Ndị Ndu Gbaa Izu Igbu Jisọs
Otu nwanyị wụsara ude na-esi ísì ụtọ dị oké ọnụ ahịa, a baara ya mba maka ya; Judas rere ya ego mkpụrụ iri atọ. N'ime Getsemani, Jisọs rịọrọ Nna ya ka o wepụ iko ahụ mgbe ndị enyi ya na-ehi ụra mgbe niile. Mgbe e jidere ya, o gbaghị mgba. Pita ṅụrụ iyi na ọ maghị nwoke ahụ.
26 1Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a niile, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị,
2“Unu maara na Ngabiga ga-abịa mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgbuo ya nʼobe.”
3Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye nke ndị mmadụ zukọrọ nʼogige onyeisi nchụaja ahụ bụ Kaịafas, 4ha gbakọrọ izu na nzuzo ijide Jisọs ma gbuo ya. 5Ma ha sịrị, “Ọ bụghị nʼoge mmemme ahụ, ka ọgba aghara ghara ịdị nʼetiti ndị mmadụ.”
O Tee Jisọs Mmanụ Maka Olili Ozu Ya
6Ugbu a, mgbe Jisọs nọ na Betani, nʼụlọ Saịmọn onye ekpenta, 7otu nwanyị jekwuru ya, bu karama alabasta jupụtara na mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụ ahịa, wụkwasị ya nʼisi mgbe ọ nọdụrụ ala na tebụl. 8Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha, ha na-asị, “Gịnị kpatara mmefu a? 9Nʼihi na agaara ere ya ego dị ukwuu ma nye ya ndị ogbenye.”
10Jisọs maara nke a, sị ha, “Gịnị mere unu ji na-enye nwanyị a nsogbu? Ọ rụrụ m ọrụ mara mma. 11Nʼihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile. 12Nʼihi na mgbe o wụkwasịrị mmanụ isi ụtọ a nʼahụ m, o mere ya ịkwado m maka olili ozu. 13Nʼezie, agwa m unu: ebe ọbụla a na-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, a ga-akọkwa ihe o mere, maka ncheta ya.”
Judas Rara Ọkpara Nye Maka Ọlaọcha
14Mgbe ahụ, otu nʼime ndị iri na abụọ ahụ, onye a na-akpọ Judas Iskariọt, gakwuuru ndịisi nchụaja, 15sị, “Gịnị ka unu dị njikere inye m, m ga-ararakwa ya nye unu?” Ha gụpụtaara ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. 16Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ọ nọ na-achọ ohere ịrara ya nye.
Nkwadebe Maka Ngabiga
17Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme Achịcha Ekoghị Eko, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere Jisọs jụọ ya, sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị kwadebere gị ebe ị ga-eri Ngabiga?”
18Ọ sịrị, “Gaanụ nʼime obodo ahụ jekwuru otu nwoke ma gwa ya, ‘Onye Nkuzi na-asị: Oge m eruola nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri Ngabiga nʼụlọ gị.’”
19Ndị na-eso ụzọ ya mere dịka Jisọs si nye ha nʼiwu, ha kwadebekwara Ngabiga.
20Mgbe anyasị ruru, ya na ndị iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala na tebụl.
21Ka ha nọ na-eri nri, ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”
22Obi jọgburu ha nke ukwuu, onye ọbụla nʼime ha jụrụ ya, sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?”
23Ọ zara sị, “Onye mụ na ya denyere aka nʼefere ahụ ga-arara m nye. 24Nwa nke Mmadụ na-ala, dịka e dere banyere ya. Ma ahụhụ dịrị nwoke ahụ nke na-arara ya nye—ọ gaara akara ya mma ma a sị na a mụbeghị ya.”
25Judas, onye na-arara ya nye, sịrị, “Rabaị, ọ bụ m?” Ọ sịrị ya, “Ị kwuola ya.”
26Ka ha nọ na-eri nri, Jisọs weere achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị, “Naranụ, rie; nke a bụ ahụ m.” 27O weere iko, nye ekele, nye ya ha, sị, “Ṅụọnụ site na ya, unu niile, 28nʼihi na nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke a wụpụrụ maka ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie. 29Agwa m unu: Agaghị m aṅụ mkpụrụ osisi vaịn a ọzọ, site ugbu a ruo ụbọchị mụ na unu ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Nna m.”
