A Gbaghara ma Mee ka Ọ Dị Mma
Ndị enyi anọ gwuru ụzọ nʼelu ụlọ, Jisọs gwakwara onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ na a gbagharala ya mmehie ya. Ndị odeakwụkwọ kpọrọ nke ahụ nkwulu. Ọ na-eso ndị ọnaụtụ rie nri, na-agbachitere ndị na-eso ụzọ ya ndị na-adịghị ebu ọnụ, ma kwuo na ụbọchị izuike nʼonwe ya bụ nke ya.
2 1Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, mgbe Jisọs lọghachiri na Kapaniọm, okwu gbasara na ọ nọ nʼụlọ. 2Ọtụtụ mmadụ gbakọtara nke na ohere ọbụla afọdụghị, ọbụladị nʼọnụ ụzọ, ọ nọkwa na-agwa ha okwu ahụ. 3Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ikom bịara, na-ebutere ya otu nwoke ahụ́ kpọnwụrụ akpọnwụ, nke mmadụ anọ na-ebu. 4Ebe ha enweghị ike iwetara ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ ahụ, ha wepụrụ elu ụlọ dị nʼelu ya, gwujee ya, ma wedata ute ahụ nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ dinara.
5Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ gwara nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ sị, “Nwa m, agbagharala gị mmehie gị.”
6Ugbu a, ụfọdụ nʼime ndị odeakwụkwọ nọ ọdụ nʼebe ahụ, na-eche echiche nʼobi ha, 7“Gịnị mere nwoke a ji ekwu okwu otu a? Ọ na-ekwulu Chineke! Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị naanị Chineke?”
8Ngwa ngwa, Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-eche echiche otu a nʼime onwe ha, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu? 9Olee nke dị mfe—ịgwa nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ, ‘Agbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ bụ, ‘Bilie, buru ute gị, jee ije’? 10Ma ka unu wee mara na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie”—ọ gwara nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ, a a v10 Ndị odeakwụkwọ ka kwuru na ọ bụ naanị Chineke pụrụ ịgbaghara mmehie — ma ugbu a Jisọs, bụ Nwa nke Mmadụ, na-agbaghara ha. Aha ahụ bụ “Nwa nke Mmadụ” na-aghachi azụ nʼọhụ Daniel hụrụ banyere onye e nyere ikike ebighị ebi, nʼebe a ọ na-ekpughe nwayọọ onye Jisọs bụ. 11“Asị m gị, bilie, buru ute gị, laa nʼụlọ gị.”
12O biliri, buru ute ya ozugbo, pụọ nʼihu ha niile, nke mere na o juru onye ọbụla anya, ha tokwara Nna anyị, na-asị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị ka nke a.”
Jisọs Kpọrọ Otu Onye Ọnaụtụ
13Jisọs pụkwara ọzọ nʼakụkụ oke osimiri; igwe mmadụ niile bịakwutere ya, o wee zie ha ihe.
14Ka ọ na-agafe, ọ hụrụ Livaị nwa Alfịọs ka ọ nọ ọdụ nʼebe a na-anakọta ụtụ, ọ sị ya, “Soro m.” O biliri soro ya.
15Mgbe Jisọs nọ na tebul nʼụlọ Livaị na-eri nri, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie nọnyeere Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-eri nri, nʼihi na ọtụtụ mmadụ na-eso ya. 16Mgbe ndị odeakwụkwọ nke ndị Farisii hụrụ ya ka ya na ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere ya na ndị ọnaụtụ na ndị mmehie ji na-eri nri?”
17Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ha, “Ọ bụghị ndị ahụ́ dị mma chọrọ onye dọkịta, kama ọ bụ ndị ọrịa. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama ndị mmehie.”
Mmanya Ọhụrụ, Ụzọ Ọhụrụ
18Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii nọ na-ebu ọnụ. Ha bịara jụọ ya, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị gị adịghị ebu ọnụ?”
19Jisọs sịrị ha, “Ndị a kpọrọ nʼoriri agbamakwụkwọ, ha pụrụ ibu ọnụ mgbe nwoke na-alụ nwunye nọnyeere ha? Ogologo oge ọbụla nwoke na-alụ nwunye ahụ nọnyere ha, ha apụghị ibu ọnụ. 20Ma ụbọchị ga-abịa mgbe a ga-anapụ ha nwoke na-alụ nwunye ahụ; mgbe ahụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebu ọnụ. 21Ọ dịghị onye na-adụnye ákwà ọhụrụ na-amịbeghị emị nʼuwe ochie; ma ọ bụghị otú a, mkpada ọhụrụ ahụ ga-adọka site nʼuwe ochie ahụ, ọwaa ahụ ga-akawanyekwa njọ. 22Ọ dịghị onye na-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie; mmanya ahụ ga-etiwa karama akpụkpọ ndị ahụ, ha abụọ ga-emebikwa. Mmanya ọhụrụ ka a na-etinye nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”
Nwa nke Mmadụ, Onyenwe Ụbọchị Izuike
23Nʼotu ụbọchị izuike, ọ na-agafe nʼetiti ubi ọka, ka ha na-aga, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ isi ọka. 24Ndị Farisii sịrị ya, “Lee, gịnị mere ha ji eme ihe iwu na-akwadoghị nʼụbọchị izuike?”
25Ọ sịrị ha, “Unu agụtụbeghị ihe Devid mere mgbe ọ nọ na mkpa, agụụ na-agụkwa ya, ya na ndị ya na ha nọ, 26otú o si banye nʼụlọ Nna anyị nʼoge Abịata onyeisi nchụaja, rie achịcha nke Ihu ahụ—nke naanị ndị nchụaja pụrụ iri—ma nye ndị ya na ha nọ ụfọdụ?”
27Ọ sịkwara ha, “E mere ụbọchị izuike maka mmadụ, ọ bụghị mmadụ maka ụbọchị izuike. 28Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ọbụladị ụbọchị izuike.”