Elaịhu Kwukwara Okwu Ọzọ
Elaịhu rụrụ ụka na mmehie mmadụ na ịdị mma mmadụ adịghị agbanwe ihe ọ bụla nye Chineke, onye dị elu karịa ígwé ojii; ha na-adakwasị ndị ọzọ. Ndị a na-emegbu na-eti mkpu, ma ọ dịghị onye na-ajụ ebe Onye Kere ha nọ, onye na-enye abụ n'abalị. Ya mere Job na-amụba okwu n'enweghị ihe ọmụma.
35 1Mgbe ahụ Elaịhu gara nʼihu kwuo, sị: 2“Ị chere na nke a ziri ezi? Ị na-asị, ‘Ezi omume m karịrị nke Chineke.’ 3Nʼihi na ị na-ajụ, ‘Uru gịnị ka ọ bara gị? Gịnị ka m na-erite site nʼomeghị mmehie?’ 4Aga m aza gị, gị na ndị enyi gị so gị. 5Lelie anya gị nʼeluigwe ma hụ; legide igwe ojii anya, nke dị elu karịa gị. 6Ọ bụrụ na i mehie, gịnị ka ị na-arụ megide ya? Ọ bụrụ na nnupụisi gị dị ọtụtụ, gịnị ka ị na-eme ya? 7Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya? Maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị? 8Ajọ omume gị na-emetụ naanị mmadụ dịka gị, ezi omume gị na-emetụkwa naanị mmadụ ibe gị. 9Ndị mmadụ na-eti mkpu nʼokpuru ịrọ nke ọtụtụ mmegbu; ha na-akpọ maka enyemaka megide aka ndị dị ike. 10Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke, Onye kere m, nọ, onye na-enye abụ nʼabalị, 11onye na-akụziri anyị ihe karịa anụ ọhịa nke ụwa ma na-eme ka anyị maa ihe karịa nnụnụ nke eluigwe?’ 12Nʼebe ahụ ka ha na-eti mkpu, ma ọ naghị aza ha, nʼihi nganga nke ndị ajọ mmadụ. 13Nʼezie Chineke anaghị ege ntị nʼakwa efu; Onye pụrụ ime ihe niile adịghị elebara ya anya. 14Ọ ga-esikwa aṅaa zaa gị, mgbe ị na-asị na ị naghị ahụ ya—ọ bụ ezie na okwu gị dị nʼihu ya, ị ghaghịkwa ichere ya. 15Ma ugbu a, nʼihi na iwe ya atabeghị mmadụ ahụhụ, ọ legharaghịkwa nzuzu anya nke ukwuu. 16Job na-asaghe ọnụ ya nʼokwu efu; ọ na-eme ka okwu na-abawanye nʼenweghị ihe ọmụma.”