Ilu nke Mkpụrụobi
Na-agwa Chineke okwu ozugbo, Job jụrụ ihe ebubo ahụ bụ. Aka ndị ahụ wụsara ya dị ka mmiri ara ehi ma were akpụkpọ yikwasị ya na-achụ ya ugbu a dị ka ọdụm. Naanị ihe ọ rịọrọ bụ ka a hapụ ya obere oge tupu ọ gaa nʼala ọchịchịrị.
10 1“Akpọrọ m ndụ nke m asị. Aga m ahapụ mkpesa m ka o nwere onwe ya; aga m ekwu okwu site nʼilu nke mkpụrụobi m. 2Aga m asị Chineke: Amala m ikpe; mee ka m mara ihe kpatara i ji na-ese m okwu. 3Ọ na-atọ gị ụtọ imegbu mmadụ, ịkpọ ọrụ aka gị asị mgbe ị na-amụ ọchị nʼatụmatụ ndị ajọ omume? 4Ị nwere anya nke anụ ahụ? Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ efu si ahụ? 5Ụbọchị gị ọ dị ka ụbọchị mmadụ efu, ka afọ gị ha dị ka afọ nwoke, 6nke mere na ị ga-achọpụtarịrị ikpe ọmụma m ma na-achụso mmehie m, 7ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m, ọ dịghịkwa onye pụrụ ịnapụta m nʼaka gị?
8“Aka gị kpụrụ m ma mee m, akụkụ ọ bụla nke m, ma ugbu a ị tụgharịala bibie m. 9Cheta na i ji ụrọ kpụọ m. Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ugbu a? 10Ọ bụ na i wụpụghị m dịka mmiri ara ehi, mee ka m kwakọọ dịka chiiz, 11i jiri akpụkpọ ahụ na anụ ahụ yikwasị m uwe, jirikwa ọkpụkpụ na akwara dụkọọ m ọnụ? 12I nyere m ndụ na ịhụnanya ọgbụgba ndụ, nlekọta gị echekwaalakwa mmụọ m.
13“Ma i zoro nke a nʼobi gị, amaarakwa m na nke a bụ nzube gị: 14ọ bụrụ na m mehie, ị ga na-ele m anya, ị gaghịkwa agbaghara m ikpe ọmụma m. 15Ọ bụrụ na ikpe maara m, ahụhụ dịịrị m! Ọ bụladị ma ọ bụrụ na aka m dị ọcha, enweghị m ike iwelite isi m—ihere jupụtara m, nsogbu m na-emikpu m. 16Ọ bụrụ na m welite isi m elu, ị na-achụ m dịka ọdụm, na-emekwa ọrụ ebube megide m ọzọ. 17Ị na-eweta ndị akaebe ọhụrụ megide m, na-awụsakwa m iwe gị karịa; ebili mmiri nsogbu na-esochi ibe ya na-adakwasị m.
18“Gịnị mere i ji mepụta m site nʼakpanwa? Ọ gaara akara m mma ma a sị na m nwụrụ tupu anya ọ bụla ahụ m. 19Agaara m adị ka a ga-asị na adịtụbeghị m, e si nʼakpanwa buru m ọtọ gaa nʼili. 20Ọ bụ na ụbọchị m adịghị ole na ole? Wepụ onwe gị nʼebe m nọ, hapụ m naanị m, ka m nwee obere oge nkasiobi, 21tupu m gaa nʼebe a na-adịghị esi alọta, nʼala ọchịchịrị na oke onyinyo, 22nʼala ọchịchịrị dị ka oke abalị, ala oke onyinyo na ọgbaghara, ebe ọ bụladị ìhè dị ka ọchịchịrị.”