Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Mak 4 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

Alaeze Nna Anyị Nwere Ntị Iji Nụ Ihe

Jisọs nọ nʼụgbọ mmiri na-ezi ihe, na-akọ otu alaeze Nna anyị si abịa: mkpụrụ dara nʼụzọ, nʼelu nkume, nʼetiti ogwu na nʼezi ala; oriọna; ọka na-eto mgbe onye ọrụ ugbo na-ehi ụra; mkpụrụ mọstad. Mgbe ahụ, o mere ka oke ifufe dajụọ, nke ndị na-eso ụzọ ya ji n'aka na ọ ga-eme ka ha mikpuo.

Isi 4.

Jisọs malitekwara ịkụzi ihe ọzọ nʼakụkụ oke osimiri. Oke ìgwè mmadụ gbara ya gburugburu nke mere na ọ banyere nʼime ụgbọ mmiri nọdụ ala nʼelu mmiri, ebe ìgwè mmadụ niile nọ nʼelu ala nʼakụkụ oke osimiri. O ji ilu kụziere ha ọtụtụ ihe, nʼime nkuzi ya ọ gwara ha, sị:

“Geenụ ntị! Otu onye ọgha mkpụrụ pụrụ gaa ịgha mkpụrụ. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịara tụrichaa ha. Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼala nkume, ebe enweghị ezigbo aja, ha pupụtara ngwa ngwa nʼihi na aja ahụ emighị emi. Mgbe anyanwụ wara, ahịhịa ndị ahụ rere ọkụ, ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ, ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ahụ tolitere kpagbuo ha, ha amịghị mkpụrụ ọbụla. Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezigbo ala, na-amịpụta mkpụrụ nke puputara, too, mịa iri atọ, iri isii, otu narị ugboro karịa ihe a ghara.” O kwuru, sị, “Onye ọbụla nwere ntị iji nụ ihe, ya nụrụ.”

Mgbe ọ nọ naanị ya, ndị gbara ya gburugburu, ya na ndị Iri na Abụọ ahụ, jụrụ ya banyere ilu ndị ahụ.

Ọ sịrị ha, “E nyela unu ihe nzuzo nke alaeze Nna anyị, ma nye ndị nọ nʼèzí, ihe niile na-abịa nʼụdị ilu, ka ‘ha wee na-ele anya ma ghara ịhụ ụzọ, na-anụ ihe ma ghara ịghọta, ka ha ghara ịchegharị ka a gbaghara ha mmehie.’”

Ọ sịrị ha, “Unu aghọtaghị ilu a? Mgbe ahụ olee otú unu ga-esi ghọta ilu niile? Onye ọgha mkpụrụ na-agha okwu ahụ. Ndị a bụ ndị dị nʼakụkụ ụzọ ebe a gharala okwu ahụ: ozugbo ha nụrụ ya, Ekwensu na-abịa ozugbo wepụ okwu ahụ a gharala nʼime ha. Ndị a bụ ndị a gharala nʼala nkume, bụ ndị na-anụ okwu ahụ were ọṅụ nabata ya ozugbo. Ma ha enweghị mgbọrọgwụ nʼime onwe ha, ha na-adịgide naanị nwa oge nta; mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ha na-ada ngwa ngwa. Ndị ọzọ bụ ndị a gharala nʼetiti ogwu. Ndị a bụ ndị na-anụ okwu ahụ, ma nchegbu nke ụwa a, aghụghọ nke akụ na ụba, na agụụ nke ihe ndị ọzọ na-abanye kpagbuo okwu ahụ, ọ naghị amịkwa mkpụrụ. Ndị a bụkwa ndị a gharala nʼezigbo ala: ha na-anụ okwu ahụ, nabata ya, mịakwa mkpụrụ—iri atọ, iri isii, otu narị ugboro.”

A Na-eme Ka Ìhè Nwuo

Ọ gwara ha, “Ọ dị onye na-ewebata oriọna ka o were ya tinye nʼokpuru nkata maọbụ nʼokpuru ihe ndina—ọ bụghị nʼelu ihe ndọkwasị oriọna? Ọ dịghị ihe ezoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè; ọ dịghị ihe nzuzo nke na-agaghị apụta. Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere ntị iji nụ ihe, ya nụrụ.”

Ọ gwara ha, “Lezienụ ihe unu na-anụ anya. Ihe ọtụtụ unu ji atụ ka a ga-eji tụọrọ unu—tụkwasịkwara unu ihe ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga-enyekwu; onye na-enweghị, ọ bụladị ihe o nwere ka a ga-anapụ ya.”

Mkpụrụ Na-eto nʼOnwe Ya

O kwuru, sị, “Nke a bụ ihe alaeze Nna anyị yiri: otu nwoke na-agha mkpụrụ nʼala. Nʼabalị na nʼehihie, ma ọ na-ehi ụra ma ọ tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụta too, ọ bụ ezie na ọ maghị etú ọ si eme. Ala ahụ nʼonwe ya na-amịpụta mkpụrụ—mbụ ahịhịa, mgbe ahụ isi ya, emesịa mkpụrụ zuru ezu nʼisi ya. Ma mgbe mkpụrụ ahụ chara, ọ na-eziga mma owuwe ihe ubi ozugbo, ebe oge owuwe ihe ubi erutela.”

Mkpụrụ Mọstadị

O kwuru, sị, “Gịnị ka anyị ga-eji tụnyere alaeze Nna anyị, maọbụ olee ilu anyị ga-eji maka ya? Ọ dị ka mkpụrụ mọstadị, nke dịkarịsịrị nta nʼetiti mkpụrụ niile mgbe a ghara ya nʼala. Ma ozugbo a ghaa ya, ọ na-eto wee bụrụ nke kachasị ukwuu nʼetiti ahịhịa ubi niile, na-epupụta alaka buru ibu nke mere na ụmụ nnụnụ nke eluigwe pụrụ ịkpa akwụ nʼokpuru ndò ya.”

O ji ọtụtụ ilu dị otú a gwa ha okwu ahụ, dịka ha nwere ike ịnụ ya. O jighị ihe ọzọ gwa ha okwu ma ọ bụghị nʼilu, ma na nzuzo ọ kọwaara ndị na-eso ụzọ ya ihe niile.

Jisọs Mere Ka Oke Ifufe Dajụọ

Nʼụbọchị ahụ, mgbe uhuruchi ruru, ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.”

Ha hapụrụ ìgwè mmadụ ahụ kpọrọ ya, dịka ọ dị, nʼime ụgbọ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri ndị ọzọ sokwa ya. Oke ifufe siri ike bịara. Ebili mmiri na-etiwasị nʼime ụgbọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri amalitela iju ya. Ma Jisọs nọ na-ehi ụra nʼazụ ụgbọ ahụ nʼelu ohiri isi. Ha kpọtere ya sị, “Onye nkuzi, ọ naghị emetụ gị nʼobi na anyị na-ala nʼiyi?”

O biliri, baara ifufe mba, gwa oke osimiri, sị, “Dere jii! Dajụọ!” Ifufe kwụsịrị, ebe niile dajụrụ nnọọ. Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji atụ egwu otú a? Unu ka enwebeghị okwukwe?”

Oke egwu tụrụ ha, ha na-ajụrịta onwe ha, sị, “Onye bụ onye a, nke ọ bụladị ifufe na oke osimiri na-erubere isi?”