Iyi Job ṅụrụ Banyere Obi Dị Ọcha
Job ji iyi mechie okwu ya, na-emeghe ndụ ya otu ihe n'otu ihe: ọ dịghị agụụ mmekọahụ, ọ dịghị ụgha, ọ dịghị ịjụ ohu ikpe ziri ezi, ọ dịghị iri nri naanị ya mgbe nwa mgbei nọ n'agụụ, ọ dịghị ịtụkwasị ọlaedo obi. Ọ bịanyere aka n'ya ma chọọ ka e weta akwụkwọ ebubo. Mgbe ahụ okwu ya kwụsịrị.
31 1“Mụ na anya m gbara ndụ; olee otú m ga-esi jiri anya legide nwa agbọghọ na-amaghị nwoke? 2Nʼihi na olee òkè m ga-enweta nʼaka Chineke nke dị nʼelu, olee ihe nketa m ga-enweta nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nke nọ nʼebe dị elu? 3Ọ bụ na ọ bụghị mbibi dịịrị ndị na-emeghị ezi omume, na ọdachi dịịrị ndị na-eme ihe ọjọọ? 4Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọụkwụ m niile ọnụ?
5“Ọ bụrụ na m ejirila ụgha bie ndụ, ọ bụrụ na ụkwụ m emeela ngwa ngwa banye nʼaghụghọ, 6ya jiri ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m, ka Chineke mara izuoke m, 7ọ bụrụ na nzọụkwụ m esitela nʼụzọ wezuga onwe ya, ọ bụrụ na obi m esoola anya m, ọ bụrụ na ntụpọ ọbụla eraparala nʼaka m, 8mgbe ahụ, ka m kụọ mkpụrụ, onye ọzọ rie ya, ka e hopukwa ihe niile puputaara m.
9“Ọ bụrụ na e nwee nwanyị rafuru obi m, ọ bụrụ na m zoola onwe m nʼọnụ ụzọ onye agbata obi m, 10mgbe ahụ, ka nwunye m jeere nwoke ọzọ ozi, ka ndị ọzọ na-edinakwa ya. 11Nʼihi na nke ahụ ga-abụ mpụ na-eweta ihere, mmehie kwesịrị ka a maa ya ikpe; 12nʼihi na ọ bụ ọkụ na-erepịa ihe ruo na mbibi, nke ga-erechapụ ihe owuwe ihe ubi m niile.
13“Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ziri ezi nye odibo m nwoke maọbụ odibo m nwanyị mgbe ha mere mkpesa megide m, 14gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke biliri ọtọ? Mgbe ọ kpọrọ m ka m zaa ajụjụ, gịnị ka m ga-aza ya? 15Ọ bụ na onye kpụrụ m nʼime afọ akpụghị odibo m kwa? Ọ bụghị otu onye ahụ kpụrụ anyị abụọ nʼime afọ nne?
16“Ọ bụrụ na m jụrụ inye ndị ogbenye ihe ha chọrọ, maọbụ mee ka anya nwaanyị di ya nwụrụ daa mba, 17maọbụ naanị m rie nri m mgbe nwa ogbenye na-enweghị nne na nna na-anọ agụụ, 18ọ bụ ezie na site na nwata m zụlitere ya dịka nna ga-esi mee, sitekwa nʼafọ nne m duziri m nwaanyị di ya nwụrụ, 19ọ bụrụ na m hụrụ onye ọbụla na-ala nʼiyi nʼihi enweghị uwe, maọbụ onye nọ na mkpa nke na-enweghị ihe mkpuchi, 20ọ bụrụ na mkpụrụobi ya niile agọzighị m nʼihi na eji m ajị atụrụ m mee ka ahụ́ na-ekpo ya ọkụ, 21ọ bụrụ na eweliela m aka m megide nwa ogbenye nʼihi na m hụrụ na ndị ga-akwado m nọ nʼụlọ ikpe, 22mgbe ahụ, ka ubu m si nʼọkpụkpụ ya dọpụ, ka a gbajie ogwe aka m nʼọnụ ya. 23Nʼihi na mbibi si nʼaka Chineke bụụrụ m ihe oke egwu, nʼihu ebube ya enweghị m ike ime ihe ọbụla.
24“Ọ bụrụ na m emeela ọlaedo ihe ntụkwasị obi m, maọbụ sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe nchekwa m,’ 25ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ na akụ m dị ukwuu, na aka m enwetala ọtụtụ ihe, 26ọ bụrụ na m lere anyanwụ anya mgbe ọ na-enwu, maọbụ ọnwa ka ọ na-aga nʼebube, 27nke mere ka a rafuo obi m na nzuzo, ka aka m fere ha nsutu ọnụ dịka ofufe, 28nke a kwa ga-abụ mmehie kwesịrị ka a maa ya ikpe, nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye Chineke nke dị nʼelu.
29“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ na mbibi nke onye kpọrọ m asị, maọbụ ṅụrịa mgbe ihe ọjọọ dakwasịrị ya. 30ọ dịghị mgbe m hapụrụ ọnụ m ka o mehie site nʼịbụ ndụ ya ọnụ, 31ọ bụrụ na ndị ikom nọ nʼezinụlọ m ekwubeghị, ‘Onye ka afọ na-ejubeghị site na tebụl ya?’, 32ọ dịghị ọbịa nọrọ abalị nʼezi, nʼihi na m na-emeghere onye ije ọnụ ụzọ m. 33Ọ bụrụ na m kpuchiri mmehie m dịka ndị ọzọ si eme, na-ezo ikpe ọmụma m nʼime obi m, 34nʼihi na m tụrụ egwu ìgwè mmadụ nke ukwuu, nleda anya nke ikwu dị iche iche menyekwara m egwu, nke mere na m gbachiri nkịtị ghara ịpụ nʼezi.
35“Ewoo, a sị na mmadụ ga-anụ olu m! Lee aka m dere—ka Onye pụrụ ime ihe niile zaa m! Ka onye na-ebo m ebubo dee ebubo ya nʼakwụkwọ! 36Nʼezie, m ga-ebu ya nʼubu m, m ga-ekekwasị ya nʼahụ́ m dịka okpueze. 37m ga-akọrọ ya akụkọ banyere nzọụkwụ m niile; dịka onye isi m ga-esi bịakwute ya.
38“Ọ bụrụ na ala m etiela mkpu megide m, ọ bụrụ na olulu ubi ya akwaala ákwá ọnụ, 39ọ bụrụ na m riri mkpụrụ ya na-akwụghị ụgwọ, maọbụ gbupịa ndụ ndị nwe ya, 40mgbe ahụ, ka ogwu na-epu kama ọka wit, ka ahịhịa na-esi ísì ọjọọ pupụta kama ọka balị.” Okwu Job agwụla.