Hoshea, Eze Ikpeazụ nke Izrel
Sameria dara mgbe a nọchibidoro ya afọ atọ, e wee dọkpụrụ Izrel nʼagha. Onye dere akụkọ ahụ kwụsịrị akụkọ ahụ ikwu ihe kpatara ya: ha fere arụsị nʼagbanyeghị ịdọ aka na ntị nke onye amụma ọbụla. A kụziri ndị ọbịa e mere ka ha biri nʼala ahụ ịtụ egwu Nna anyị ma ha ka na-efe chi nke ha, ụmụ ha ka na-emekwa otu ahụ.
17 1Nʼafọ nke iri na abụọ nke Ehaz eze Juda, Hoshea nwa Ila ghọrọ eze nʼIzrel na Sameria, ọ chịkwara afọ itoolu. 2O mere ihe ọjọọ nʼihu Nna anyị, ọ bụ ezie na ọ bụghị dịka ndị eze Izrel buru ya ụzọ. 3Shalmaneza eze Asịrịa biliri megide ya, Hoshea ghọkwara onye na-ejere ya ozi, na-atụkwara ya ụtụ. 4Mana eze Asịrịa chọpụtara na Hoshea na-agba ụzọ aghụghọ: o zigaara So eze Ijipt ndị ozi, kwụsịkwa ịtụ eze Asịrịa ụtụ afọ ọ bụla. Ya mere eze Asịrịa jidere ya kee ya agbụ nʼụlọ mkpọrọ. 5Eze Asịrịa wakporo ala ahụ niile, gbagoo ruo Sameria, nọchibido ya afọ atọ.
Sameria Daara Asịrịa
6Nʼafọ nke itoolu nke Hoshea, eze Asịrịa weere Sameria, dọkpụrụ Izrel nʼagha gaa Asịrịa, mee ka ha biri na Hala, nʼakụkụ Hebọ, osimiri Gozan, nakwa nʼobodo niile nke Midia.
7Ihe ndị a niile mere nʼihi na Izrel mehiere megide Nna anyị, onye kpọpụtara ha site nʼIjipt, site nʼokpuru aka Fero eze Ijipt, ha fekwara chi ndị ọzọ ofufe, 8ha gbasokwara omenala nke mba ndị ahụ Nna anyị chụpụrụ nʼihu ha, nakwa omenala ndị eze Izrel webatara. 9Izrel mere ihe na-ezighi ezi na nzuzo megide Nna anyị, na-ewu ebe dị elu nʼobodo ha niile, site nʼụlọ elu nche ruo nʼobodo e wusiri ike. 10Ha guzobere ogidi nsọ na osisi Ashera nʼelu ugwu ọ bụla dị elu na nʼokpuru osisi ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ. 11Nʼebe dị elu ọ bụla ha na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịka mba ndị ahụ Nna anyị chụpụrụ nʼihu ha. Ha mere ihe ọjọọ nke kpasuru Nna anyị iwe.
12Ha fere arụsị ofufe, ọ bụ ezie na Nna anyị gwaworo ha, sị, “Unu emela ihe dị otu a.” 13Nna anyị dọrọ Izrel na Juda aka na ntị site nʼaka onye amụma na onye ọhụ ụzọ ọ bụla, sị, “Sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu chigharịa ma debe iwu m na ụkpụrụ m—iwu ahụ niile m nyere nna nna unu ha ma zitere unu site nʼaka ndị ohu m bụ ndị amụma.”
14Mana ha jụrụ ige ntị. Ha mere olu ha ike dịka nna nna ha, bụ ndị na-atụkwasịghị Nna anyị obi. 15Ha jụrụ ụkpụrụ ya, na ọgbụgba ndụ ya na nna nna ha gbara, nakwa ịdọ aka na ntị ya. Ha gbasoro arụsị na-abaghị uru, ghọọkwa ndị na-abaghị uru, na-eṅomi mba ndị gbara ha gburugburu bụ ndị Nna anyị machibidoro ha iṅomi. 16Ha gbakụtara iwu Nna anyị niile azụ, kpụọ arụsị nwa ehi abụọ e ji ọla kpụọ na osisi Ashera, kpọọ isiala nye ìgwè kpakpando niile nke eluigwe, feekwa Bal ofufe. 17Ha jiri ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwanyị chụọ àjà nʼọkụ, na-agba afa na-emekwa amoosu, resị onwe ha ime ihe ọjọọ nʼihu Nna anyị, na-akpasu ya iwe. 18Ya mere, Nna anyị were iwe dị ukwuu megide Izrel, wepụ ha nʼihu ya. Ọ bụ naanị ebo Juda fọdụrụ, 19Juda nʼonwe ya edebeghị iwu Nna anyị, kama gbasoro omume Izrel. 20Ya mere Nna anyị jụrụ ụmụ Izrel niile, wetara ha ahụhụ, were ha nyefee nʼaka ndị na-apụnara mmadụ ihe ruo mgbe ọ tụpụrụ ha site nʼihu ya. 21Mgbe Nna anyị dọwapụrụ Izrel site nʼezinụlọ Devid, ha mere Jerobọm nwa Nebat eze ha. Jerobọm mere ka Izrel kwụsị iso Nna anyị, duba ha na mmehie dị ukwuu. 22Izrel nọgidere na mmehie niile Jerobọm mere; ha esiteghị na ha chigharịa, 23ruo mgbe Nna anyị wepụrụ Izrel nʼihu ya, dịka o kwuru site nʼaka ndị ohu ya niile bụ ndị amụma. Ya mere a dọkpụrụ Izrel nʼagha site nʼala ha gaa Asịrịa, ebe ha nọ ruo taa.
