Ọchịchọ Ya Dị nʼEbe M Nọ
Nwoke ahụ na-eto ya site n'ụkwụ ya yi akpụkpọ ụkwụ ruo na ntutu isi ya, na-enwe obi ụtọ n'ebe ọ nọ n'ihu ọha. Ọ dịghị ewezuga ya. Ọ na-ekwu na ọchịchọ ahụ dị n'etiti ha abụọ, nke ya bụkwa nke ya, mgbe ahụ ọ duru ya pụọ n'ubi vaịn na n'obodo nta, ebe o debere mkpụrụ maka ya.
7 1Lee ka ụkwụ gị si maa mma nʼime akpụkpọ ụkwụ, ada a maara aha! Ịgba apịtị gị dị ka ọla, bụ ọrụ aka onye ǹka mara ǹka. 2Otubo gị bụ efere okirikiri nke mmanya agwakọtara agwakọta na-adịghị akọ nʼime ya. Afọ gị bụ ikpo ọka wit nke okooko lili gbara gburugburu. 3Ara gị abụọ dị ka ụmụ ele abụọ, bụ ejima mgbada. 4Olu gị dị ka ụlọ elu e ji ọdụ enyí wuo. Anya gị abụọ bụ ọdọ mmiri dị na Heshbọn, nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-rabim. Imi gị dị ka ụlọ elu Lebanọn, nke na-eche ihu nʼụzọ Damaskọs. 5Isi gị na-echi gị dị ka ugwu Kamel, agịrị isi gị na-asọ asọ dị ka odo odo; e jidere otu eze nʼagbụ owuwe isi ya. 6Lee ka ị si maa mma, leekwa ka ị si dị mma, gị onye m hụrụ nʼanya, tinyere ihe ụtọ gị niile! 7Ogologo gị dị ka osisi nkwụ, ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ ya. 8Esịrị m, “Aga m arịgo nʼelu osisi nkwụ ahụ jidekwa mkpụrụ ya.” Ka ara gị abụọ dị ka ụyọkọ mkpụrụ vaịnị, ka ísì ọma nke ume gị dịkwa ka apụl, 9ka ọnụ gị dịkwa ka mmanya kacha mma. Ọ na-asọrọ onye m hụrụ nʼanya nwayọọ nwayọọ, na-asọfe nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ na eze.
10Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, ọchịchọ ya dịkwa nʼebe m nọ. 11Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị pụọ gaa nʼọhịa, nọrọkwa abalị nʼime obodo nta. 12Ka anyị bilie nʼisi ụtụtụ gaa nʼubi vaịnị ka anyị hụ ma vaịnị ọ wapụtala ome, ma okooko ha ọ ghewela oghe, ma mkpụrụ pomegranet ọ chawela okooko. Nʼebe ahụ ka m ga-enye gị ịhụnanya m. 13Mandreki na-esi ísì ọma, nʼelu ọnụ ụzọ anyị niile ka mkpụrụ kacha mma dị, ndị ọhụrụ na ndị ochie, bụ nke m chekwaara gị, onye m hụrụ nʼanya. a a v13 Mandreki bụ ahịhịa na-esi ísì ọma nke ọtụtụ mmadụ nʼoge ochie kwenyere na ha na-akpali agụụ ịhụnanya na-emekwa ka mmadụ mụọ ọmụmụ nke ọma.