Nna Anyị Zara site nʼOke Ifufe
Nna anyị mesịrị zaa, site nʼoké ifufe, were ajụjụ kama nkọwa. Olee ebe ị nọ mgbe e tọrọ ntọala ụwa, mgbe e ji igwe ojii fụchie oké osimiri? Onye bụ nna mmiri ozuzo, onye na-enye ọdụm nri, onye na-anụ ụmụ ugolo? Akpọtụghị ahụhụ Job aha ọ bụla.
38 1Mgbe ahụ, Nna anyị sitere nʼoke ifufe zaghachi Job, sị: a a v1 Mgbe isi iri atọ na ise gasịrị, bụ nke ndị enyi Job nọ na-arụrịta ụka banyere Chineke dị anya nke ha na-amaghị dịka Nna, Nna anyị nʼonwe ya sitere nʼoke ifufe kwuo okwu — ihu na ihu ya na nwa ya nke na-ata ahụhụ.
2“Onye bụ onye a nke na-eji okwu na-enweghị ihe ọmụma eme ka ndụmọdụ gbaa ọchịchịrị? 3Jikere onwe gị dịka dimkpa; aga m ajụ gị ajụjụ, ị ga-azakwa m. 4Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m, ọ bụrụ na ị nwere nghọta. 5Onye họpụtara ihe ọtụtụ ya—nʼezie ị maara! Maọbụ onye setịpụrụ eriri ọtụtụ gafee ya? 6Nʼelu gịnị ka e wuru ntọala ya, maọbụ onye tọrọ nkume isi mpụta ya, 7mgbe kpakpando ụtụtụ niile bụkọrọ abụ ọnụ, mgbe ndị niile bi nʼeluigwe tiri mkpu ọ̇ṅụ? 8Maọbụ onye jiri ọnụ ụzọ mechie oke osimiri mgbe o si nʼakpanwa gbapụta, 9mgbe m jiri igwe ojii mere uwe ya, jirikwa oke ọchịchịrị mere ákwà eji ekechi ya, 10mgbe m kpaara ya oke m, dọnyekwa mkpọrọ na ọnụ ụzọ ya, 11ma sị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-abịaru, ma ị gaghị agafe ya; nʼebe a ka ebili mmiri mpako gị ga-akwụsị’? 12Ị nyetụla ụtụtụ iwu mgbe ọ bụla, maọbụ nye chi ọbụbọ ọnọdụ ya, 13ka o jide nsọtụ ụwa niile ma site na ya kuchapụ ndị ajọ omume? 14Ụwa na-ewere ụdịdị dịka ụrọ nke e ji akara pịnye, ọdịdị ya na-apụtakwa ìhè dịka mpịaji uwe. 15Nʼebe ndị ajọ omume nọ ka a na-egbochi ìhè ha, a na-agbajikwa ogwe aka ha e weliri elu. 16Ị gatụla nʼisi iyi nke oke osimiri, maọbụ jegharịa nʼebe miri emi nke ogbu mmiri? 17E kpughetụla ọnụ ụzọ ama ọnwụ nye gị, maọbụ ị hụtụla ọnụ ụzọ ama nke oke ọchịchịrị? 18Ị ghọtatụla obosara ụwa buru ibu? Gwa m, ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile. 19Ebee ka ụzọ na-eduga nʼụlọ ìhè dị, ebeekwa ka ebe obibi nke ọchịchịrị dị, 20ka i were duru ya ruo nʼoke ala ya, maramkwa ụzọ niile na-eduga nʼụlọ ya? 21Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọlarị gị, ọnụ ọgụgụ ụbọchị gị dịkwa ukwuu! 22Ị banyetụla nʼụlọ nkwakọba snoo, maọbụ hụ ụlọ nkwakọba mkpụrụ mmiri igwe, 23nke m debere maka oge nsogbu, maka ụbọchị ọgụ na agha? 24Olee ụzọ na-eduga nʼebe a na-ekewa ìhè, maọbụ ebe a na-efesasị ikuku ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa? 25Onye gwuru ọwa maka oke mmiri ozuzo, meekwa ụzọ maka mmiri egbe eluigwe, 26iji wetara mmiri ozuzo nʼala nke mmadụ na-ebighị, nʼọzara ebe mmadụ ọ bụla na-anọghị, 27iji mee ka ala kpọrọ nkụ na nke tọgbọrọ nʼefu afọ ju ya, meekwa ka ala akpịrị na-akpọ nkụ pupụta ahịhịa? 28Mmiri ozuzo ọ̀ nwere nna? Onye mụrụ mkpụrụ igirigi? 29Site nʼakpanwa onye ka mmiri oyi si pụta, onye mụrụ igirigi oyi nke eluigwe, 30mgbe mmiri na-akpọ nkụ dịka nkume, mgbe elu nke ogbu mmiri na-akpọnwụ ike ike? 31Ị̀ nwere ike ikechi agbụ nke ụyọkọ kpakpando Pleiadis, maọbụ ịtọpụ eriri nke Orayọn? b b v31 Pleiadis bụ ụyọkọ kpakpando gbakọrọ nso nso; Orayọn bụ ìgwè kpakpando a ma ama — ha abụọ bụ ihe ọmaraụzọ nke mbara igwe nke abalị. 32Ị̀ nwere ike ịkpọpụta ìgwè kpakpando nʼoge ha, maọbụ ịdu kpakpando Bea ya na ụmụ ya? 33Ị̀ maara iwu nke eluigwe? Ị̀ nwere ike ịhazi ọchịchị ha nʼelu ụwa? 34Ị̀ nwere ike iweli olu gị elu nye igwe ojii, mee ka idei mmiri kpuchie gị? 35Ị̀ nwere ike izipu àmụmà égbè eluigwe ka ha gaa, na-akọrọ gị, sị, ‘Lee anyị nʼebe a’? 36Onye tinyere amamihe nʼime obi, maọbụ nye mmụọ nghọta? 37Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii ọnụ? Onye nwere ike ịkwatu ite mmiri nke eluigwe, 38mgbe aja na-akpọkọta ọnụ ghọọ otu, mgbe ọkpụrụkpụ aja na-arapara nʼibe ya? 39Ị̀ nwere ike ịchụtara nne ọdụm anụ oriri, maọbụ mee ka agụụ ụmụ ọdụm gwụ, 40mgbe ha makpuru nʼọgba ha, maọbụ zoo onwe ha nʼọhịa na-eche nche? 41Onye na-enye ugolọma nri mgbe ụmụ ya na-etiku m mkpu, na-awagharịkwa nʼihi enweghị nri?”