Omenala Megide Okwu Nna Anyị
Jisọs gwara ndị Farisii na omenala ha emeela ka iwu Nna n'onwe ya ghara ịba uru, na ihe na-emerụ mmadụ na-esi n'obi apụta, ọ bụghị ihe na-aba n'ọnụ. Otu nwanyị onye Kenan jụrụ ka a chụpụ ya, zaghachi ya okwu, a gwọkwara ada ya nke a na-asọgbu.
15 1Mgbe ahụ, ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ si Jerusalem bịakwute Jisọs sị, 2“Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị ji emebi omenala ndị okenye? Ha anaghị akwọ aka ha mgbe ha na-eri nri.”
3Ọ zara sị, “Gịnị mekwaranụ unu ji emebi iwu Nna anyị nʼihi omenala unu? 4Nʼihi na Nna anyị sịrị, ‘Sọpụrụ nna gị na nne gị,’ na, ‘Onye ọbụla na-akọcha nna ya maọbụ nne ya aghaghị ịnwụ nʼezie.’ 5Ma unu na-asị, ‘Onye ọbụla gwara nna ya maọbụ nne ya, “Ihe ọbụla i ritere site nʼaka m bụ onyinye e doro nsọ nye Nna anyị,” 6ọ dịghị mkpa ka o jiri ya sọpụrụ nna ya.’ Unu akagbuola okwu Nna anyị nʼihi omenala unu. 7Unu ndị ihu abụọ! Aịzaya buru amụma kwesịrị ekwesị banyere unu mgbe o kwuru, sị: 8‘Ndị a na-eji egbugbere ọnụ ha asọpụrụ m, ma obi ha dị anya site nʼebe m nọ; 9ha na-efe m ofufe nʼefu, na-akụzi iwu ụmụ mmadụ dịka ozizi.’”
10Mgbe ahụ, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ bịakwute ya sị, “Geenụ ntị ma ghọta: 11Ọ bụghị ihe na-abanye nʼọnụ na-eme ka mmadụ rụọ arụ, kama ihe si nʼọnụ apụta na-eme ka mmadụ rụọ arụ.”
12Mgbe ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwute ya sị, “Ị maara na iwe were ndị Farisii mgbe ha nụrụ okwu a?”
13Ọ zara sị, “Osisi ọbụla Nna m nke bi nʼeluigwe na-akụghị ka a ga-ehopu ya. 14Hapụnụ ha; ha bụ ndị kpuru ìsì na-edu ụzọ. Ọ bụrụ na onye ìsì na-edu onye ìsì, ha abụọ ga-adaba nʼime olulu.”
15Pita gwara ya sị, “Kọwaara anyị ilu a.”
16Jisọs sịrị, “Unu ka na-enweghị nghọta dịka ndị ọzọ? 17Ọ bụ na unu aghọtaghị na ihe ọbụla na-abanye nʼọnụ na-agafe nʼafọ ma mesịa site nʼahụ pụọ? 18Ma ihe si nʼọnụ apụta na-esite nʼobi, ọ bụkwa ya na-eme ka mmadụ rụọ arụ. 19Nʼihi na obi na-amịpụta echiche ọjọọ: igbu ọchụ, ịkwa iko, ịgba akwụna, izu ohi, ịgba ama ụgha, nkwutọ. 20Ihe ndị a na-eme ka mmadụ rụọ arụ, ma iji aka a na-akwọghị akwọ eri nri anaghị eme ka onye ọbụla rụọ arụ.”
Okwukwe Nwanyị Nke Na-adịgide
21Mgbe ọ hapụrụ ebe ahụ, Jisọs wezụgara onwe ya gaa nʼobodo Taịa na Saịdọn. 22Otu nwanyị onye Kenan si nʼakụkụ ahụ bịara, na-eti mkpu sị, “Meere m ebere, Onyenwe anyị, Nwa Devid! Mmụọ ọjọọ na-ata nwa m nwanyị ahụhụ nke ukwuu.”
23Ọ zaghị ya okwu ọbụla. Ndị na-eso ụzọ ya bịara rịọsie ya ike sị, “Zilaga nwanyị a—ọ nọ na-etiso anyị mkpu nʼazụ.”
24Ọ zara sị, “E zitere m naanị nye atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.”
25Ma nwanyị ahụ bịara gbuo ikpere nʼala nʼihu ya sị, “Onyenwe anyị, nyere m aka!”
26Ọ zara sị, “O zighi ezi iwere achịcha ụmụntakịrị tụpụ ya nye nkịta.”
27Ọ sịrị, “Ee, Onyenwe anyị, ma ọbụladị nkịta na-eri iberibe nri ndị si na tebụl ndị nwe ha daa.”
28Jisọs zara sị, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu. Ka ọ dịrị gị dịka ọchịchọ gị si dị.” Nwa ya nwanyị ahụ gwọkwara site nʼoge ahụ.
Nna Anyị Nyere Puku Mmadụ Anọ Nri
29Mgbe ọ hapụrụ ebe ahụ, Jisọs gara nʼakụkụ Osimiri Galili, rigoro nʼelu ugwu, nọdụ ala nʼebe ahụ. 30Oke igwe mmadụ bịakwutere ya, chịrị ndị ngwụrọ, ndị ìsì, ndị dara ngwụrọ, ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ, tọgbọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha. 31Ya mere, igwe mmadụ ahụ tụrụ nʼanya, mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu, ndị dara ngwụrọ ka a gwọrọ, ndị ngwụrọ ka ha na-eje ije, na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ; ha nyere Nna Izrel otuto.
32Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya bịakwute ya sị, “Obi m na-emere igwe mmadụ a ebere—ha anọnyeworị m ụbọchị atọ ma enweghị ihe ha ga-eri. Achọghị m izilaga ha nʼagụụ; ma eleghị anya ha ga-ada nʼụzọ.”
33Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ sị, “Olee ebe anyị ga-enweta achịcha zuru ezu nʼọzara a iji nye igwe mmadụ dị otú a nri?”
34Jisọs jụrụ sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị, “Asaa, na obere azụ ole na ole.”
35Ya mere, ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼala. 36O weere ogbe achịcha asaa ahụ na azụ ndị ahụ, kelee ekele, nyawaa ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ha enyekwa igwe mmadụ ahụ. 37Ha niile riri rijuo afọ, ha tụtụkọtara iberibe nri fọdụrụ nke juru nkata asaa. 38Ndị riri nri bụ puku ndị ikom anọ, ewezuga ụmụ nwanyị na ụmụntakịrị. 39Mgbe o zilagachara igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼobodo Magadan.