Elifaz Kwuru Okwu
Elifaz malitere nwayọọ: Job emeela ka ndị ọzọ guzosie ike, ya mere izi ezi ya kwesịrị ịbụ olileanya ya. Mgbe ahụ arụmụka ahụ bịara, na ndị aka ha dị ọcha anaghị ala nʼiyi, na ọhụụ abalị na-asụ nʼolu nta na ọ dịghị onye efu dị ọcha nʼihu Onye kere ya. Ọ bụ nkasi obi nke ebubo zoro nʼime ya.
4 1Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị: 2“Ọ bụrụ na mmadụ anwaa ikwuru gị okwu, ike ọ ga-agwụ gị? Ma onye pụrụ ijide onwe ya ka ọ ghara ikwu okwu? 3Lee, ị kuziirila ọtụtụ mmadụ, i meekwala ka aka ndị na-ada mba sie ike. 4Okwu ọnụ gị eweliela onye na-asọ ngọngọ elu, i meekwala ka ikpere na-ada mba guzosie ike. 5Ma ugbu a, ọ bịakwutere gị, ike agwụla gị; ọ metụrụ gị aka, obi alọọla gị mmiri. 6Ọ bụ na egwu ị na-atụ Chineke abụghị ihe ị tụkwasịrị obi, izi ezi nke ụzọ gị abụghịkwa olileanya gị? 7Cheta ugbu a: onye, nke aka ya dị ọcha, larala nʼiyi mgbe ọbụla? Olee ebe e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi? 8Dịka m hụworo, ndị na-akọ ajọ omume ma na-agha nsogbu na-aghọ otu ihe ahụ. 9Site nʼume Chineke, ha na-ala nʼiyi, site nʼifufe nke iwe ya, a na-erepịa ha. 10Mbigbọ nke ọdụm, olu nke ọdụm na-eme oke egwu, eze nke ụmụ ọdụm—ha ka a gbajiela. 11Ọdụm dị ike na-ala nʼiyi nʼihi enweghị anụ ọ ga-adọgbu, a na-achịsasịkwa ụmụ nne ọdụm. 12Ugbu a, e zitere m otu okwu na nzuzo; ntị m nụrụ ntakịrị ya e kwuru nʼolu dị nro. 13Nʼetiti echiche na-enye nsogbu si nʼọhụ nke abalị, mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ, 14egwu dakwasịrị m, na ịma jijiji, o mekwara ka ọkpụkpụ m niile maa jijiji. 15Otu mmụọ gafere nʼihu m; ajị dị m nʼahụ guzoro ọtọ. 16O guzoro otu ebe, ma apụghị m ịmata ụdị ọ dị. Oyiyi dị nʼihu anya m; ọ dịrị jụụ, mgbe ahụ anụ m otu olu: 17‘Mmadụ nwụ anwụ ọ pụrụ ịbụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Nwoke ọ pụrụ ịdị ọcha nʼihu Onye kere ya? a a v17 Elifaz na-eche Chineke dịka onye ikpe nọ ebe dị anya, onye ọ dịghị onye nwụ anwụ pụrụ iguzo nʼihu ya — nke a bụ ụdị okwu ndị enyi atọ ahụ agaghị agbanarị, na ụdị nkọwa nke isiakwụkwọ ndị ikpeazụ nke akwụkwọ a na-ekpughe dịka ihe na-amaghị Nna anyị. 18Lee, ọ dịghị atụkwasị ndị na-ejere ya ozi obi, ọ na-ebokwara ndị mmụọ ozi ya ebubo njehie; 19ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịbụ ndị bi nʼụlọ e ji ụrọ wuo, ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị a na-egwepịa dịka nla. 20Nʼetiti ụtụtụ na anyasị, a na-etipịa ha; na-enweghị onye na-achọpụta ya, ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. 21Ọ bụ na a naghị edọpụta eriri ụlọ ikwu ha nʼime ha? Ha na-anwụ na-enwetabeghị amamihe.’” b b v21 Ihe atụ nke eriri ụlọ ikwu na-egosi ndụ dịka ụlọ ikwu: mgbe a dọpụtara eriri ya, ụlọ ahụ dum na-adakpọ ma laa.