30Mgbe ha bụchara abụ otuto, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
Jisọs Buru Amụma Ọgọnarị Pita
31Mgbe ahụ, Jisọs gwara ha, sị, “Nʼabalị a, unu niile ga-asọ ngọngọ nʼihi m. Nʼihi na e dere ya, ‘Aga m eti onye ọzụzụ atụrụ ahụ ihe, atụrụ nke ìgwè ahụ ga-agbasasịkwa.’ 32Ma mgbe e mesịrị kpọlite m, m ga-ebu unu ụzọ gaa Galili.”
33Pita sịrị ya, “Ọ bụrụgodị na ha niile asọọ ngọngọ nʼihi gị, mụ onwe m agaghị asọ ngọngọ ma ọlị.”
34Jisọs sịrị ya, “Nʼezie agwa m gị: tupu oke ọkụkọ akwaa nʼabalị a, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
35Pita sịrị, “Ọ bụrụgodị na mụ na gị aghaghị ịnwụ, agaghị m agọnarị gị.” Ndị na-eso ụzọ ya niile kwukwara otu ihe ahụ.
Ọkpara Nyefere Onwe Ya Nʼaka Nna
36Mgbe ahụ, ya na ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Getsemani, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị, “Nọdụnụ ala nʼebe a ka m na-aga ebe ahụ ikpe ekpere.”
37O duuru Pita na ụmụ Zebedi abụọ ahụ gaa, mmụọ ya malitere inwe mwute na nhụjuanya dị ukwuu.
38Mgbe ahụ ọ gwara ha, sị, “Mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mwute ruo nʼọnwụ. Nọrọnụ nʼebe a ka mụ na unu nọrọ na nche.”
39O gara nʼihu obere, daa kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere, sị, “Nna m, ọ bụrụ na o kwere omume, mee ka iko a si nʼaka m gafee. Ma ọ bụghị dịka mụ chọrọ, kama dịka gị chọrọ.”
40Ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sị Pita, “Ya mere, unu enweghị ike iso m mụrụ anya otu awa? 41Mụrụnụ anya ma na-ekpe ekpere, ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa; mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ dị mkpọmkpọ.”
42Nke ugboro abụọ, ọ pụrụ gaa kpee ekpere, sị, “Nna m, ọ bụrụ na nke a apụghị ịgafe ma ọ bụrụ na aṅụghị m ya, ka uche gị mezuo.”
43Ọ bịakwutekwara ha ọzọ, hụ ha ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya na-arọ ha arọ. 44Ya mere, ọ hapụrụ ha ọzọ, pụọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwughachi otu okwu ahụ.
45Mgbe ahụ, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Unu ka na-arahụ ụra na-ezukwa ike? Lee, oge ahụ eruola, a na-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 46Bilienụ, ka anyị gaa! Lee, onye ahụ na-arara m nye anọọla nso!”
A Rara Jisọs Nye ma Jide Ya
47Ka ọ ka nọ na-ekwu okwu, na mberede, Judas, otu nʼime ndị iri na abụọ ahụ, bịara, ya na oke igwe mmadụ bu mma agha na mkpọrọ osisi, bụ ndị ndịisi nchụaja na ndị okenye nke ndị mmadụ zipụrụ. 48Ugbu a, onye na-arara ya nye enyeworị ha ihe ịrịba ama, sị, “Onye m susuru ọnụ bụ ya—jidenụ ya.” 49Ngwa ngwa, ọ bịakwutere Jisọs, sị, “Ekele, Rabaị!” O susuu ya ọnụ.
50Jisọs gwara ya, sị, “Enyi m, mee ihe i ji bịa.” Mgbe ahụ, ha bịara jide Jisọs, jidesie ya ike.
51Ma lee, otu nʼime ndị so Jisọs setịpụrụ aka ya, mịpụta mma agha ya, tie ohu onyeisi nchụaja ahụ, bee ya ntị.
