Onye Tọhapụrụ Ịnyịnya Ibu Ọhịa?
Ajụjụ ndị ahụ gara nʼihu site nʼanụ ọhịa ndị na-achọghị ka mmadụ lekọta ha: ewu ugwu na-amụ nwa naanị ya, ịnyịnya ibu nke na-eleda obodo mepere emepe anya, enyi nnụnụ nke na-echefu akwa ya, ịnyịnya nke na-achị egwu ọchị, ugo nʼelu nkume ya. Ọ dịghị nke ọ bụla nʼime ha na-ejere Job ozi maka ọdịmma ya.
39 1“Ị maara mgbe ewu ugwu na-amụ nwa? Ị na-elekọta nne ele mgbe ha na-amụ nwa? 2Ị pụrụ ịgụ ọnwa ndị ha ji dị ime? Ị maara mgbe ha na-amụ nwa? 3Ha na-amakpu ala mụọ ụmụ ha; ihe mgbu ọmụmụ ha agwụla. 4Ụmụ ha na-eto ka ha dị ike nʼọhịa; ha na-apụ, ha anaghịkwa alọghachi.
5“Onye tọhapụrụ ịnyịnya ibu ọhịa? Onye tọpụrụ ụdọ e kere ịnyịnya ibu na-agba ọsọ ọsọ, 6onye m nyere ọzara ka ọ bụrụ ebe obibi ya, nyekwa ya ala nnu ka ọ bụrụ ebe obibi? 7Ọ na-eleda mkpọtụ obodo anya, ọ naghịkwa anụ mkpu onye na-achị ya. 8Ọ na-awagharị nʼelu ugwu na-achọ ebe ọ ga-ata nri, na-achọ ihe ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ ndụ.
9“Ehi ọhịa ọ ga-ekwe ijere gị ozi? Ọ ga-anọ nʼabalị nʼakụkụ ihe nri gị? 10Ị pụrụ iji ụdọ kee ehi ọhịa nʼolulu ubi? Ọ ga-akọ ndagwurugwu nʼazụ gị? 11Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya dị ukwuu? Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ gị? 12Ị pụrụ ịtụkwasị ya obi ka o bughachitere gị ọka gị, chịkọtaakwa ya nʼebe ị na-azọcha ọka?
13“Nku enyi nnụnụ na-efegharị nʼaṅụrị, ma ha ọ bụ abụba na nku nke ụgbala? 14Ọ na-ahapụ akwa ya nʼala, hapụ ha ka ha na-ekpo ọkụ nʼaja, 15na-echefu na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha, maọbụ na anụ ọhịa nwere ike ịzọtọọ ha. 16Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike, dị ka a ga-asị na ha abụghị nke ya; ọ dịghị atụ egwu na ndọgbu ya nʼọrụ bụ nʼefu, 17nʼihi na emere m ka o chefuo amamihe, enyeghịkwa m ya oke nʼime nghọta. 18Ma mgbe ọ malitere ịgba ọsọ, ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ya ọchị.
19“Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya? Ọ bụ gị na-eyikwasị olu ya ajị na-efegharị efegharị? 20Ọ bụ gị na-eme ka ọ wụlie elu dị ka igurube? Mkpọtụ imi ya nke mpako na-eweta oke egwu. 21Ọ na-azọ ala ike ike na ndagwurugwu, na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ike ya; ọ na-agbaba ọsọ banye nʼagha. 22Ọ na-achị egwu ọchị, ụjọ adịghịkwa atụ ya; ọ naghị atụgharị azụ site na mma agha. 23Akpa àkụ na-ebigbọ nʼahụ ya, ùbe na-egbuke egbuke na àrụ. 24Jiri ọkụ obi na iwe dị egwu, ọ na-eri ala; ọ pụghị iguzo otu ebe mgbe opi na-ada. 25Mgbe opi dara, ọ na-asị, ‘Aha!’ Ọ na-anụ isi agha site nʼebe dị anya, egbe eluigwe nke ndị ọchịagha na mkpu agha.
26“Ọ bụ site na nghọta gị ka egbe ji efe efe, gbasaakwa nku ya chee ihu na ndịda? 27Ọ bụ nʼiwu gị ka ugo ji efeli elu, wuokwa akwụ ya nʼebe dị elu? 28Ọ na-ebi nʼelu nkume, meekwa ebe ahụ ụlọ ya, nʼelu ọnụ ọgba nkume, bụ ebe ya e wusiri ike. 29Site nʼebe ahụ ka ọ na-achọ nri ya; anya ya na-ahụ ya site nʼebe dị anya. 30Ụmụ ya na-aṅụju ọbara afọ; ebe ọ bụla ndị e gburu egbu dị, nʼebe ahụ ka ọ nọ.”