 12Ndị dị nʼakụkụ ụzọ bụ ndị na-anụ okwu ahụ; mgbe ahụ, ekwensu na-abịa wepụ okwu ahụ nʼobi ha, ka ha ghara ikwere ma zọpụta. 13Ndị nọ nʼelu nkume bụ ndị na-anụ okwu ahụ, were ọṅụ nabata ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ; ha na-ekwere ruo nwa oge, ma mgbe ọnwụnwa bịara, ha adaa. 14Ihe dara nʼetiti ogwu: ndị a bụ ndị na-anụ okwu ahụ, ma ka ha na-aga, nchegbu nke ndụ, akụnụba, na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu ha, mkpụrụ ha adịghịkwa aka nke ọma. 15Ma ndị nọ nʼala ọma: ndị a na-anụ okwu ahụ were obi ziri ezi na obi ọma, jidesie ya ike, mịakwa mkpụrụ site na ntachiobi.”
Ìhè Nke A Na-apụghị Izo Ezo
16“O nweghị onye na-amụnye oriọna were ite kpuchie ya, maọbụ dọba ya nʼokpuru akwa; kama ọ na-adọba ya nʼihe a na-adọkwasị oriọna, ka ndị na-abanye wee hụ ìhè ahụ. 17Nʼihi na o nweghị ihe zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịghịkwa ihe nzuzo nke a na-agaghị amata ma mee ka ọ pụta ìhè. 18Ya mere, lezienụ anya otú unu si na-ege ntị, nʼihi na onye nwere, a ga-enyekwu ya; ma onye na-enweghị, ọ bụladị ihe o chere na ọ nwere ka a ga-anapụ ya.”
Ezinụlọ Nna Anyị
19Nne ya na ụmụnne ya bịakwutere ya, ma ha enweghị ike ịbịaru ya nso nʼihi igwe mmadụ ahụ. 20A gwara ya, sị, “Nne gị na ụmụnne gị guzo nʼezi, na-achọ ịhụ gị.”
21Ma ọ zara ha sị, “Nne m na ụmụnne m bụ ndị na-anụ okwu Nna anyị ma na-eme ya.”
Jisọs Nyere Oke Ifufe Iwu
22Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri. Ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke ọdọ mmiri a.” Ha wee pụọ.
23Ka ha na-akwọ ụgbọ, ọ dara nʼụra. Oke ifufe fekwasịrị nʼelu ọdọ mmiri ahụ; mmiri jupụtara nʼime ụgbọ, ha nọkwa nʼihe ize ndụ. 24Ha kpọtere ya, na-asị, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị na-ala nʼiyi!” O biliri, baara ifufe na mmiri na-asọ oke mba; ha kwụsịrị, ebe ahụ dajụkwara. 25Ọ jụrụ ha, sị, “Olee ebe okwukwe unu dị?” Egwu tụrụ ha, o tụkwara ha nʼanya, ha na-ajụrịta onwe ha sị, “Onye kọ bụ onye a? Ọ na-enye ọbụladị ifufe na mmiri iwu, ha na-erubekwara ya isi.”
Nwoke E Si Nʼaka Lijiọn Napụta
26Mgbe ahụ, ha kwọọrọ ụgbọ ruo nʼakụkụ ala ndị Gerasin, bụ nke chere Galili ihu. 27Ka Jisọs rịdara nʼala, otu nwoke si nʼobodo ahụ, onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, zutere ya. Ruo ogologo oge, o yighị uwe ọbụla, o bighịkwa nʼụlọ kama nʼetiti ili ndị mmadụ. 28Mgbe ọ hụrụ Jisọs, o tiri mkpu, daa nʼihu ya, were oke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke nke kachasị elu? Arịọ m gị, atala m ahụhụ!” 29Nʼihi na Jisọs enyela mmụọ na-adịghị ọcha ahụ iwu ka ọ si nʼahụ nwoke ahụ pụọ, nʼihi na ọ na-ejidekarị ya; ọ bụ ezie na e ji ùdè na mkpọrọ kee ya agbụ ma chee ya nche, ọ na-agbaji ha, mmụọ ọjọọ ahụ na-achụbakwa ya nʼime ọzara.
30Jisọs jụrụ ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ sịrị, “Lijiọn,” nʼihi na ọtụtụ mmụọ ọjọọ abanyela nʼime ya.
31Ha rịọkwara ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼime olulu ahụ na-enweghị ọgwụgwụ.
