A Na-anabata Mmadụ Niile Nʼoriri Nna Anyị
A na-esi ajụjụ n'ajụjụ dị ka ọnya — ụtụ Siza, nwanyị di ya nwụrụ ugboro asaa, iwu kacha ukwuu, ịhụ Nna anyị n'anya na ihe niile — Jisọs wee tụgharịa nke ọ bụla laghachi n'isi onye jụrụ ya. Mgbe ahụ ọ jụrụ ajụjụ nke ya banyere Onyenwe Devid, ọ dịghịkwa onye ọzọ jụrụ ya ajụjụ ọzọ.
22 1Jisọs jiri ilu gwakwaa ha okwu ọzọ, sị:
2“Alaeze Nna anyị dị ka otu eze kwadooro nwa ya oriri agbamakwụkwọ. 3O zipụrụ ndị ohu ya ka ha kpọọ ndị a kpọrọ òkù ka ha bịa oriri agbamakwụkwọ ahụ, ma ha jụrụ ịbịa. 4O zikwara ndị ohu ọzọ, sị, ‘Gwanụ ndị ahụ a kpọrọ òkù: Lee, akwadoola m oriri m; egbuola m ehi m na anụ ụlọ m gbara abụba, ihe niile dịkwa njikere. Bịanụ oriri agbamakwụkwọ ahụ.’ 5Ma ha elebaraghị ya anya, pụọ laa, otu onye gaa nʼubi ya, onye ọzọ gaa nʼazụmahịa ya, 6ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mesoo ha mmeso ọjọọ, gbukwaa ha. 7Eze ahụ were oke iwe, o zipụrụ ndị agha ya, bibie ndị ogbu mmadụ ahụ, gbaakwa obodo ha ọkụ. 8Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya, sị, ‘Agbamakwụkwọ ahụ adịla njikere, ma ndị ahụ a kpọrọ òkù erughị eru. 9Ya mere gaanụ nʼokporo ụzọ ukwu, kpọọkwa ndị niile unu ga-ahụ ka ha bịa oriri agbamakwụkwọ ahụ.’ 10Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporo ụzọ, chịkọta ndị niile ha hụrụ, ndị ọjọọ na ndị ọma, ụlọ oriri agbamakwụkwọ ahụ jupụtakwara nʼọbịa.
11“Ma mgbe eze ahụ batara ịhụ ndị ọbịa ahụ, ọ hụrụ otu nwoke na-eyighị uwe agbamakwụkwọ. 12Ọ jụrụ ya, sị, ‘Enyi m, olee otu i siri bata nʼebe a na-eyighị uwe agbamakwụkwọ?’ O nweghị ihe ọ nwere ikwu. 13Mgbe ahụ eze ahụ gwara ndị ohu, sị, ‘Keenụ ya aka na ụkwụ, tụba ya nʼọchịchịrị dị nʼezi, ebe a ga-anọ na-ebe akwa na-atakwa ikikere eze.’ 14Nʼihi na a kpọrọ ọtụtụ mmadụ, ma ọ dị mmadụ ole na ole a họpụtara.”
Nyenụ Nna Anyị Ihe Bụ Nke Ya
15Mgbe ahụ ndị Farisii gara gbaa izu otu ha ga-esi jiri okwu ya onwe ya tọọ ya ọnyà.
16Ha zitere ya ndị na-eso ụzọ ha, ha na ndị otu Herọd, sị, “Onye nkuzi, anyị maara na ị na-ekwu eziokwu, na-akụzikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu; ị naghị akwanyere onye ọbụla ùgwù karịa ibe ya, nʼihi na ị naghị ele mmadụ anya nʼihu. 17Ya mere, gwa anyị ihe ị na-eche: Ọ ziri ezi nʼiwu ịtụ Siza ụtụ, ka ọ bụ na o kwesighị?”
18Ma Jisọs, ebe ọ maara echiche ọjọọ ha, sị, “Gịnị mere unu ji na-anwa m ọnwụnwa, unu ndị ihu abụọ? 19Gosinụ m mkpụrụ ego e ji atụ ụtụ ahụ.” Ha wetaara ya otu denarịọs.
20Ọ sịrị ha, “Onyinyo onye ka nke a bụ, na ihe odide onye?”
21Ha sịrị, “Nke Siza.” Mgbe ahụ ọ sịrị ha, “Ya mere nyenụ Siza ihe bụ nke Siza, nyekwanụ Nna anyị ihe bụ nke Nna anyị.”
22Mgbe ha nụrụ ya, o juru ha anya; ha hapụrụ ya laa.
Nna Anyị Bụ Chineke Nke Ndị Dị Ndụ
23Nʼotu ụbọchị ahụ, ndị Sadusii, bụ ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ, 24sị, “Onye nkuzi, Mosis kwuru, sị: Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrịrị nwunye ya, mụtara nwanne ya mkpụrụ. 25Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ebe ọ mụtaghị nwa, hapụrụ nwanne ya nwunye ya. 26Otu a kwa nke abụọ na nke atọ, ruo nke asaa. 27Nʼikpeazụ ha niile, nwanyị ahụ nwụkwara. 28Ya mere, na mbilite nʼọnwụ, ọ ga-abụ nwunye onye nʼime mmadụ asaa ahụ? Nʼihi na ha niile lụrụ ya.”
29Jisọs zara sị, “Unu na-ehie ụzọ—unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, maghịkwa ike Nna anyị. 30Nʼihi na na mbilite nʼọnwụ, mmadụ anaghị alụ nwunye, anaghịkwa alụ di, kama ha dị ka ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe. 31Ugbu a, banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na unu agụbeghị ihe Nna anyị gwara unu, sị:
32‘Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik, na Chineke nke Jekọb’? Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ Chineke nke ndị dị ndụ.”
33Mgbe ìgwè mmadụ ahụ nụrụ ya, nkuzi ya juru ha anya.
Jiri Ihe Niile I Nwere Hụ Nna Gị Nʼanya
34Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na o mechiela ndị Sadusii ọnụ, ha zukọtara ọnụ. 35Otu onye nʼime ha, onye ọkachamara nʼiwu, jụrụ ya ajụjụ ịnwa ya ọnwụnwa: 36“Onye nkuzi, olee iwu kachasị ukwuu nʼime iwu niile?”
37Ọ sịrị ya, “Jiri obi gị niile, na mkpụrụ obi gị niile, na uche gị niile hụ Nna gị nʼanya. 38Nke a bụ iwu mbụ na nke kachasị ukwuu. 39Nke abụọ yiri ya: Ị ga-ahụ onye agbata obi gị nʼanya dị ka onwe gị. 40Ọ bụ nʼiwu abụọ a ka iwu niile na okwu ndị amụma niile dabere.”
Kraịst Ọ Bụ Nwa Onye?
41Ugbu a, mgbe ndị Farisii zukọrọ ọnụ, Jisọs jụrụ ha, 42“Gịnị ka unu na-eche banyere Kraịst? Ọ bụ nwa onye?” Ha sịrị ya, “Nwa Devid.”
43Ọ jụrụ ha, “Ọ dị aṅaa Devid jiri site na Mmụọ Nsọ kpọọ ya Onyenwe anyị, sị,
44‘Nna anyị gwara Onyenwe m, sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m, ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị”’?
45Ọ bụrụ na Devid na-akpọ Kraịst Onyenwe anyị, olee otu Kraịst ga-esi bụrụ nwa Devid?”
46O nweghị onye nwere ike ịzaghachi ya otu okwu, site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, o nweghịkwa onye nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.