Zofa Zaghachi
Zofa kacha sie ike n'okwu ya: Job na-ekwu okwu karịa, Chineke ataghịkwa ya ahụhụ dị ka ikpe ọmụma ya kwesịrị. Ọ sịrị, wepụ mmehie n'ụlọ ikwu gị, ndụ gị ga-enwukwa karịa ehihie. O ji n'aka kpam kpam, ma ọ bụ nwoke aka ya dị ọcha ka ọ na-agwa ya.
11 1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị: 2“Ọ bụ na a gaghị azaghachi ọtụtụ okwu ndị a? Ọ bụ na a ga-agụ nwoke jupụtara nʼokwu dịka onye ziri ezi? 3Ọ bụ na okwu efu gị ga-eme ka ndị ọzọ gba nkịtị? Ị ga-akwa emo mgbe ọ dịghị onye ga-eme ka ihere mee gị? 4Nʼihi na ị na-asị, ‘Nkuzi m dị ọcha, adịkwa m ọcha nʼanya gị.’ 5Ma, a sị na Chineke ga-ekwu okwu, meghee egbugbere ọnụ ya megide gị, 6kpugheere gị ihe nzuzo nke amamihe—nʼihi na ezigbo amamihe nwere akụkụ abụọ. Mara na Chineke na-ata gị ahụhụ dị ntakịrị karịa ka mmehie gị kwesịrị. 7Ị pụrụ ịghọta ihe omimi nke Chineke? Ị pụrụ ịchọpụta oke nke Onye pụrụ ime ihe niile? 8Ha dị elu karịa eluigwe—gịnị ka ị pụrụ ime? Ha miri emi karịa ili—gịnị ka ị pụrụ ịma? 9Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa, dịkwa obosara karịa oke osimiri. 10Ọ bụrụ na ọ gafee, tụọ mmadụ nʼụlọ mkpọrọ, kpọọ ya nʼikpe, ònye nwere ike igbochi ya? 11Nʼihi na ọ maara ndị na-abaghị uru; mgbe ọ hụrụ ajọ omume, ọ gaghị eleba ya anya? 12Ma onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe mgbe a mụrụ nwa ịnyịnya ibu ọhịa ka mmadụ. 13Ọ bụrụ na i dozie obi gị, setịpụ aka gị abụọ nye ya, 14ọ bụrụ na mmehie dị gị nʼaka, wezuga ya, ekwekwala ka ajọ omume biri nʼụlọikwuu gị, 15mgbe ahụ, nʼezie, ị ga-eweli ihu gị elu, ihere agaghị eme gị; ị ga-eguzosi ike, ị gaghị atụkwa egwu. 16Ị ga-echefu nhụjuanya gị, ị ga-echeta ya dịka mmiri nke sọgaworo. 17Ndụ gị ga-enwu gbaa ọkụ karịa etiti ehihie; ọchịchịrị ya ga-adị ka ụtụtụ. 18Ị ga-enwe ntụkwasị obi, nʼihi na olileanya dị; ị ga-eleghari anya ma dinaa ala nʼudo. 19Ị ga-edina ala, ọ dịghị onye ga-eme ka ị tụọ egwu, ọtụtụ mmadụ ga-achọkwa ihuọma gị. 20Ma anya ndị ajọ omume ga-ada mba; ụzọ mgbapụ ọbụla ga-efunarị ha, naanị olileanya ha bụ ịkụ ume ikpeazụ.”