32Otu igwe ezi buru ibu nọ na-ata nri nʼelu ugwu ahụ. Mmụọ ọjọọ ndị ahụ rịọrọ ya ka o kwere ka ha banye nʼime ezi ndị ahụ, o kwekwara ha. 33Ya mere, mmụọ ọjọọ ndị ahụ si nʼahụ nwoke ahụ pụọ banye nʼime ezi ndị ahụ; igwe ezi ahụ gbadara nʼelu ugwu nkume ahụ baa nʼime ọdọ mmiri rie mmiri nwụọ.
34Ndị na-azụ ezi ahụ hụrụ ihe mere, gbapụ ọsọ, kọọ ya nʼobodo na nʼime ime obodo. 35Igwe mmadụ pụtara ịhụ ihe mere. Mgbe ha rutere nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nʼaka mmụọ ọjọọ napụta ka ọ nọ ọdụ nʼụkwụ Jisọs, yi uwe, uche yakwa dị nkọ—egwu wee jide ha. 36Ndị hụrụ ya kọọrọ ha otú e si gwọọ nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. 37Ndị niile bi nʼakụkụ ala ndị Gerasin rịọrọ ya ka ọ hapụ ha, nʼihi na oke egwu jidere ha. Ya mere, ọ banyere nʼụgbọ mmiri laghachi azụ. 38Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ si nʼahụ ya pụọ rịọrọ ka ya na ya soro, ma Jisọs zilagara ya, na-asị,
39“Laghachi nʼụlọ gị; kọsaa ihe ukwuu Nna anyị meere gị.” Ọ gara, na-ekwusa nʼobodo ahụ niile ihe ukwuu Jisọs meere ya.
A Gwọrọ Ma Kpọlite Site nʼOkwukwe
40Ugbu a, mgbe Jisọs laghachiri, igwe mmadụ nabatara ya, nʼihi na ha niile nọ na-eche ya. 41Otu nwoke aha ya bụ Jaịrọs, onye ndu ụlọ nzukọ, bịara daa nʼụkwụ Jisọs, na-arịọ ya ka ọ bịa nʼụlọ ya, 42nʼihi na o nwere otu nwa nwanyị, naanị ya, nke dị ihe dị ka afọ iri na abụọ, nke na-anwụ anwụ. Ka Jisọs na-aga, igwe mmadụ na-akpagbu ya gburugburu. 43Otu nwanyị nọ na-asọ ọbara afọ iri na abụọ; o mefuola ihe niile o ji ebi ndụ nʼaka ndị dọkịta, ma o nweghị onye pụrụ ịgwọ ya. 44Ọ bịara nʼazụ ya, metụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya aka, ngwangwa ọsọ ọbara ya kwụsịkwara.
45Jisọs sịrị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ha niile gọrọ agọ, Pita sịrị, “Onyenwe anyị, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-akpagbukwa gị.”
46Ma Jisọs sịrị, “Otu onye metụrụ m aka, nʼihi na amatara m na ike esila nʼahụ m pụọ.”
47Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ pụghị izo onwe ya ezo, ọ bịara na-ama jijiji, daa nʼihu ya, kọwaa nʼihu mmadụ niile ihe mere o ji metụ ya aka na otú e si gwọọ ya ngwangwa.
48O wee sị ya, “Nwa m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị; laa nʼudo.”
49Mgbe ọ ka na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ onye ndu ụlọ nzukọ ahụ bịara sị, “Nwa gị nwanyị anwụọla; enyekwala Onye Nkuzi ahụ nsogbu ọzọ.”
50Ma Jisọs nụrụ ya zaa ya, “Atụla egwu; naanị kwere, a ga-azọpụtakwa ya.”
51Mgbe o rutere nʼụlọ ahụ, o kweghị ka onye ọbụla soro ya banye ma e wezụga Pita, Jọn, Jems, na nna na nne nwata ahụ.
52Mmadụ niile nọ na-ebe akwa ma na-eru ụjụ nʼihi ya, ma ọ sịrị, “Unu ebela akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ, kama ọ na-ehi ụra.”
53Ha wee chịa ya ọchị, ebe ha maara na ọ nwụọla.
54Ma o jidere ya nʼaka tie mkpu sị, “Nwa m, bilie.”
55Mmụọ ya laghachiri, o wee bilie ngwangwa. O nyere ha iwu ka ha nye ya ihe ọ ga-eri. 56Nne na nna ya tụrụ nʼanya, ma o nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere.