Nna Na-edu Sọl Gakwuru Samuel
Sọl gara ịchọ ịnyịnya ibu nna ya ndị furu efu ma ọ hụghị ha, otu ohu ya atụọ aro ka ha jụọ onye ọhụ ụzọ nọ n'ebe ahụ. Samuel, onye Nna anyị dọrọ aka na ntị otu ụbọchị tupu mgbe ahụ, nọ na-eche ya, were otu òkè anụ e debere iche, ma kpaa ya ike na ihe niile Izrel ji kpọrọ ihe dabeziri ugbu a n'isi Sọl.
9 1E nwere otu nwoke si nʼebo Benjamin aha ya bụ Kish, nwa Abiel, nwa Zeror, nwa Bekorat, nwa Afaya, onye Benjamin, nwoke bara ọgaranya ma bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. 2O nwere nwa nwoke aha ya bụ Sọl, nwa okorobịa mara mma—o nweghị onye Izrel mara mma karịa ya; site nʼubu ya gbagoo, o toro ogologo karịa onye ọbụla.
3Ịnyịnya ibu nke Kish, bụ nna Sọl, furu efu, ya mere Kish gwara nwa ya Sọl sị, “Kpọrọ otu nʼime ndị odibo gị soro gị gaa chọọ ịnyịnya ibu ndị ahụ.” 4O si nʼala ugwu ugwu nke Ifrem na ala Shalisha gafee, ma ha achọtaghị ha. Ha gafere nʼala Shaalim, ma ịnyịnya ibu ndị ahụ anọghị nʼebe ahụ. Ọ gafere nʼala Benjamin, ma ha achọtabeghịkwa ha.
5Mgbe ha rutere nʼala Zuf, Sọl gwara odibo ya so ya sị, “Bịa, ka anyị laghachi azụ, ma ọ bụghị ya, nna m ga-akwụsị ichegbu onwe ya banyere ịnyịnya ibu wee malite ịchegbu onwe ya banyere anyị.”
6Ma odibo ahụ sịrị, “Lee, nʼobodo a e nwere otu onye nke Nna anyị, onye a na-asọpụrụ; ihe niile ọ na-ekwu na-emezukwa nʼezie. Ka anyị gaa ebe ahụ ugbu a; ma eleghị anya, ọ ga-agwa anyị ụzọ anyị ga-eso.”
7Sọl gwara odibo ya sị, “Ma ọ bụrụ na anyị aga, gịnị ka anyị ga-ewetara nwoke ahụ? Achịcha dị nʼakpa anyị agwụla, o nwekwaghị onyinye anyị ga-enye onye nke Nna anyị. Gịnị ka anyị nwere?”
8Odibo ahụ zaghachiri Sọl ọzọ sị, “Lee, enwere m otu obere mkpụrụ ego ọlaọcha. Aga m enye ya onye nke Nna anyị ka ọ gwa anyị ụzọ anyị.” 9(Na mgbe ochie nʼIzrel, onye ọbụla na-aga ịjụta ase nʼaka Nna anyị na-asị, “Ka anyị gakwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye amụma nke ụbọchị taa ka a na-akpọbu onye ọhụ ụzọ.).
10Sọl zara sị, “Ọ dị mma. Ka anyị gaa.” Ya mere ha gara nʼobodo ebe onye nke Nna anyị nọ. 11Ka ha na-arịgo ugwu gaa nʼobodo ahụ, ha zutere ụmụ agbọghọ na-apụta iseta mmiri wee jụọ ha sị, “Onye ọhụ ụzọ ahụ ọ nọ nʼebe a?”
