A Tụnyere Jeremaya nʼOlulu Mmiri
Ndịisi kpọrọ ozi Jeremaya sitere nʼaka Nna anyị, nke na-agwa ha ka ha nyefee onwe ha, ọgbaghara megide eze, ma wedata ya nʼolulu mmiri jupụtara nʼapịtị ka agụụ gbuo ya. Ebed-Melek onye Kush rịọrọ eze, were akwa ochie na ụdọ dọpụta ya. Zedekaya jụkwara ya ọzọ na nzuzo, e kwere ya nkwa ndụ ya ma ọ nyefee onwe ya, ma o nweghị ike ime ya.
38 1Shefataya nwa Matan, Gedalaya nwa Pashua, Jukal nwa Shelemaya, na Pashua nwa Malkija nụrụ okwu Jeremaya nke na-agwa ndị niile sị:
2“Ihe a bụ ihe Nna anyị kwuru: Onye ọbụla nke nọgidere nʼobodo a ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, ma onye ọbụla nke nyefere onwe ya nʼaka ndị Babilọn ga-adị ndụ, ọ ga-ewerekwa ndụ ya dị ka ihe nkwata nʼagha. 3Ihe a bụ ihe Nna anyị kwuru: Nʼezie, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị agha eze Babilọn, ọ ga-adọtakwa ya nʼagha.”
4Ndịisi ọrụ ahụ gwara eze ahụ sị, “Gbuo nwoke a. Okwu ndị dị otu a na-eme ka aka ndị agha fọdụrụ nʼobodo a na ndị niile daa mba. Ọ naghị achọ ọdịmma ha kama ọ na-achọ ihe ọjọọ ga-adakwasị ha.”
5Eze Zedekaya sịrị, “Lee, ọ nọ nʼaka unu; eze enweghị ike ime ihe ọbụla imegide unu.”
6Ha weere Jeremaya tụnye ya nʼolulu mmiri nke Malkija nwa eze, nke dị nʼogige ndị nche, jiri ụdọ wedata ya. Olulu ahụ enweghị mmiri, naanị apịtị, Jeremaya mikpukwara nʼime apịtị ahụ.
7Ma Ebed-Melek onye Kush, bụ otu onyeisi ọrụ nʼụlọeze, nụrụ na ha etinyela Jeremaya nʼolulu mmiri ahụ. Mgbe eze nọ ọdụ nʼỌnụ Ụzọ Ama Benjamin, 8Ebed-Melek sitere nʼụlọeze pụọ gaa gwa eze okwu sị: 9“Onyenwe m eze, ndị a emeela ihe ọjọọ nʼihe niile ha mere Jeremaya onye amụma, tụnye ya nʼolulu mmiri ka agụụ gbuo ya, ebe ọ bụ na achịcha adịkwaghị nʼobodo a.”
10Eze ahụ nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị, “Were mmadụ iri atọ site nʼebe a ka ha soro gị, bulie Jeremaya onye amụma site nʼolulu mmiri ahụ tupu ọ nwụọ.”
11Ebed-Melek were ndị ikom ahụ gaa nʼụlọeze, baa nʼotu ọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ, were akwa ochie na akwa ndị kajụrụ akajụ, jiri ụdọ wedata ha nye Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. 12Ebed-Melek onye Kush gwara Jeremaya sị, “Tinye akwa ochie ndị a na akwa ndị kajụrụ akajụ nʼokpuru abụba gị, nʼokpuru ụdọ ndị a.” Jeremaya meziri otú ahụ. 13Ha jiri ụdọ dọpụta Jeremaya site nʼolulu mmiri ahụ; Jeremaya nọgidekwara nʼogige ndị nche.
Eze Ahụ Nụrụ Okwu Nna Anyị
14Mgbe ahụ, eze Zedekaya ziri ozi ka a kpọta Jeremaya onye amụma, mee ka e duta ya nʼọnụ ụzọ nke atọ nke ụlọ Nna anyị. Eze ahụ sịrị Jeremaya, “Aga m ajụ gị otu ihe; ezonarịla m ihe ọbụla.”
15Jeremaya gwara Zedekaya sị, “Ọ bụrụ na m gwa gị, ị gaghị egbu m? Ọ bụrụkwa na m dụọ gị ọdụ, ị gaghị ege ntị.”
16Eze Zedekaya ṅụụrụ Jeremaya iyi na nzuzo sị, “Dị ka Nna anyị na-adị ndụ, onye kere anyị ndụ a, agaghị m egbu gị maọbụ nyefee gị nʼaka ndị a na-achọ ndụ gị.”
17Jeremaya gwara Zedekaya sị, “Ihe a bụ ihe Nna nke usuu ndị agha nke eluigwe, Nna Izrel kwuru: Ọ bụrụ na ị nyefee onwe gị nʼaka ndịisi ọrụ eze Babilọn, a ga-echebe ndụ gị, a gaghị ejikwa ọkụ rechapụ obodo a, gị na ndị ụlọ gị ga-adịkwa ndụ. 18Ma ọ bụrụ na ị jụ inyefe onwe gị nʼaka ndịisi ọrụ eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, ndị ga-erechapụ ya ọkụ, ị gaghịkwa esi nʼaka ha gbanarị.”
19Eze Zedekaya gwara Jeremaya sị, “Ana m atụ egwu ndị Juda ndị gbakwuuru ndị Babilọn; a pụrụ inyefe m nʼaka ha ka ha mesoo m mmeso ọjọọ.”
20Jeremaya sịrị, “A gaghị enyefe gị. Rube isi nʼolu Nna anyị dị ka m na-agwa gị, ka ihe gaara gị nke ọma, ka a chebekwa ndụ gị. 21Ma ọ bụrụ na ị jụ inyefe onwe gị, nke a bụ okwu Nna anyị gosiri m:
22“Lee! A ga-akpọpụta ụmụnwaanyị niile fọdụrụ nʼụlọeze eze Juda nye ndịisi ọrụ eze Babilọn, ha ga-asịkwa: ‘Ndị enyi gị ị tụkwasịrị obi ghọgburu gị, merie gị; ụkwụ gị mikpuru nʼapịtị, ha agbakụtakwala gị azụ.’”
23“A ga-akpọrọ ndị nwunye gị na ụmụ gị niile gakwuru ndị Babilọn, ị gaghịkwa esi nʼaka ha gbanarị kama eze Babilọn ga-ejide gị, a ga-ejikwa ọkụ rechapụ obodo a.”
24Mgbe ahụ, Zedekaya sịrị Jeremaya, “Ekwela ka onye ọbụla mara banyere mkparịta ụka a, ma ọ bụghị ya ị ga-anwụ. 25Ọ bụrụ na ndịisi ọrụ ahụ anụ na mụ na gị kwurịtara okwu, ha abịa sị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe ọ gwara gị; ezonarịla anyị ihe ọbụla, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’ 26mgbe ahụ, ị ga-asị ha, ‘Ana m arịọ eze ka ọ ghara izighachi m nʼụlọ Jonatan ka m nwụọ nʼebe ahụ.’”
27Ndịisi ọrụ niile bịara jụọ Jeremaya ajụjụ, ọ zakwara ha kpọmkwem dị ka eze si nye nʼiwu. Ya mere, ha kwụsịrị, nʼihi na ọ dịghị onye nụrụ mkparịta ụka ahụ. 28Jeremaya nọgidere nʼogige ndị nche ruo ụbọchị a dọtara Jerusalem nʼagha. Nke a bụkwa otú ọ dị mgbe Jerusalem dara.