Amaara M Na Onye Mgbapụta M Dị Ndụ
Job sị na Chineke emejọọla ya, mmadụ niile ndị ọzọ ahapụkwala ya: nwunye ya na-asọ oyi ume ya, ndị ohu ya anaghị ege ya ntị, ụmụaka na-akwa ya emo. Ọ chọrọ ka a pịa okwu ya na nkume. Mgbe ahụ, ìhè nke ijide n'aka na-enwu: na Onye Mgbapụta ya dị ndụ, na ya ga-eji anya ya hụ Chineke.
19 1Mgbe ahụ Job zara sị: 2“Ruo ole mgbe ka unu ga-ata mkpụrụobi m ahụhụ, were okwu na-egwepịa m? 3Ugboro iri ndị a ka unu kparịla m; ihere adịghị eme unu imejọ m. 4Ọ bụladị ọ bụrụ na m jehiere nʼezie, njehie m na-anọnyere naanị m. 5Ọ bụrụ nʼezie na unu na-ebuli onwe unu elu megide m, were ihere m mee ihe ịrụ ụka megide m, 6marakwanụ na Chineke emejọọla m, werekwa ụgbụ ya gbaa m gburugburu. 7Ana m eti mkpu, ‘Ihe ike!’ ma ọ dịghị onye na-aza m; ana m akpọ maka enyemaka, ma ikpe ziri ezi adịghị. a a v7 Iti mkpu ‘Ihe ike!’ bụ ụzọ ndị oge ochie si arịọ ọha maka ikpe ziri ezi — ọ bụ mkpu enyemaka a maara nke ọma megide ihe ọjọọ e mere gị. 8O jirila mgbidi gbachie ụzọ m ka m ghara ịgafe, o tinyekwala ọchịchịrị nʼokporo ụzọ m niile. 9O yipụla m ebube m, wepụkwa okpueze nʼisi m. 10Ọ na-akụda m nʼakụkụ niile, ruo mgbe m lara nʼiyi; o hopụla olileanya m dịka osisi. 11O sunyela iwe ya ọkụ megide m, gụọ m dịka onye iro ya. 12Ndị agha ya na-abịakọ ọnụ; ha na-ewu ikpo ọnụ agha ha megide m, maa ụlọikwuu ha gburugburu ụlọikwuu m. 13O meela ka ụmụnne m nọọ m anya, ndị maara m aghọọkwala ndị ọbịa nʼebe m nọ kpamkpam. 14Ndị ikwu m akwụsịla inyere m aka, ndị enyi m nọ m nso echefuola m. 15Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ọbịa; aghọọla m onye mba ọzọ nʼanya ha. 16Ana m akpọ odibo m, ma ọ naghị aza m; aghaghị m iji ọnụ m rịọ ya arịrịọ. 17Ume ọnụ m na-asọ nwunye m oyi, adịkwa m ụmụnne m nʼonwe ha arụ. 18Ọ bụladị ụmụntakịrị na-eleda m anya; mgbe m biliri ọtọ, ha na-ekwu okwu megide m. 19Ndị enyi m niile nọ m nso na-akpọ m asị, ndị m hụrụ nʼanya echigharịala megide m. 20Ọkpụkpụ m na-arapara nʼakpụkpọ ahụ m na nʼanụ ahụ m, ejiri m naanị akpụkpọ eze m gbanarị ọnwụ. 21Meerenụ m ebere, meerenụ m ebere, unu ndị enyi m, nʼihi na aka Chineke etiela m ihe! 22Gịnị mere unu ji na-achụ m ọsọ dịka Chineke, anụ ahụ m adịghịkwa eju unu afọ mgbe ọbụla? 23A sị na e dere okwu m niile nʼakwụkwọ! A sị na e depụtara ha nʼelu akwụkwọ mpịakọta, 24ka e jiri mkpịsị odee igwe na ọla nchara gbunye ha nʼelu oke nkume ruo mgbe ebighị ebi! 25Nʼihi na amaara m na Onye Mgbapụta m dị ndụ, nʼikpeazụkwa ọ ga-eguzo nʼelu aja. b b v25 Site nʼisi akwụkwọ ruo nʼisi akwụkwọ nke ahụhụ, Job ekwuola banyere Chineke dịka onye nọ ebe dị anya — ma nʼebe a, aha na-egosi mmekọrịta pụtara ìhè: ‘Onye Mgbapụta m,’ onye na-azọrọ ya dịka nke ya. Ọdịnala Ndị Kraịst anụla amaokwu a ogologo oge dịka olileanya mbụ ahụ Nna anyị na-emezu na Jisọs, onye ga-eguzo nʼụbọchị ikpeazụ ikpechitere ụmụ ya. 26Mgbe e mebisịkwara akpụkpọ ahụ m, ma site nʼanụ ahụ m ka m ga-ahụ Chineke, 27onye mụ onwe m ga-ahụ, anya nke aka m ga-elekwasịkwa ya anya, ọ bụghị onye ọzọ. Obi m na-ada mba nʼime m! 28Ọ bụrụ na unu asị, ‘Lee ka anyị ga-esi chụọ Job ọsọ!’ na, ‘Mgbọrọgwụ okwu ahụ dị nʼime ya,’ 29tụọnụ egwu mma agha, nʼihi na iwe na-eweta ntaramahụhụ nke mma agha, ka unu wee mara na e nwere ikpe.”