Olileanya ọ dị maka mmadụ?
Osisi e gburu agbu na-epulite ọzọ mgbe ọ nụrụ isi mmiri, ma mmadụ na-edina ala ma ọ dịghị ebili. Job na-eche ma ndị nwụrụ anwụ ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ, na-eche onwe ya ka e zoro ya ruo mgbe iwe ahụ gafere, e mesịa kpọghachi ya, ma sị na Chineke na-ekpochapụ olileanya dị ka mmiri na-eripịa nkume.
14 1“Mmadụ, onye nwanyị mụrụ, ụbọchị ya dị ole na ole, jupụtakwa na nsogbu. 2Ọ na-epupụta dịka okoko osisi ma kpọnwụọ; ọ na-agbapụ dịka onyinyo, ọ naghịkwa adịgide. 3Ọ bụ onye dị otu a ka ị na-elegide anya? Ị na-akpọtakwa m nʼikpe gị? 4Onye pụrụ isite nʼihe na-adịghị ọcha wepụta ihe dị ọcha? Ọ dịghị onye ọbụla. 5Ebe e kpebiela ụbọchị ya, ọnụọgụgụ ọnwa ya dị nʼaka gị, ị kaalakwa oke nke ọ na-apụghị ịgafe, 6wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, ka o nwee ike izu ike, ruo mgbe ọ rụchara ụbọchị ya dịka onye e goro ọrụ.
7“Nʼihi na olileanya dị maka osisi: ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epupụtakwa ọzọ, ome ọhụrụ ya agaghịkwa akwụsị. 8Ọ bụ ezie na mgbọrọgwụ ya na-aka nká nʼime ala, ogwe ya anwụọkwa nʼaja, 9nʼisi mmiri ọ ga-amịpụta ome ma pupụta alaka dịka osisi ọhụrụ. 10Ma mmadụ na-anwụ, tọgbọrọ nʼala; mmadụ na-eku ume ikpeazụ ya, olee ebe ọ nọ? 11Dịka mmiri si apụ nʼọdọ mmiri, osimiri na-ebelatakwa ma kpọọ nkụ, 12otu a kwa, mmadụ na-edina ala ọ naghịkwa ebili; ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa, ọ gaghị eteta maọbụ site nʼụra ya kpọtee.
13“A sịkwarị na ị ga-ezo m nʼime ili, kpuchie m ruo mgbe iwe gị gafere, kaa oge a kapịrị ọnụ maka m, ma chetakwa m! 14Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adịkwa ndụ ọzọ? Ụbọchị niile nke ọrụ m siri ike ka m ga-echere, ruo mgbe mmeghari ọhụrụ m ga-abịa. 15Ị ga-akpọ, m ga-azakwa gị; ọrụ aka gị ga-agụkwa gị agụụ. 16Nʼihi na mgbe ahụ ị ga-agụ nzọụkwụ m niile ọnụ; ị gaghịkwa na-eche mmehie m nche. 17A ga-akpachi nnupụisi m nʼime akpa, ị ga-ekpuchikwa mmehie m.
18“Ma dịka ugwu si ada wee kụwasịa, dịka e si ebugharị nkume site nʼọnọdụ ya, 19dịka mmiri si ekpochapụ nkume, idei mmiri ya na-ebupụkwa aja nke ụwa, otu a kwa ka i si ala olileanya mmadụ nʼiyi. 20Ị na-emeri ya ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-apụ apụ; ị na-emebi ihu ya ma zipụ ya. 21Ụmụ ya ndị ikom na-enweta nsọpụrụ, ọ naghịkwa ama ya; a na-eweda ha ala, ọ naghịkwa ahụ ya. 22Naanị ihe mgbu nke anụ ahụ nke ya ka ọ na-enwe, ọ na-erukwa ụjụ naanị maka onwe ya.”