Onye Nzuzu Na-emeghachi Nzuzu Ya
Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ndepụta ụdị mmadụ atọ. Onye nzuzu, onye a na-apụghị ịsọpụrụ, ma ọ bụ ịkpọ ọrụ, ma ọ bụ ịgwọ; onye umengwụ, na-atụgharị nʼelu akwa ya dị ka ọnụ ụzọ nʼelu nkọnye ya; na onye aghụghọ, onye na-emerụ ahụ ma sị na ọ bụ naanị egwuregwu. Onye ọ bụla gwuru olulu ga-adaba nʼime ya.
26 1Dịka snoo nʼoge okpomọkụ, na dịka mmiri ozuzo nʼoge owuwe ihe ubi, nsọpụrụ ekwesịghị onye nzuzu. 2Dịka nnụnụ nza na-efegharị efegharị, maọbụ eleke na-efe ọsọ ọsọ, ọbụbụ ọnụ nke na-ekwesịghị ekwesị adịghị adakwasị mmadụ. 3Ùtàrì maka ịnyịnya, ígwè ọnụ maka ịnyịnya ibu, na mkpara maka azụ ndị nzuzu. 4Azala onye nzuzu okwu dịka nzuzu ya si dị, ka gị onwe gị ghara ịdịkwa ka ya. 5Zaa onye nzuzu okwu dịka nzuzu ya si dị, ka ọ ghara ịbụ onye amamihe nʼanya nke ya. 6Onye ọbụla nke na-eziga ozi site nʼaka onye nzuzu na-egbupụ ụkwụ nke ya, na-aṅụkwa ihe ike. 7Dịka ụkwụ onye ngwụrọ nke kwụ efu na-abaghị uru, otu a ka ilu dị nʼọnụ ndị nzuzu. 8Dịka ikegide nkume nʼime àvụ̀, otu a ka inye onye nzuzu nsọpụrụ dị. 9Dịka ogwu dị nʼaka onye aṅụrụma, otu a ka ilu dị nʼọnụ ndị nzuzu. 10Dịka onye na-agba ụta nke na-emerụ mmadụ niile ahụ, otu a ka onye na-egota onye nzuzu, maọbụ onye na-egota onye ọbụla na-agafe agafe dị. 11Dịka nkịta si alaghachi nʼagbọ ya, otu a ka onye nzuzu si emeghachi nzuzu ya. 12Ị̀ hụrụ mmadụ onye maara ihe nʼanya nke ya? Olileanya dị maka onye nzuzu karịa nke ya.
13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼụzọ! Ọdụm nọ nʼokporo ámá!” 14Dịka ọnụ ụzọ si atụgharị nʼelu ihe njikọ ya, otu a ka onye umengwụ si atụgharị nʼelu akwa ya. 15Onye umengwụ na-amịnye aka ya nʼime efere nri; ọ na-agwụ ya ike iweghachi ya nʼọnụ ya. 16Onye umengwụ maara ihe nʼanya nke ya karịa mmadụ asaa ndị na-aza okwu nʼamamihe.
17Dịka onye jidere nkịta na ntị ya, otu a ka onye na-agafe agafe nke na-etinye ọnụ nʼese okwu na-abụghị nke ya dị.
18Dịka onye ara nke na-agbapụ icheku ọkụ, ụta, na ọnwụ, 19otu a ka onye na-aghọgbu onye agbataobi ya dị, onye na-asị, “Naanị egwuregwu ka m na-eme!”
20Nʼenweghị nkụ, ọkụ na-anyụ; nʼenweghị onye na-akụ asịrị, esemokwu na-akwụsị. 21Dịka unyi ọkụ dịịrị icheku ọkụ, na nkụ dịịrị ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si akwanye esemokwu. 22Okwu onye na-akụ asịrị dị ka iberibe nri dị ụtọ; ha na-arịda ruo nʼime ime afọ.
23Dịka ígwè na-egbuke egbuke nke e tere nʼelu ite aja, otu a ka egbugbere ọnụ dị nro nke nwere obi ọjọọ dị. 24Onye iro na-eji egbugbere ọnụ ya agbanwe onwe ya, ma nʼime obi ya ọ na-akpakọba aghụghọ. 25Mgbe o kwuru okwu nʼobiọma, ekwela ya, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼobi ya. 26Ọ bụ ezie na e ji aghụghọ zoo ịkpọasị ya, a ga-ekpughe ajọ omume ya nʼihu ọgbakọ. 27Onye ọbụla gwuru olulu ga-adaba nʼime ya, nkume ga-alaghachikwa nʼahụ onye na-enyagharị ya. 28Ire ụgha na-akpọ ndị ọ na-azọpịa asị, ọnụ na-aja mmadụ mma nʼaghụghọ na-ewetakwa mbibi.