Ka Anyị Gaa nʼỤlọ Ya
Abụ nrịgo. Nke Devid.
Aṅụrị onye njem nsọ mgbe ọ rutere nʼụlọ Nna anyị, ụkwụ ya na-eguzo nʼezie nʼime ọnụ ụzọ ámá. Obodo ahụ bụ ebe ebo niile na-ezukọ, ebe a na-ekpe ikpe ziri ezi, ya mere ọ na-ekpe ekpere maka udo ya, sịkwa na ọ na-eme ya nʼihi ụmụnne ya, ọ bụghị nʼihi onwe ya.
122 1Aṅụrịrị m ọṅụ mụ na ndị sịrị m, “Ka anyị gaa nʼụlọ Nna anyị.” 2Ụkwụ anyị guzo nʼime ọnụ ụzọ ama gị, Jerusalem. 3Jerusalem, nke e wuru dịka obodo e jikọtara ọnụ nke ọma, 4ebe ebo niile na-arịgo, ebo nke Nna anyị, dịka iwu e nyere Izrel, inye aha Nna anyị ekele. 5Nʼihi na nʼebe ahụ ka e debere ocheeze maka ikpe, ocheeze nke ụlọ Devid.
6Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem: “Ka ndị hụrụ gị nʼanya nwee izuike. 7Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị, ka nchekwa dịrị nʼime ebe gị e wusiri ike.” 8Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m, aga m asị, “Ka udo dịrị nʼime gị.” 9Nʼihi ụlọ Nna anyị, aga m achọ ọdịmma gị.