Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Luk 5 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

Jisọs Kpọrọ Ndị Na-eso Ụzọ ya Mbụ

Pita gbara azụ abalị niile na-ejideghị ihe ọ bụla, mgbe ahụ nʼokwu Jisọs, ọ dọpụtara ọtụtụ nke mere ka ọ rịọ ya ka ọ pụọ. A metụrụ onye ekpenta aka. E sitere nʼelu ụlọ wedata onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, e site nʼike Nna anyị gbaghara ya, nke wutere ndị ode akwụkwọ. Livaị hapụrụ ọnọdụ ya.

Isi 5.

Otu mgbe, ka igwe mmadụ na-akpagbu ya gburugburu ịnụ okwu Nna anyị, Jisọs guzoro nʼakụkụ Ọdọ Mmiri Genesaret. a a v1 Ọdọ Mmiri Genesaret bụ aha ọzọ a na-akpọ Osimiri Galili. Ọ hụrụ ụgbọ mmiri abụọ ka ha kwụ nʼakụkụ ọdọ mmiri ahụ; ndị ọkụ azụ ahapụla ha na-asachakwa ụgbụ ha. Mgbe ọ banyere nʼotu nʼime ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke Saịmọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwaga ntakịrị site nʼikpere mmiri, mgbe ahụ ọ nọdụrụ ala si nʼụgbọ mmiri ahụ zie igwe mmadụ ahụ ihe.

Mgbe o kwusịrị okwu, ọ gwara Saịmọn sị, “Kwaga nʼebe mmiri miri emi wee tụda ụgbụ unu ka unu wee gbuta azụ.”

Saịmọn zara sị, “Onyenwe m, anyị rụsiri ọrụ ike ogologo abalị dum ma anyị egbughị ihe ọbụla. Ma nʼihi okwu gị, aga m atụda ụgbụ ahụ.” Mgbe ha mere nke a, ha gbutara ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ ha malitere ịdọwa. Ha fere ndị ha na ha so nʼụgbọ mmiri nke ọzọ aka ka ha bịa nyere ha aka; ha bịara jupụta ụgbọ mmiri abụọ ahụ nke mere na ha malitere imikpu. Mgbe Saịmọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼikpere Jisọs sị, “Hapụ m, Onyenwe m, nʼihi na abụ m nwoke mmehie!” Nʼihi na oke ịtụnanya jidere ya na ndị niile ya na ha nọ, nʼihi ọnụ ọgụgụ azụ ahụ ha gbutara,

otu a kwa ka ọ dịịrị Jemsị na Jọn, ụmụ Zebedi, bụ ndị ya na Saịmọn so na-arụ ọrụ. Jisọs gwara Saịmọn sị, “Atụla egwu; site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-na-akụta mmadụ.”

Ya mere ha dọkpụrụ ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, hapụ ihe niile, soro ya.

Nwoke E Mere Ka Ọ Dị Ọcha

Mgbe Jisọs nọ nʼotu nʼime obodo ndị ahụ, otu nwoke ọrịa ekpenta dị njọ juru nʼahụ pụtara. Mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ daa kpuo ihu nʼala rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”

Jisọs setịpụrụ aka ya, metụ ya aka sị, “Achọrọ m. Dịrị ọcha.” Nʼotu mgbe ahụ, ọrịa ekpenta ahụ hapụrụ ya.

Jisọs nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla, sị, “kama gaa, gosi onwe gị onye nchụaja ma chụọ aja nke Mosis nyere nʼiwu maka ịdị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe akaebe nye ndị mmadụ.”

Ma okwu banyere ya gbasara karịa; oke igwe mmadụ gbakọrọ ịnụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. Ma Jisọs na-apụ mgbe mgbe gaa nʼebe tọgbọrọ nʼefu kpee ekpere.

