Ọnwụ Jọn Omee Baptizim
Herọd, nke iyi ọ ṅụrụ n'oriri tọrọ n'ọnya, mere ka e bepụ Jọn isi. Jisọs gara n'ebe dịpụrụ adịpụ iru újú, ma ìgwè mmadụ sooro ya, o wee were ogbe achịcha ise nye ha nri. Emesịa Pita jere ije n'elu mmiri gakwuru ya, hụ ifufe ahụ, malite imikpu.
14 1Nʼoge ahụ, Herọd onye na-achị akụkụ ala ahụ nụrụ akụkọ banyere Jisọs. 2Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Onye a bụ Jọn Omee Baptizim, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie—ọ bụ ya mere ike ndị a ji na-arụ ọrụ nʼime ya.” 3Nʼihi na Herọd ejidela Jọn, kee ya agbụ, tụbakwa ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Herọdịas, nwunye nwanne ya Filip, 4nʼihi na Jọn nọ na-agwa ya sị, “Iwu ekweghị ka ị nwee ya.” 5Herọd chọrọ igbu ya ma ọ tụrụ egwu igwe mmadụ ahụ, nʼihi na ha weere Jọn dịka onye amụma. 6Ma mgbe ụbọchị ọmụmụ Herọd ruru, ada Herọdịas gbara egwú nʼihu ha, masịkwa Herọd, 7nke mere na o ji iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ. 8Ebe nne ya tụnyere ya nʼobi, ọ sịrị, “Nye m isi Jọn Omee Baptizim nʼebe a, nʼelu efere.”
9O wutere eze ahụ, ma nʼihi iyi ndị ọ ṅụrụ na ndị ọ kpọrọ oriri, o nyere iwu, 10o zipụkwara mmadụ ka e gbupụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ. 11E wetara isi ya nʼelu efere, nye ya nwa agbọghọ ahụ, onye weere ya nye nne ya. 12Mgbe ahụ, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara, buru ozu ya, lie ya; ha gakwara kọọrọ Jisọs.
Jisọs Nyere Puku Mmadụ Ise Nri
13Mgbe Jisọs nụrụ nke a, o sitere nʼụgbọ mmiri pụọ naanị ya gaa nʼebe dịpụrụ adịpụ. Ma igwe mmadụ ahụ nụrụ ya, jiri ụkwụ si nʼobodo dị iche iche soro ya. 14Mgbe ọ rutere nʼala, ọ hụrụ oke igwe mmadụ, o nwere obi ebere nʼebe ha nọ, gwọkwaa ndị ọrịa ha. 15Mgbe anyasị ruru, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ebe a bụ ebe dịpụrụ adịpụ, oge agafeekwala. Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼobodo nta zụtara onwe ha nri.”
16Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa ka ha pụọ. Unu nyenụ ha ihe ha ga-eri.”
17Ha sịrị ya, “Ihe anyị nwere nʼebe a bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ.”
18Ọ sịrị, “Wetaranụ m ha nʼebe a.”
19O gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼelu ahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ, welie anya ya elu nʼeluigwe, kelee ekele, nyawaa achịcha ndị ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị nyekwara igwe mmadụ ahụ. 20Ha niile riri rijuo afọ, ha tụtụkọtakwara iberibe achịcha fọdụrụ, nke juru nkata iri na abụọ. 21Ndị riri nri ahụ dị ihe dị ka puku mmadụ ise nʼọnụọgụgụ nwoke, ewezuga ụmụ nwanyị na ụmụaka.
Jisọs Jere Ije nʼElu Mmiri
22Ngwa ngwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri bute ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ, ebe ya onwe ya ga-ezilaga igwe mmadụ ahụ. 23Mgbe o zisịrị igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu naanị ya ikpe ekpere. Mgbe anyasị ruru, ọ nọ nʼebe ahụ naanị ya. 24Ụgbọ mmiri ahụ anọọlarị ebe dị anya site nʼala, ebili mmiri na-etiwa ya, nʼihi na ifufe na-emegide ha. 25Nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, ọ bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri. a a v25 Oge nche nke anọ nke abalị bụ ihe dị ka elekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ — oge kachasị gbaa ọchịchịrị ma jụọ oyi tupu chi ọbụbọ. 26Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri, ụjọ tụrụ ha nke ukwuu, ha na-asị, “Mmụọ!” ha tikwara mkpu nʼihi egwu.
27Ma Jisọs gwara ha okwu ozugbo sị, “Nweenụ obi ike! Ọ bụ m; unu atụla egwu.”
28Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, nye m iwu ka m bịakwute gị nʼelu mmiri.”
29Ọ sịrị, “Bịa.” Pita siri nʼụgbọ mmiri ahụ pụta, jee ije nʼelu mmiri, na-agakwuru Jisọs.
30Ma mgbe ọ hụrụ ike ifufe ahụ, ọ tụrụ egwu, mmiri malitekwara iride ya, ọ tiri mkpu sị, “Onyenwe anyị, zọpụta m!”
31Ozugbo, Jisọs setịpụrụ aka ya, jide ya, sị, “Gị onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwee obi abụọ?”
32Mgbe ha banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ifufe ahụ dajụrụ. 33Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ mmiri ahụ kpọrọ isiala nye ya, na-asị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Nna anyị.”
34Mgbe ha gafesịrị, ha rutere nʼala Genesaret. 35Mgbe ndị ikom obodo ahụ matara ya, ha zipụrụ ozi nʼakụkụ ala ahụ niile, kpọtakwara ya ndị niile nọ nʼọrịa. 36Ha rịọrọ ya ka o kwere ka ha metụ naanị ọnụ uwe mwụda ya aka, ndị niile metụrụ ya akakwa gwọrọ.