Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Job 23 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

A Sị Na M Nwere Ike Ịchọta Ya

Job chọrọ ụlọikpe, ọ bụghị ọgụ. Ọ bụrụ na ọ pụrụ ịchọta ebe Chineke bi, ọ ga-akọwa ikpe ya, a ga-ahapụkwa ya. Ma Chineke anọghị n'ọwụwa anyanwụ ma ọ bụ n'ọdịda anyanwụ, ọ na-emekwa ihe ọ bụla masịrị ya. Job sị na ya ga-apụta dị ka ọlaedo, ma egwu ka na-atụ ya nke ukwuu.

Isi 23.

Mgbe ahụ Job zara sị: “Ọbụladị taa, mkpesa m dị ilu; aka ya dị arọ nʼagbanyeghị ịsụ ude m. A sị na m maara ebe m ga-achọta ya, ka m wee bịaruo ebe obibi ya! Aga m edozi okwu m nʼihu ya, were okwu ịrụrịta ụka jupụta ọnụ m. Aga m amụta okwu ọ ga-aza m, ghọtakwa ihe ọ ga-agwa m. Ọ ga-eji ịdị ukwuu nke ike ya na m rụọ ụka? Mba—nʼezie ọ ga-ege m ntị. Nʼebe ahụ, onye ziri ezi nwere ike iso ya kparịta ụka, a ga-agbapụtakwa m ruo mgbe ebighị ebi site nʼaka onye ikpe m. Ma ọ bụrụ na m gaa nʼọwụwa anyanwụ, ọ nọghị nʼebe ahụ; ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, apụghị m ịchọta ya. Mgbe ọ na-arụ ọrụ nʼugwu, apụghị m ịhụ ya; mgbe ọ tụgharịrị gaa na ndịda, apụghị m ịchọta ya. Ma ọ maara ụzọ m na-aga; mgbe o nwachaa m ọnwụnwa, aga m apụta dịka ọla edo. Ụkwụ m jidesiri nzọụkwụ ya ike; edebela m ụzọ ya, atụgharịghịkwa m wezuga onwe m. Apụpụghị m nʼiwu nke egbugbere ọnụ ya; echekwabela m okwu nke ọnụ ya dịka akụ, karịa nri m nke ụbọchị ọ bụla. Ma ọ naghị agbanwe agbanwe—onye pụrụ ime ka ọ laghachi azụ? Ihe ọ bụla ọ chọrọ, ọ na-eme ya. Nʼihi na ọ ga-emezu ihe o kwadooro m, ọtụtụ ihe ndị dị otú a dịkwa ya nʼobi. Ọ bụ ya mere ụjọ ji atụ m nʼihu ya; mgbe m tụgharịrị uche na ya, egwu ya na-atụ m. Chineke emeela ka obi daa m mba; Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ụjọ tụọ m. Ma ọchịchịrị emeghị ka m dere duu, ọbụladị oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.”