Ndị Ọbịa Ebiri nʼAla Ahụ
24Eze Asịrịa si na Babilọn, na Kuta, na Ava, na Hamat, na Sefavaim kpọta ndị mmadụ, mee ka ha biri nʼobodo niile nke Sameria nʼọnọdụ Izrel. Ha nwetara Sameria biri nʼobodo ya niile. 25Mgbe ha mbụ biri nʼebe ahụ, ha efeghị Nna anyị ofufe; ya mere o zitere ọdụm nʼetiti ha, ndị gburu ụfọdụ nʼime ha. 26Ha gwara eze Asịrịa, sị, “Mba ndị ahụ ị dọkpụụrụ nʼagha gaa nʼobodo niile nke Sameria amaghị ihe chi nke ala ahụ chọrọ. Ya mere o zitere ọdụm nʼetiti ha, na-egbu ha, nʼihi na ha amaghị ihe chi nke ala ahụ chọrọ.”
27Eze Asịrịa nyere iwu, sị, “Zighachinụ otu onye nchụàjà unu si na Sameria dọkpụrụ nʼagha. Ka o biri nʼebe ahụ kuziere ndị mmadụ ihe chi nke ala ahụ chọrọ.”
28Ya mere otu onye nchụàjà a dọkpụrụ nʼagha site na Sameria biri na Betel, kuziere ha otú ha ga-esi fee Nna anyị ofufe.
29Mana mba ọ bụla mere chi nke aka ya, debe ha nʼụlọ arụsị nke ebe dị elu ndị Sameria wuru, mba ọ bụla nʼobodo ebe o bi. 30Ndị si na Babilọn mere Sukọt-Benọt, ndị si na Kut mere Nergal, ndị si na Hamat mere Ashima, 31ndị Ava mere Nibhaz na Tatak, ndị Sefavaim jiri ụmụ ha chụọ àjà nʼọkụ nye Adramelek na Anamelek, chi ndị Sefavaim. 32Ha fere Nna anyị ofufe, ma họpụtakwa site nʼetiti onwe ha ụdị ndị nchụàjà niile maka ebe ndị dị elu, ndị na-achụrụ ha àjà nʼụlọ arụsị ahụ. 33Ha fere Nna anyị ofufe, ma na-efekwa chi nke aka ha dịka omenala nke mba ndị ahụ a si nʼebe ha nọ dọkpụrụ ha nʼagha. 34Ruo taa ha na-edebe omenala ha oge gboo. Ha anaghị efe Nna anyị ofufe, ha anaghịkwa agbaso ụkpụrụ, na ụkpụrụ omume, na iwu, na ihe enyere nʼiwu nke Nna anyị nyere ụmụ Jekọb, ndị ọ gụrụ aha Izrel.
35Mgbe Nna anyị na ha gbara ọgbụgba ndụ, o nyere ha iwu, sị, “Unu efela chi ndị ọzọ ofufe, unu akpọkwala ha isiala, unu efekwala ha, unu achụkwaara ha àjà. 36Kama Nna unu bụ onye jiri ike dị ukwuu na ogwe aka e setịpụrụ esetịpụ kpọpụta unu site nʼIjipt—feenụ ya ofufe. Kpọọrọ ya isiala; chụọrọ ya àjà. 37Lezienụ anya mgbe niile idebe ụkpụrụ, na ụkpụrụ omume, na iwu, na ihe enyere nʼiwu o deeere unu. Unu efela chi ndị ọzọ ofufe. 38Unu echefula ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara, unu efekwala chi ndị ọzọ ofufe. 39Kama feenụ Nna unu ofufe, ọ ga-anapụtakwa unu site nʼaka ndị iro unu niile.”
40Otú ọ dị, ha jụrụ ige ntị, kama ha nọgidere nʼomenala ha oge gboo. 41Mba ndị a fere Nna anyị ofufe, ma na-efekwa arụsị ha. Ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha na-eme dịka nna nna ha mere, ruo taa.