52Mgbe ahụ, Jisọs sịrị ya, “Weghachi mma agha gị nʼọnọdụ ya. Ndị niile na-eji mma agha ga-anwụ site na mma agha. 53Ì chere na m enweghị ike ịkpọku Nna m, onye ga-ezitere m ozugbo ihe karịrị ìgwè ndị mmụọ ozi iri na abụọ? 54Ma ọ bụrụ otu a, olee otu Akwụkwọ Nsọ ga-esi mezuo, nke na-asị na ọ ghaghị ime otu a?”
55Nʼoge ahụ, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ, sị, “Unu ji mma agha na mkpọrọ osisi pụta ijide m, dịka a ga-asị na m bụ onye ohi ike? Kwa ụbọchị, m na-anọdụ ala nʼụlọnsọ ukwu na-ezi ihe, ma unu ejideghị m. 56Ma ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe odide ndị amụma.” Mgbe ahụ, ndị na-eso ụzọ ya niile hapụrụ ya gbalaga.
Jisọs Nʼihu Ndị Na-ebo Ya Ebubo
57Mgbe ahụ, ndị jidere Jisọs kpọọrọ ya gakwuru Kaịafas onyeisi nchụaja, ebe ndị odeakwụkwọ na ndị okenye zukọrọ. 58Pita sochiri ya nʼebe dị anya, ruo nʼogige onyeisi nchụaja ahụ, banye, soro ndị nche nọdụ ala ịhụ otu ihe ga-esi kwụsị.
59Ndịisi nchụaja na Kansụl ahụ dum chọrọ àmà ụgha megide Jisọs, ka ha wee gbuo ya, 60ma ha achọtaghị nke ọbụla, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị àmà ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara, 61sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke ma wughachi ya nʼụbọchị atọ.’”
62Onyeisi nchụaja ahụ biliri ọtọ, sị ya, “Ị nweghị ọsịsa ọbụla? Gịnị ka ndị a na-agba àmà megide gị?” 63Ma Jisọs gbachiri nkịtị. Onyeisi nchụaja ahụ sịrị, “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi: gwa anyị ma ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.”
64Jisọs gwara ya, sị, “Ị kwuola ya. Ma agwa m unu: site ugbu a gaa nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ nọdụrụ ala nʼaka nri nke Ike, na-abịa nʼelu igwe ojii nke eluigwe.”
65Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja ahụ dọwara uwe ya, sị, “O kwuola okwu nkwulu Chineke! Gịnị mere anyị ji na-achọkwa ndị àmà? Lee, unu anụla ugbu a okwu nkwulu ahụ. 66Gịnị bụ ikpe unu?” Ha zara, sị, “O kwesịrị ọnwụ.”
67Mgbe ahụ, ha gbụrụ ya ọnụ mmiri nʼihu, tie ya ihe; ụfọdụ makwara ya aka nʼihu, 68na-asị, “Buoro anyị amụma, Kraịst! Onye tiri gị ihe?”
Pita Gọnarị Na Ya Amaghị Jisọs
69Pita nọdụrụ ala nʼèzí nʼogige ahụ. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Gị onwe gị sokwa Jisọs onye Galili ahụ.”
70Ma ọ gọnarịrị ya nʼihu ha niile, sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.”
71Ka ọ na-apụ gaa nʼọnụ ụzọ ámá ahụ, nwaagbọghọ ọzọ na-eje ozi hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ, sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọ.”
72Ọzọkwa, o were iyi gọnarị ya, sị, “Amaghị m nwoke ahụ.”
73Mgbe obere oge gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita, sị, “Nʼezie, gị onwe gị bụkwa otu onye nʼime ha, nʼihi na olu asụsụ gị na-ekpughe gị.”
74Mgbe ahụ, ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ na ịṅụ iyi, sị, “Amaghị m nwoke ahụ.” Ozugbo ahụ, oke ọkụkọ kwara akwa.
75Pita chetara okwu Jisọs: “Tupu oke ọkụkọ akwaa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Ọ pụrụ gaa nʼèzí kwaa akwa nke ukwuu.