Égbè Eluigwe nke Olu Ya
Obi Elaịhu na-akụ ike nʼihi égbè eluigwe. Ọ kọwara snoo, ice na igwe ojii na-atụgharị nʼiwu Chineke, e zitere maka mmezi ma ọ bụ maka ịhụnanya ọgbụgba ndụ, ma jụọ ma Job ọ̀ pụrụ ịgbasa eluigwe. Ọ sịrị, guzoro jụụ tụgharịa uche, ka oké ifufe na-achịkọta onwe ya nʼọnụ eluigwe.
37 1“Nʼihi nke a kwa, obi m na-ama jijiji, na-amapụ nʼọnọdụ ya. 2Gee ntị nke ọma nʼégbè eluigwe nke olu ya, geekwa ntị nʼụzụ na-esi nʼọnụ ya apụta. 3Ọ na-atọpụ ya nʼokpuru mbara eluigwe niile, zipụkwa amụma ya ruo akụkụ ụwa niile. 4Nʼazụ ya, otu olu na-ebigbọ; o ji olu dị ebube na-ada égbè eluigwe, ọ naghịkwa egbochi amụma mgbe a nụrụ olu ya. 5Chineke ji olu ya na-ada égbè eluigwe nʼụzọ dị ịtụnanya; ọ na-eme oké ihe ndị anyị na-apụghị ịghọta. 6Nʼihi na ọ na-agwa snoo sị, ‘Daa nʼelu ụwa,’ na-agwakwa mmiri ozuzo sị, ‘Bụrụ oké mmiri na-ezo ike.’ 7Ọ na-akachi aka onye ọ bụla, ka onye ọ bụla o kere mata ọrụ ya. a a v7 “Ịkachi aka” bụ akpaalaokwu Hibru: oké mmiri Chineke na-akwụsị ọrụ niile mmadụ na-arụ, na-eme ka ndị mmadụ kwụsị ma hụ ihe ọ na-eme. 8Mgbe ahụ, ụmụ anụmanụ na-abanye nʼọgba ha, na-anọgidekwa nʼebe obibi ha. 9Site nʼụlọ ya ka oké ifufe na-esi abịa, oyi na-esikwa nʼifufe ndị na-efesasị abịa. 10Site nʼume Chineke ka mkpụrụ mmiri oyi na-akpụ, mmiri sara mbara na-akpụkwa ike. 11Ọ na-eboju igwe ojii gbara ọchịchịrị mmiri; igwe ojii na-agbasakwa amụma ya. 12Ha na-atụgharị gburugburu site na nduzi ya, ime ihe ọ bụla o nyere nʼiwu ha, nʼelu ụwa niile ebe mmadụ bi. 13Ma ọ bụ maka ịdọ aka na ntị, ma ọ bụ maka ala ya, ma ọ bụ maka ịhụnanya ọgbụgba ndụ, ọ na-eme ka o mezuo.
14“Gee ntị na nke a, Job; guzoro jụụ ma tụgharịa uche nʼọrụ ebube nke Chineke. 15Ị maara otú Chineke si enye ha iwu, na otú o si eme ka amụma nke igwe ojii ya mụọ? 16Ị maara otú igwe ojii si akwụba nʼelu kwụsie ike, bụ ọrụ ebube nke onye zuru oke nʼihe ọmụma? 17Gị onye uwe ya na-ekpo ọkụ mgbe ala dị jụụ nʼokpuru ifufe si na ndịda, 18ị nwere ike, gị na ya, gbasaa mbara eluigwe, nke siri ike dịka enyo e ji ọla a wụrụ awụ mee?
19“Kuziere anyị ihe anyị ga-ekwu nye ya; anyị apụghị ịhazi okwu anyị nʼihi ọchịchịrị. 20A ga-agwa ya na achọrọ m ikwu okwu? Ọ dị onye ga-arịọ ka e loo ya? 21Ugbu a, ọ dịghị onye pụrụ ilegide ìhè anya mgbe ọ na-enwu gbaa na mbara eluigwe, mgbe ifufe gafechara ma kpochapụ ha. 22Site nʼugwu ka ìhè na-egbuke egbuke dịka ọlaedo na-esi abịa; ebube dị egwu na-agba Chineke gburugburu. 23Onye pụrụ ime ihe niile—anyị apụghị iru ya nso; ọ dị ukwuu nʼike, ma nʼikpe ziri ezi na nnukwu ezi omume ọ naghị eme ajọ ihe. 24Nʼihi ya, ndị mmadụ na-atụ egwu ya; ọ naghị elebara ndị mara ihe nʼanya nke onwe ha anya.”