Bilie, Onye M Hụrụ Nʼanya, Bịa Ka Anyị Pụọ
Nwaanyị ahụ na-ekwu okwu, na-echeta ndò ya, ụlọ oriri ahụ, aka ya nʼokpuru isi ya. Mgbe ahụ ọ kwughachiri ọkpụkpọ ya site na windo: oyi agwụla, mkpụrụ fig na-acha, bịa ka anyị pụọ. Ugboro abụọ ka ọ dọrọ ụmụ ada Jerusalem aka na ntị ka ha ghara ịkpọte ịhụnanya tupu o ruo.
2 1Abụ m okoko rozị nke Sharọn, lili nke ndagwurugwu. 2Dịka lili nʼetiti ogwu, otu a ka onye m hụrụ nʼanya dị nʼetiti ụmụ agbọghọ. 3Dịka osisi apụl nʼetiti osisi nke ọhịa, otu a ka onye m hụrụ nʼanya dị nʼetiti ụmụ okorobịa. Eji m oke ọṅụ nọdụ ala nʼokpuru ndo ya, mkpụrụ ya tọkwara m ụtọ nʼọnụ. 4O duuru m bata nʼụlọ oriri, ọkọlọtọ ya nke dị nʼelu m bụ ịhụnanya. 5Jiri mkpụrụ vaịn a mịkpọrọ amịkpọ nye m ike, jiri apụl mee ka ahụ dị m mma ọhụrụ, nʼihi na ọrịa ịhụnanya na-arịa m. 6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-amakụ m. 7Ana m adụ unu nʼọnụ, ụmụ ada Jerusalem, site na mgbada na nne ele nke ọhịa: unu akpalitela maọbụ akpọtela ịhụnanya ruo mgbe ọ ga-amasị ya.
8Olu onye m hụrụ nʼanya! Ọ na-abịa, na-awụli elu nʼelu ugwu ukwu, na-amali elu nʼelu ugwu nta. 9Onye m hụrụ nʼanya dị ka mgbada maọbụ nwa ele. Lee, ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị, na-elegharị anya site na windo, na-ele anya site nʼoghere osisi akpara akpa. 10Onye m hụrụ nʼanya na-asị m: Bilie, onye m hụrụ nʼanya, mara mma m, bịa ka anyị pụọ, 11nʼihi na oge oyi agafeela; mmiri ozuzo akwụsịla, lahụkwa. 12Okoko osisi apụtala nʼụwa, oge ịbụ abụ eruola, a na-anụkwa olu nduru nʼala anyị. 13Osisi fig na-eme ka mkpụrụ ya chaa, osisi vaịn na-awapụta okoko; ha na-enwepụta isi ụtọ ha. Bilie, onye m hụrụ nʼanya, mara mma m, bịa ka anyị pụọ. 14Nduru m, nke nọ nʼọgba nkume, nʼebe nzuzo nke ugwu nkume, kwere ka m hụ ihu gị, kwere ka m nụ olu gị, nʼihi na olu gị dị ụtọ, ihu gị makwara mma. 15Jidere anyị nkịta ọhịa, ụmụ nkịta ọhịa nta ndị na-emebi ubi vaịn, nʼihi na ubi vaịn anyị na-awapụta okoko. 16Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya; ọ na-ata nri nʼetiti lili. 17Ruo mgbe chi na-abọ ma ndo niile na-agbapụ, chigharịa, onye m hụrụ nʼanya, dịrị ka mgbada maọbụ nwa ele nʼelu ugwu ndị dị mgbaghasị.