Elifaz Kwuo Okwu Ọzọ
N'ikpeazụ Elifaz chepụtara ebubo: ịnapụ ndị ogbenye uwe ha, ịjụ inye onye ike gwụrụ mmiri, ịchụpụ ndị nwaanyị di ha nwụrụ aka efu. Ọ gwara Job ka o donye onwe ya n'okpuru, tụkwasị ọlaedo ya n'ájá ma hapụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka ọ bụrụ ọlaedo ya. Ndụmọdụ ahụ na-ada mma na ntị, ma ebubo ahụ bụ ụgha.
22 1Mgbe ahụ Elifaz onye Teman zara sị: 2“Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru? Nʼezie, onye maara ihe na-abara naanị onwe ya uru. 3Ọ bụ ihe na-atọ Onye pụrụ ime ihe niile ụtọ ma ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, ka ọ bụ uru nye ya ma ọ bụrụ na i bi ndụ na-enweghị ịta ụta? 4Ọ bụ nʼihi egwu ị na-atụ ya ka o ji abara gị mba ma kpọta gị nʼikpe? 5Ọ bụghị na ajọ omume gị dị ukwuu? Ọ bụghị na mmehie gị enweghị ngwụcha? 6Nʼihi na ị naara ụmụnne gị ihe mbe nʼefu, yipụkwa ndị gba ọtọ uwe ha. 7I nyeghị ndị ike gwụrụ mmiri ka ha ṅụọ, i gbochikwara ndị agụụ na-agụ nri. 8Nwoke nwere ike nwere ala ahụ, onye a na-asọpụrụ biri nʼime ya. a a v8 Elifaz na-egosi na Job mesoro ala dịka ihe bụ naanị nke ndị dị ike, na-ahapụ ndị ogbenye nʼaka efu. 9I zipụrụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nʼaka efu, gwepịakwa ogwe aka ụmụ mgbei. 10Ọ bụ ya mere ọnya ji gbaa gị gburugburu, oke ụjọ na-abịa na mberede na-adakwasị gị; 11maọbụ ọchịchịrị, nke mere na ị pụghị ịhụ ụzọ, na idei mmiri na-ekpuchi gị. 12Ọ bụghị na Chineke nọ nʼebe dị elu nke eluigwe? Lee ka kpakpando kachasị elu si dị elu! 13Ma ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara? Ọ pụrụ ikpe ikpe site nʼoke ọchịchịrị dị otu a? 14Igwe ojii gbara ọkpụrụkpụ na-ekpuchi ya nke mere na ọ pụghị ịhụ ụzọ, ọ na-ejegharịkwa nʼelu mbara eluigwe.’ 15Ị ga-anọgide nʼụzọ ochie ahụ nke ndị ajọ omume zọrọ? 16A napụrụ ha tupu oge ha eruo, idei mmiri kwọpụrụ ntọala ha. 17Ha gwara Chineke sị, ‘Hapụ anyị aka! Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile pụrụ ime anyị?’ 18Ma ọ bụ ya mejupụtara ụlọ ha ihe ọma—ya mere achọghị m inwe ihe ọbụla gbasara atụmatụ ndị ajọ omume. 19Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrịkwa ọṅụ; ndị aka ha dị ọcha na-akwa ndị ajọ omume emo, na-asị, 20‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erechapụkwala ihe ha hapụrụ.’ 21Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ugbu a ma nwee udo gị na ya; nʼụzọ dị otu a ihe ọma ga-abịakwute gị. 22Nara ntụziaka site nʼọnụ ya, chekwaba okwu ya niile nʼobi gị. 23Ọ bụrụ na ị laghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, a ga-eweghachi gị; ọ bụrụ na i mee ka ajọ omume dị anya nʼụlọ gị, 24ma tọgbọ ọlaedo gị nʼaja, ọlaedo Ọfịa nʼetiti nkume nke ọwa mmiri, b b v24 A maara Ọfịa nke ọma nʼoge ochie dịka ebe a na-enweta ọlaedo kacha mma. 25mgbe ahụ Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya ga-abụ ọlaedo gị, bụrụkwa ọlaọcha gị dị oke ọnụ ahịa. 26Mgbe ahụ ị ga-enwe obi ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile ma welie ihu gị nye Chineke. 27Ị ga-ekpekwuru ya ekpere, ọ ga-anụ gị, ị ga-emezukwa nkwa gị niile. 28Ihe i kpebiri ka a ga-eme, ìhè ga-amụkwa nʼụzọ gị niile. 29Mgbe e wedara ndị ọzọ ala ma ị sị, ‘Welie ha elu!’, ọ ga-azọpụta ndị dara mba. 30Ọ ga-anapụta ọbụladị onye aka ya na-adịghị ọcha, onye a ga-anapụta site nʼịdị ọcha nke aka gị.”