Nke Kachasị Ukwuu nʼime Ndị a
Onyinye ọbụla ha na-asọ mpi maka ya — asụsụ dị iche iche, ibu amụma, ihe ọmụma, okwukwe na-ebugharị ugwu, ọ bụladị inyecha ihe niile — abaghị uru ọbụla ma ịhụnanya adịghị. Ịhụnanya nwere ndidi, ọ naghị edekọ ihe ọjọọ e mere ya, ọ na-adịgidekwa karịa onyinye ndị ahụ, nke ga-akwụsị mgbe anyị ga-ahụ ihu na ihu.
13 1Ọ bụrụ na m na-asụ asụsụ mmadụ na nke ndị mmụọ ozi, ma enweghị m ịhụnanya, abụ m naanị ogene na-ada ụda, maọbụ okpokoro ọla na-ada mkpọtụ. 2Ọ bụrụ na m nwere ike ibu amụma, ghọta ihe omimi niile na ihe ọmụma niile, nweekwa okwukwe niile, nke ga-eme ka ugwu niile kwafee, ma enweghị m ịhụnanya, abụ m ihe efu. 3Ọ bụrụ na m nye ihe niile m nwere, ọ bụrụkwa na m rara ahụ m nye ka m nwee ihe m ga-eji nganga, ma enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị uru m ga-erite.
4Ịhụnanya na-enwe ndidi, ịhụnanya na-emekwa obiọma. Ọ naghị ekwo ekworo, ọ naghị etu ọnụ, ọ naghị ebuli onwe ya elu. 5Ọ naghị akpa omume rụrụ arụ, ọ naghị achọ naanị ọdịmma nke onwe ya, ọ naghị ewe iwe ngwa ngwa, ọ naghị edebe ndekọ nke njọ e mere ya. 6Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ. 7Ọ na-echebe ihe niile mgbe niile, ọ na-atụkwasị obi mgbe niile, ọ na-enwe olileanya mgbe niile, ọ na-enwe ntachi obi mgbe niile.
8Ịhụnanya adịghị ada mba ma ọlị. Ma amụma niile ga-akwụsị, ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsị, ihe ọmụma ga-agwụkwa. 9Nʼihi na anyị maara naanị akụkụ, anyị na-ebukwa amụma naanị akụkụ, 10ma mgbe nke zuruoke bịara, ihe ahụ bụ naanị akụkụ ga-agwụ. 11Mgbe m bụ nwata, m na-asụ okwu dịka nwata, na-eche echiche dịka nwata, na-atụle ihe dịka nwata. Mgbe m ghọrọ okenye, m hapụrụ ihe ụmụaka nʼazụ. 12Nʼihi na ugbu a, anyị na-ahụ onyinyo na-edoghị anya nʼime enyo; ma mgbe ahụ, anyị ga-ahụ ihu na ihu. Ugbu a, m maara naanị akụkụ; ma mgbe ahụ, m ga-amata nke ọma, dịka a maara m nke ọma. 13Ugbu a, ihe atọ a na-anọgide: okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nke kachasị ukwuu nʼime ha bụ ịhụnanya.