Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Job 20 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

Zọfa Zaghachi Ọzọ

Zofa zara site n'ọgbaghara nke obi ya, kọwaa mmeri dị nkenke nke onye ajọ omume: ọ na-elo akụ ma gbọpụta ya, na-edebe ihe ọjọọ n'okpuru ire ya ruo mgbe ọ ghọrọ nsi agwọ. Ọ kpọrọ nke a òkè Chineke kenyere, ọ dịghịkwa ihe ọzọ o nyere.

Isi 20.

Mgbe ahụ, Zọfa onye Neama zara sị: “Nke a bụ ihe mere echiche m na-enweghị udo ji akpali m ịza okwu, nʼihi ọgbaghara dị nʼime m. Ana m anụ ịba mba nke na-eweda m nʼala, ma site na nghọta m, mmụọ na-akpali m ịzaghachi. Nʼezie, ị maara otú ọ dịworo site nʼoge ochie, kemgbe e debere mmadụ nʼụwa: mmeri nke ndị ajọ omume na-adị nwa oge nta, ọṅụ onye na-adịghị asọpụrụ Chineke na-adịkwa naanị otu ntabi anya. Ọ bụ ezie na mpako ya na-eru nʼeluigwe, isi ya na-emetụkwa igwe ojii, ọ ga-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, dịka nsị nke aka ya; ndị hụrụ ya ga-ajụ sị, ‘Olee ebe ọ nọ?’ Ọ ga-efelaga dịka nrọ, a gaghị achọtakwa ya ọzọ, a chụpụ ya dịka ọhụụ nke abalị. Anya hụrụ ya agaghị ahụkwa ya ọzọ; ebe obibi ya agaghị elekwasịkwa ya anya ọzọ. Ụmụ ya ga-arịọ ndị ogbenye arịrịọ; aka ya abụọ ga-eweghachikwa akụ ya. Ike okorobịa nke jupụtara nʼọkpụkpụ ya ga-eso ya dinaa nʼaja. Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ụtọ nʼọnụ ya, ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya, ọ bụ ezie na ọ dịghị achọ ịhapụ ya, ọ na-edebekwa ya nʼọnụ ya, ma nri ya na-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya; ọ na-aghọkwa elo agwọ nʼime ya. Ọ na-eloda akụ ma na-agbọpụtakwa ha; Chineke na-achụpụ ha site nʼafọ ya. Ọ na-amịcha elo agwọ; eze ajụala ga-egbu ya. Ọ gaghị ahụ iyi ndị ahụ anya ọzọ, osimiri ndị na-asọ mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi gbara ọkpọ. Ọ ga-eweghachi mkpụrụ nke ndọgbu ọrụ ya na-eloghị ya; ọ gaghị erikwa uru sitere nʼahịa ya. Nʼihi na ọ zọpịara ma gbakụta ndị ogbenye azụ; o jidere ụlọ nke ọ na-ewughị. Nʼihi na afọ ya enweghị udo, ọ gaghị eji ihe ndị ahụ ọ chọsiri ike gbanarị. Ọ dịghị ihe fọdụrụ ka o rie; nʼihi ya, ịba ụba ya agaghị adịgide. Nʼoge ụba ya zuru oke, nsogbu ga-erute ya; ịdị arọ niile nke ahụhụ ga-abịakwasị ya. Mgbe o mejupụtara afọ ya, Chineke ga-atọpụ oke iwe ya na-ere ọkụ megide ya, were ya zokwasị ya dịka nri ya. Ọ bụ ezie na ọ na-agbanarị ngwa agha e ji igwe kpụọ, akụ ọla kọpa ga-amapu ya ahụ. Ọ na-adọpụta ya, ọ na-esikwa nʼahụ ya pụta; ọnụ ya na-egbuke egbuke na-esi nʼabụba ya pụta. Oke egwu na-adakwasị ya. Oké ọchịchịrị zoro onwe ya na-eche akụ ya; ọkụ nke onye ọ bụla na-amụnyeghị ga-erepịa ya ma loda ihe ọ bụla fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya. Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya, ụwa ga-ebilikwa megide ya. A ga-ebupụ akụ niile nke ụlọ ya, zachapụ ha nʼụbọchị oke iwe Chineke. Nke a bụ oke onye ajọ omume si nʼaka Chineke, ihe nketa Chineke kenyere ya.”