Nna Anaghị Eme Ihe Ọjọọ
Elaịhu kwughachiri Job okwu nke ya ma gbachitere ikpe ziri ezi nke Nna: onye na-achị ihe niile apụghị ịgbagọ ihe ziri ezi, ọ dịghị ele ndị eze anya n'ihu, ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ọ bụla a zọrọ n'ọchịchịrị. Nkwubi okwu ya siri ike: na Job kwesịrị ka a nwalee ya ruo ná nsọtụ.
34 1Mgbe ahụ, Elaihu gara nʼihu kwuo sị: 2“Nụrụnụ okwu m, unu ndị amamihe; gee m ntị, unu ndị maara ihe. 3Nʼihi na ntị na-anwale okwu dịka ọnụ si edetụ nri ire. 4Ka anyị họrọ ihe ziri ezi; ka anyị mata nʼetiti onwe anyị ihe dị mma. 5Nʼihi na Job ekwuola sị, ‘Abụ m onye ezi omume, Chineke anapụkwala m ikpe ziri ezi m; 6ọ bụ ezie na ikpe ziri m, a gụrụ m dịka onye ụgha; ọnya m enweghị ọgwụgwọ, ọ bụ ezie na enweghị m nnupụisi.’ 7Olee nwoke dị ka Job, onye na-aṅụ nkwulu dịka mmiri, 8onye na ndị na-eme ajọ ihe na-emekọrịta ihe, onye na ndị ajọ mmadụ na-ejekọkwa ije? 9Nʼihi na o kwuola sị, ‘Ọ dịghị uru mmadụ na-erite site nʼinwe mmasị na Chineke.’ 10Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị nwere nghọta: ya bụrụ ihe dị anya site na Chineke ime ihe ọjọọ, na site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile ime ihe na-ezighị ezi. 11Nʼihi na dịka ọrụ mmadụ si dị, ọ na-akwụghachi ya, dịka ụzọ ya niile si dị, ọ na-eweta ya nʼisi ya. 12Nʼezie, Chineke agaghị eme ihe ọjọọ, Onye pụrụ ime ihe niile agaghịkwa agbagọ ikpe ziri ezi. 13Onye nyere ya ikike nʼelu ụwa, onyekwa tụkwasịrị ya ụwa niile nʼaka? 14Ọ bụrụ na ọ tụkwasị obi ya nʼahụ mmadụ, wepụkwa mmụọ ya na ume ya, 15anụ ahụ niile ga-alakọ nʼiyi ọnụ, mmadụ ga-alaghachikwa nʼaja. 16Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a; gee ntị nʼụda okwu m. 17Onye na-akpọ ikpe ziri ezi asị ọ ga-achị achị? Ị ga-ama onye ezi omume na dị ike ikpe, 18onye na-agwa eze sị, ‘Onye na-abaghị uru,’ na-agwakwa ndị a ma ama sị, ‘Ndị ajọ mmadụ,’ 19onye na-adịghị ele ụmụ eze mmadụ anya, onye na-adịghịkwa eme ka ndị ọgaranya karịa ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya? 20Nʼotu ntabi anya ha na-anwụ; nʼetiti abalị, ndị mmadụ na-ama jijiji ma na-agabiga, a na-ewezugakwa ndị dị ike, ọ bụghị site nʼaka mmadụ. 21Nʼihi na anya ya dị nʼụzọ niile nke mmadụ, ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ya niile. 22Ọ dịghị ọchịchịrị maọbụ oke onyinyo ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo onwe ha. 23Nʼihi na ọ dịghị mkpa na Chineke ga-atụlekwu mmadụ ọzọ, ka o wee pụta nʼihu Chineke maka ikpe. a a v23 Isi okwu Elaihu: Chineke achọghị ikpe nkwadoro maọbụ oge a kara aka iji weta ikpe — naanị ọ na-eme ihe. 24Ọ na-etipịa ndị dị ike nʼenweghị nyocha, ọ na-edobekwa ndị ọzọ nʼọnọdụ ha. 25Ya mere, ebe ọ maara ọrụ ha niile, ọ na-akwatu ha nʼabalị, a na-egweripịakwa ha. 26Ọ na-eti ha ihe nʼihi ajọ omume ha nʼihu ndị na-ele anya, 27nʼihi na ha wezugara onwe ha site nʼiso ya, ha elegidekwaghị ụzọ ya ọ bụla anya, 28nke mere ka ha mee ka ndị ogbenye tikuo ya mkpu, o wee nụ mkpu akwa ndị a na-akpagbu. 29Mgbe ọ gbachiri nkịtị, onye pụrụ ima ikpe? Mgbe o zoro ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya—ma ọ bụ mba maọbụ otu mmadụ, 30ka onye na-asọpụrụghị Chineke ghara ịchị achị maọbụ ịma ndị mmadụ ọnya. 31Nʼihi na ọ dị onye gwarala Chineke sị, ‘Ebuolam ntaramahụhụ m; agaghị m emehiekwa ọzọ; 32kuziere m ihe m na-adịghị ahụ; ọ bụrụ na m meela ihe ọjọọ, agaghị m emekwa ya ọzọ’? 33Ọ ga-akwụghachi gị dịka ọchịchọ gị si dị nʼihi na ị jụrụ ịdọ aka na ntị ya? Nʼihi na gị onwe gị ga-ahọrọ, ọ bụghị m; ya mere, kwupụta ihe ị maara. 34Ndị nwere nghọta ga-agwa m, onye amamihe ọ bụla nụrụ okwu m ga-ekwukwa sị, 35‘Job na-ekwu okwu nʼenweghị ihe ọmụma; okwu ya niile enweghị nghọta.’ 36A sịkwarị na a nwalee Job ruo nʼoke nʼihi ịza okwu dịka ndị ajọ mmadụ! 37Nʼihi na ọ na-atụkwasị nnupụisi nʼelu mmehie ya; ọ na-akwa anyị emo nʼihu ọha, na-emekwa ka okwu ya megide Chineke baa ụba.”