Ike Nna Ịgbaghara Mmehie

Otu ụbọchị, ka ọ na-ezi ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu nọ ọdụ, ha onwe ha sitere nʼobodo nta niile nke Galili, na Judia na Jerusalem bịa. Ike Nna anyị nọkwa nʼebe ahụ ka o wee gwọọ ndị ọrịa. Nʼotu mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ikom bịara bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ nʼute, na-agbalị ịkpọbata ya wee dọba ya nʼihu Jisọs. Ebe ha na-achọtaghị ụzọ ha ga-esi nʼetiti igwe mmadụ ahụ kpọbata ya, ha rịgoro nʼelu ụlọ wee site nʼelu ntuntu ụlọ tụda ya na ute ya, ruo nʼetiti, nʼihu Jisọs kpọmkwem.

Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị, “Enyi m, agbagharala gị mmehie gị.”

Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii malitere ịrụ ụka sị, “Onye bụ nwoke a na-ekwulu Chineke? Onye kwanụ pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị naanị Chineke?”

Ebe ọ matara ihe ha na-eche, Jisọs zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche echiche nʼobi unu? Olee nke dị mfe: ịsị, ‘Agbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ bụ ịsị, ‘Bilie jee ije’? “Ma ka unu wee mara na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie”—ọ gwara nwoke ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ—“Asị m gị, bilie, buru ute gị, laa nʼụlọ.”

Nʼotu mgbe ahụ, o guzoro nʼihu ha, buru ute ya, laa nʼụlọ na-enye Nna anyị otuto. Oke ịtụnanya jidere ha niile; ha nyere Nna anyị otuto, jupụta nʼegwu, na-asị, “Anyị ahụla ihe ịtụnanya taa.”

Jisọs Kpọrọ Livaị

Mgbe nke a gasịrị, Jisọs pụrụ wee hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livaị ka ọ nọ ọdụ nʼụlọ a na-anakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.”

Ya mere Livaị biliri, hapụ ihe niile, soro ya. Mgbe ahụ, Livaị kwadoro oke oriri maka Jisọs nʼụlọ ya, oke igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ wee soro ha nọdụ na tebụl oriri. Ma ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ ha tamuru ntamu nye ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji na ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ na aṅụkọ ihe?”

Jisọs zara ha sị, “Ọ bụghị ndị ahụ ha gụrụ oke chọrọ dọkịta, kama ọ bụ ndị ọrịa. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama ndị mmehie ka ha chegharịa.”

Ajụjụ Banyere Ibu Ọnụ

Ha sịrị ya, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na-ebu ọnụ mgbe mgbe na-ekpekwa ekpere, otu a kwa ndị na-eso ụzọ ndị Farisii, ma ndị gị na-eri na-aṅụ ihe.”

Jisọs sịrị, “Unu pụrụ ime ka ndị enyi nwoke ahụ na-alụ nwunye bue ọnụ mgbe ya na ha nọ? Ma ụbọchị ndị ahụ ga-abịa mgbe a ga-anapụ ha nwoke ahụ na-alụ nwunye, mgbe ahụ, nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-ebu ọnụ.”

Ọ tụụrụ ha ilu kwa sị, “Ọ dịghị onye na-adọwa mkpirisi akwa site nʼuwe ọhụrụ dụnye ya nʼuwe ochie. Ma ọ bụghị otú a, ọ ga-adọwa uwe ọhụrụ ahụ, mkpirisi ọhụrụ ahụ agaghịkwa adaba nʼuwe ochie. Ọ dịghị onye na-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie; ma ọ bụghị otú a, mmanya ọhụrụ ahụ ga-etiwa karama akpụkpọ ahụ, wụsịa, mebie karama akpụkpọ ahụ. Mba, a ghaghị ịwụnye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ. Ọ dịghịkwa onye, mgbe ọ ṅụsịrị mmanya ochie, na-achọ nke ọhụrụ, nʼihi na ọ na-asị, ‘Nke ochie dị mma.’”