Job Zara: Gịnị Mere Ndị Ajọ Omume Ji Na-eme Nke Ọma?
Job ji ihe akaebe ndị enyi ya leghaara anya zaa: ndị ajọ omume na-akatakwa ahụ ma nweta ike, ụmụ ha na-agba egwu, ha na-anwụkwa n'udo mgbe ha gwasịrị Chineke ka ọ hapụ ha. Onye juru afọ na onye obi ilu na-edina n'ájá otu ọ̀tụ̀. Ọ sị na nkasi obi ha bụ ụgha.
21 1Mgbe ahụ, Job zara sị: 2“Gee ntị nke ọma na okwu m, ka nke a bụrụ nkasiobi unu na-enye m. 3Nwee ndidi nʼebe m nọ ka m na-ekwu okwu, mgbe m kwuchara, unu nwere ike ịga nʼihu na-akwa m emo. 4Ma mụ onwe m, ọ bụ megide mmadụ efu ka mkpesa m dị? Gịnị mere ndidi m agaghị eji gwụ? 5Leenụ m anya ka ihe ịtụnanya tụọ unu, werekwanụ aka unu kpuchie ọnụ unu. 6Mgbe m chetara ya, egwu na-atụ m, ịma jijiji na-ejidekwa anụ ahụ m. 7Gịnị mere ndị ajọ omume ji na-adịgide ndụ, na-aka nka ma na-abawanye nʼike? 8Ụmụ ha guzosiri ike nʼudo nʼebe ha nọ, nʼihu anya ha, ụmụ ụmụ ha nọkwa nʼihu anya ha. 9Ụlọ ha dị nʼudo, nọkwa na-enweghị egwu, mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha. 10Oke ehi ha na-agba mkpa, ọ dịghị emehie; nne ehi ha na-amụ nwa, ọ dịghịkwa akwafu ime. 11Ha na-ahapụ ụmụ ha ntakịrị ka ha na-agbagharị ka igwe atụrụ, ụmụaka ha na-awụgharịkwa elu. 12Ha na-abụ abụ nʼụda ịgbà na ụbọ akwara na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda ọjà. 13Ha na-eji ọganihu na-anọ ụbọchị ndụ ha, ha na-arịdakwa nʼili nʼudo. 14Ma ha na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka! Anyị enweghị ọchịchọ ịmara ụzọ gị. 15Onye ka Onye pụrụ ime ihe niile bụ, nke anyị ga-eji fee ya? Gịnịkwa ka anyị ga-erite site nʼikpe ekpere nye ya?’ 16Ma ọganihu ha adịghị nʼaka ha onwe ha; achọghị m inwe ihe ọbụla gbasara ndụmọdụ ndị ajọ omume. 17Ugboro ole ka a na-emenyụ oriọna ndị ajọ omume? Ugboro ole ka ọdachi ha na-adakwasị ha? Ugboro ole ka Chineke na-ekenye mmekpa ahụ nʼiwe ya? 18Ugboro ole ka ha dị ka ahịhịa akọrọ nʼihu ifufe, dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-ebufu? 19Unu na-asị, ‘Chineke na-echekwara ụmụ mmadụ ntaramahụhụ nke e kwesịrị ịta ya.’ Ka ọ kwụghachi mmadụ ahụ nʼonwe ya, ka ọ mụta ya. 20Ka anya ya hụ mbibi ya, ka ọ ṅụọkwa oke iwe nke Onye pụrụ ime ihe niile. 21Nʼihi na gịnị ka ọ na-eche banyere ezinụlọ ya nke ọ hapụrụ nʼazụ ya, mgbe e belatara ọnwa ndụ ya? 22Mmadụ ọ pụrụ izi Chineke ihe ọmụma, ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị nọ nʼelu ikpe? 23Otu onye na-anwụ mgbe ike ya zuru oke, mgbe ọ nọ nʼezumike zuru oke na nchekwa, 24ahụ ya nwere arọ nke ọma, ụmị ọkpụkpụ ya ka na-emikwa emi. 25Onye ọzọ na-anwụ nʼobi ilu, ọ dịghị mgbe ọ detụrụ ihe ọma ọbụla ire. 26Ha abụọ na-edinakọ nʼaja, ikpuru na-ekpuchikwa ha abụọ. 27Lee, amaara m echiche unu, na nzube unu iji mejọọ m. 28Nʼihi na unu na-asị, ‘Olee ebe ụlọ onye a maara ama dị ugbu a? Olee ebe ụlọ ikwu ebe ndị ajọ omume biri?’ 29Ọ bụ na unu ajụbeghị ndị na-eje ije nʼokporoụzọ? Unu agaghị anabata ihe akaebe ha na-enye, 30na a na-echebe onye ajọ omume nʼụbọchị ọdachi, na a na-anapụta ya nʼụbọchị oke iwe? 31Onye na-eguzogide ya ihu na ihu nʼihi omume ya, onyekwa na-akwụghachi ya nʼihi ihe o mere? 32A na-ebuga ya nʼili, a na-echekwa ili ya nche. 33Aja nke ndagwurugwu na-atọ ya ụtọ; mmadụ niile na-eso ya nʼazụ, ndị buru ya ụzọ enweghịkwa ọnụọgụgụ. 34Ya mere, olee otú unu ga-esi were okwu efu kasie m obi? Ọsịsa unu abụghị ihe ọzọ karịa ụgha.”