Elaihu Gwara Job Okwu
Elaịhu gwara Job na ya onwe ya bụkwa ụrọ, ọ dịghị ihe ọ ga-atụ egwu ya. Azịza ya bụ na Chineke na-ekwu okwu, site ná nrọ na site n'ihe mgbu n'elu akwa ọrịa, iji chigharịa mmadụ n'olulu, na onye ogbugbo nwere ike ịsị: hapụ ya, achọtala m ihe mgbapụta.
33 1“Ma ugbu a, Job, nụrụ okwu m; gee ntị nʼihe niile m na-ekwu. 2Lee, emeghepụla m ọnụ m; ire m na-ekepụta okwu nʼoghoghoanọ ọnụ m. 3Okwu m si nʼobi ziri ezi na-apụta, egbugbere ọnụ m na-ekwupụta nke ọma ihe ha maara. 4Mmụọ nke Chineke kere m, ume Onye pụrụ ime ihe niile na-enyekwa m ndụ. 5Zaa m, ọ bụrụ na ị pụrụ; doziere okwu gị nʼusoro nʼihu m, ma guzosie ike. 6Lee, adị m ka gị nʼihu Chineke; a wepụtara m, mụ onwe m, site nʼụrọ. 7Egwu m ekwesịghị ime ka ị tụọ ụjọ, nrụgide m ekwesịghịkwa ịdọ gị nʼaka.
8“Nʼezie ị kwuola ka m na-anụ— anụrụ m ụda okwu gị. 9‘Adị m ọcha, enweghị nnupụisi; adị m ọcha, ọ dịghịkwa ikpe ọmụma dị nʼime m. 10Ma ọ na-achọta ihe ịta ụta nʼebe m nọ; ọ na-agụ m dịka onye iro ya. 11O kechiri ụkwụ m abụọ nʼigwe mkpọrọ; ọ na-elezikwa ụzọ m niile anya.’
12“Ma nʼihe a i meghị nke ọma, ana m aza gị, nʼihi na Chineke dị ukwuu karịa mmadụ ọbụla. 13Gịnị mere i ji na-arụso ya ụka, na ọ naghị aza okwu ọbụla nke mmadụ? 14Nʼihi na Chineke na-ekwu okwu nʼotu ụzọ, ma kwuokwa nʼụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na ọ dịghị onye na-aghọta ya. 15Na nrọ, nʼọhụ nke abalị, mgbe oke ụra na-adakwasị ndị mmadụ ka ha na-ehi ụra nʼelu akwa ha, 16mgbe ahụ ọ na-emeghe ntị ha ma mee ka ịdọ aka na ntị ya rụọ ha ọrụ nʼobi, 17ka o si otu a chigharịa mmadụ site nʼajọ omume, ma chebe nwoke ka ọ ghara inwe nganga, 18ọ na-egbochi mkpụrụobi ha ịba nʼolulu, na-egbochikwa ndụ ha ịla nʼiyi site na mma agha.
19“A na-abakwa mmadụ mba site nʼihe mgbu nʼelu akwa ya, ọkpụkpụ ya niile na-amị ya ọnụ mgbe niile, 20nke mere na ndụ ya na-asọ achịcha oyi, mkpụrụobi ya na-asọkwa nri kachasị mma oyi. 21Anụ ahụ ya na-ala nʼiyi, ọkpụkpụ ya ndị zoro ezo na-amịpụtakwa. 22Mkpụrụobi ya na-abịaru olulu ahụ nso, ndụ ya na-abịarukwa ndị na-eweta ọnwụ nso.
23“Ọ bụrụ na e nwere onyeozi nʼihi ya, onye ogbugbo—otu onye nʼime puku— iji gwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya, 24ọ na-emekwara ya amara ma sị, ‘Zọpụta ya ka ọ ghara ịgbada nʼolulu; achọtala m ihe mgbapụta,’ a a v24 Ihe mgbapụta ahụ na-anapụta mkpụrụobi nʼolulu na-arụtụ aka gafee okwu Elaihu ruo nʼihe mgbapụta ahụ Nna anyị ga-enye nʼotu ụbọchị site na Jisọs, onye nyere ndụ ya dịka ihe mgbapụta nʼihi ọtụtụ mmadụ. 25mgbe ahụ anụ ahụ ya na-adị ọhụrụ karịa nke nwata; ọ na-alaghachikwa nʼụbọchị okorobịa ya. 26Ọ na-ekpegara Chineke ekpere, onye ofufe ahụ na-anabatakwa ya; onye ofufe ahụ na-ejikwa iti mkpu ọṅụ hụ ihu Chineke, Chineke na-eweghachikwara onye ahụ ezi omume ya. 27Ọ na-abụpụta abụ nʼihu ndị ọzọ ma sị, ‘Emehiere m ma gbagọọ ihe ziri ezi, ma a kwụghachighị m ụgwọ ya. 28Ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka ọ ghara ịgbada nʼolulu, aga m ahụkwa ìhè.’
29“Lee, Chineke na-eme ihe ndị a niile ugboro abụọ, ọbụna ugboro atọ, nʼebe mmadụ nọ, 30iji si nʼolulu kpọghachita mkpụrụobi ya, ka e were ìhè nke ndị dị ndụ mụnyere ya.
31“Ṅaa ntị, Job; gee m ntị. Mechie ọnụ, aga m ekwu okwu. 32Ọ bụrụ na i nwere ihe ị ga-ekwu, zaa m; kwuo, nʼihi na ọ ga-atọ m ụtọ ịhụ ka ị bụrụ onye ziri ezi. 33Ọ bụrụ na o nweghị, gee m ntị; mechie ọnụ, aga m ezi gị amamihe.”