Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Abụ nke Abụ 3 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

Ụbọchị Agbamakwụkwọ Eze ahụ

Nwaanyị ahụ na-achọ onye ọ hụrụ n'anya n'obodo gbara ọchịchịrị, na-ajụ ndị nche, mgbe ahụ ọ chọtara ya, ọ gaghịkwa ahapụ ya ruo mgbe ọ kpọbatara ya n'ụlọ nne ya. Olu ndị ọzọ na-ele ka ụgbọ Solomọn e chere nche na-abịa, eze ahụ e ji okpueze chie n'ụbọchị agbamakwụkwọ ya.

Isi 3.

Nʼelu ihe ndina m nʼabalị niile, achọrọ m onye mkpụrụobi m hụrụ nʼanya; achọrọ m ya, ma achọtaghị m ya. Ugbu a, aga m ebili gagharịa nʼime obodo, nʼokporo ụzọ na nʼama niile; aga m achọ onye mkpụrụobi m hụrụ nʼanya. Achọrọ m ya, ma achọtaghị m ya. Ndị nche ahụ hụrụ m ka ha na-agagharị nʼime obodo. “Ị hụla onye mkpụrụobi m hụrụ nʼanya?” Mgbe m gafere ha ntakịrị, achọtara m onye mkpụrụobi m hụrụ nʼanya. Ejidere m ya, ekweghị m ka ọ laa ruo mgbe m kpọbatara ya nʼụlọ nne m, nʼime ọnụụlọ onye tụụrụ ime mụrụ m. Ana m adụ unu ọdụ, ụmụ ada Jerusalem, nʼaha mgbada na nne ele nke ọhịa: unu akpalịla maọbụ akpọtela ịhụnanya ruo mgbe ọ ga-amasị ya.

Onye bụ onye a na-esi nʼọzara na-arịgopụta dịka ogidi anwụrụ ọkụ, nke na-esi ísì ụtọ nke mmanụ máá na frankinsense, ya na ụdị ntụ na-esi ísì ụtọ niile nke onye ahịa? Lee—ọ bụ ụgbọ ozuzu nke Solomọn nʼonwe ya, nke ndị dike iri isii gbara gburugburu, ndị si nʼetiti ndị dike nke Izrel, ha niile jidere mma agha, ndị a zụrụ azụ maka ọgụ, onye ọbụla nwere mma agha ya nʼakụkụ ya, maka egwu nke abalị. Eze Solomọn wuuru onwe ya ụgbọ ozuzu site nʼosisi Lebanọn. O ji ọlaọcha mee ogidi ya, jiri ọlaedo mee azụ ya, jiri ákwà na-acha odo odo mee oche ya; ụmụ ada Jerusalem ji ịhụnanya chọọ ime ya mma. Pụtanụ, ụmụ ada Zayọn, legidenụ Eze Solomọn anya, onye kpu okpueze nke nne ya kpube ya nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya, nʼụbọchị obi ya ṅụrịrị ọṅụ.