12Ha sịrị, “Ọ nọ. Ọ nọ naanị nʼihu unu. Mee ngwa ngwa, ọ bịara nʼobodo taa nʼihi na ndị mmadụ nwere àjà ha ga-achụ nʼebe dị elu ahụ. 13Ngwa ngwa unu banyere nʼobodo ahụ, unu ga-achọta ya tupu ọ rịgoo nʼebe dị elu ahụ iri nri. Ndị mmadụ agaghị eri nri ruo mgbe ọ ga-abịa, nʼihi na ọ ga-agọzi àjà ahụ; naanị mgbe ahụ ka ndị ọbịa ga-eri nri. Rịgoonụ ugbu a—unu ga-achọta ya ozugbo.”
14Ha rịgoro nʼobodo ahụ. Ka ha na-abanye, Samuel na-abịakwute ha, na-arịgo nʼebe dị elu ahụ.
15Ugbu a, nʼụbọchị bọ tupu Sọl abịa, Nna anyị ekpugheela nke a nye Samuel:
16“Nʼihe dịka oge a echi, aga m ezitere gị otu nwoke si nʼala Benjamin. Tee ya mmanụ ka ọ bụrụ onyendu ndị m bụ Izrel; ọ ga-azọpụta ndị m site nʼaka ndị Filistia, nʼihi na ahụla m ndị m, mkpu akwa ha eruteela m.”
17Mgbe Samuel hụrụ Sọl, Nna anyị gwara ya sị, “Lee nwoke ahụ m kwuru okwu ya; onye a ga-achị ndị m.”
18Sọl bịakwutere Samuel nʼọnụ ụzọ ama ahụ wee sị, “Biko gwa m ebe ụlọ onye ọhụ ụzọ ahụ dị.”
19Samuel zara sị, “Ọ bụ m bụ onye ọhụ ụzọ ahụ. Buru m ụzọ rịgoo nʼebe dị elu ahụ. Taa, gị na m ga-eso rie nri; nʼụtụtụ, aga m ezipụ gị ma gwa gị ihe niile dị gị nʼobi. 20Ịnyịnya ibu ndị furu efu ụbọchị atọ gara aga ka achọtala, ya mere echegbula onwe gị banyere ha. Onye nwekwa ihe niile ndị Izrel ji kpọrọ ihe, ọ bụghị gị na ụlọ nna gị niile?”
21Sọl zara sị, “Ọ bụ na m abụghị onye Benjamin, onye si nʼebo dịkarịsịrị nta nʼIzrel, ikwu m ọ bụghịkwa nke dịkarịsịrị ala nʼikwu niile nke Benjamin? Gịnị mere i ji agwa m ihe dị otu a?”
22Mgbe ahụ, Samuel kpọbatara Sọl na odibo ya nʼime ọnụ ụlọ ahụ, mee ka ha nọdụ nʼisi ebe ndị ọbịa a kpọrọ òkù nọ—ihe dịka iri atọ nʼọnụọgụgụ. 23Samuel gwara onye na-esi nri sị, “Wetara m òkè nri ahụ m nyere gị, nke m sịrị gị debe iche.” 24Onye na-esi nri ahụ weliri apata na ihe dị nʼelu ya dobe ya nʼihu Sọl. Samuel sịrị, “Lee ihe e debere gị. Rie ya, nʼihi na e debeere gị ya maka mgbe a, kemgbe m kpọrọ ndị ọbịa ndị a òkù.” Ya mere Sọl na Samuel riri nri nʼụbọchị ahụ.
25Ha si nʼebe dị elu ahụ rịdata banye nʼobodo ahụ, Samuel na Sọl kparịtakwara ụka nʼelu ụlọ. 26Ha biliri nʼisi ụtụtụ, mgbe chi bọrọ, Samuel kpọrọ Sọl nʼelu ụlọ sị, “Bilie, ka m zipu gị.” Sọl biliri, ha abụọ, ya na Samuel, pụkọrọ ọnụ gaa nʼezi. 27Ka ha na-arịda gawa nʼọnụ ọnụ obodo ahụ, Samuel gwara Sọl sị, “Zipu odibo ahụ ka o buru ụzọ gaa”—o wee gaa—“ma gị onwe gị guzoro nwa oge, ka m gwa gị okwu Nna anyị.”