Nna Na-agwọ Neeman Ọrịa
Otu nwata nwanyị Izrel a dọtara nʼagha gosiri Neeman ụzọ gakwuru onye amụma Nna anyị. Iwe were ya mgbe a gwara ya ka ọ saa ahụ na Jọdan, ma ọ gere ndị ohu ya ntị kama ịnụ ntị na mpako ya, wee si na mmiri pụta dị ọcha. Ịlaisha anaghị ụgwọ ọbụla; Gehazi chụrụ onyinye ahụ, nara ya, nara ọrịa ahụ tinyere ya.
5 1Neeman, ọchịagha ndị agha eze Aram, bụ nwoke ukwu, onye onyenwe ya na-asọpụrụ nke ukwuu, nʼihi na ọ bụ site na ya ka Nna anyị nyere Aram mmeri. Ọ bụ dike dị ike nʼagha, ma ọ nwere ọrịa nʼakpụkpọ ahụ ya. 2Ndị Aram apụọla ibuso ndị mmadụ agha, dọta otu nwatakịrị nwaanyị site nʼala Izrel; nwatakịrị a na-ejekwara nwunye Neeman ozi. 3Ọ gwara onyenwe ya nwaanyị sị, “A sị na onyenwe m ga-agakwuru onye amụma ahụ nọ na Sameria! Ọ ga-agwọ ya ọrịa ekpenta ya.”
4Ya mere, Neeman banyere gwa onyenwe ya sị, “Otú a ka nwatakịrị nwaanyị ahụ si nʼala Izrel kwuru.”
5Eze Aram sịrị, “Gaa. Aga m ezigara eze Izrel akwụkwọ ozi.” Ya mere, Neeman biliri pụọ, chịrị ihe dịka narị pound asaa na iri ise nke ọlaọcha, na ihe dịka narị pound na iri ise nke ọlaedo, na uwe iri.
6O weere akwụkwọ ozi ahụ bute eze Izrel. Ihe e dere nʼime ya bụ: “Mgbe akwụkwọ ozi a ga-eru gị aka, lee, ezitere m gị Neeman ohu m, ka ị gwọọ ya ọrịa akpụkpọ ahụ ya.”
7Mgbe eze Izrel gụchara akwụkwọ ozi ahụ, ọ dọwara uwe ya sị, “Ọ bụ m bụ Chineke, onye nwere ike igbu mmadụ na inye ndụ, nke mere o ji ziga sị m gwọọ otu nwoke ọrịa akpụkpọ ahụ ya? Leenụ, ọ na-achọ esemokwu nʼebe m nọ!”
8Mgbe Ịlaisha, onye nke Nna anyị, nụrụ na eze Izrel adọwaala uwe ya, o zigaara eze ozi sị, “Gịnị mere i ji dọwaa uwe gị? Zitere m ya, ọ ga-amatakwa na e nwere onye amụma nʼIzrel.”
9Ya mere, Neeman jiri ịnyịnya ya na ụgbọ ịnyịnya ya bịa, kwụsị nʼọnụ ụzọ ụlọ Ịlaisha. 10Ịlaisha zigaara ya onye ozi sị, “Gaa saa ahụ ugboro asaa nʼosimiri Jọdan; anụ ahụ gị ga-alaghachi nʼọnọdụ ya, ị ga-adịkwa ọcha.”
11Ma Neeman ji iwe pụọ, na-asị, “Echere m na ọ ga-apụkwute m, guzoro ọtọ, kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya, fee aka ya nʼelu ebe ahụ, gwọọ ọrịa ahụ. 12Ọ bụ na Abana na Parpar, osimiri Damaskọs, adịghị mma karịa mmiri niile nke Izrel? Ọ bụ na m apụghị ịsa ahụ nʼime ha dị ọcha?” Ya mere, ọ tụgharịrị jiri oke iwe pụọ.
13Ma ndị ohu ya bịakwutere ya sị, “Nna m, a sị na onye amụma ahụ gwara gị ka i mee ihe ukwu, ị gaghị eme ya? Ọ ga-esikwu aka nke ukwuu mgbe ọ sịrị naanị, ‘Saa ahụ dịkwa ọcha’?”
14O gbadara, mikpuo onwe ya nʼosimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Nna anyị si kwuo, anụ ahụ ya laghachiri nʼọnọdụ ya dịka nke nwatakịrị ọhụrụ, ọ dịkwa ọcha.
15Neeman na ndị niile so ya laghachikwuru onye nke Nna anyị. Ọ bịara guzo nʼihu ya sị, “Ugbu a, amatala m na ọ dịghị Chineke ọzọ nʼụwa niile ma ọ bụghị nʼIzrel. Biko, nara onyinye site nʼaka ohu gị.”
16Ịlaisha zara sị, “Dịka Nna anyị onye m na-eguzo nʼihu ya si adị ndụ, agaghị m anara ihe ọbụla.” Neeman rịọsiri ya ike ka ọ nara ya, ma ọ jụrụ.
17Neeman sịrị, “Ọ bụrụ na i gaghị anara ya, biko, ka e nye ohu gị aja ruru ihe ịnyịnya muul abụọ nwere ike ibu, nʼihi na ohu gị agaghịzi achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja nye chi ọbụla ọzọ, ma ọ bụghị naanị nye Onyenwe anyị. 18Ma ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị otu ihe a: mgbe onyenwe m banyere nʼụlọ arụsị Rimọn ịkpọ isiala, dabere nʼaka m, mgbe mụ onwe m na-akpọ isiala nʼụlọ arụsị Rimọn, mgbe m na-akpọ isiala nʼebe ahụ—ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị ihe a.”
19Ịlaisha sịrị, “Laa nʼudo.” Ya mere, Neeman hapụrụ ya, gaa ruo ebe dị anya.
20Ma Gehazi, ohu Ịlaisha, onye nke Nna anyị, chere nʼobi ya sị, “Lee, onyenwe m ahapụla Neeman onye Aram a nke ọma, nʼihi na ọ naraghị ihe o wetaara ya. Dịka Nna anyị si adị ndụ, aga m agbaso ya ọsọ nata ihe site nʼaka ya.”
21Gehazi gbagidere Neeman ọsọ. Mgbe Neeman hụrụ ya ka ọ na-agba ọsọ na-abịa, o si nʼụgbọ ịnyịnya ya rịdata izute ya, jụọ sị, “Ihe niile ọ dị mma?”
22Gehazi sịrị, “Ihe niile dị mma. Onyenwe m zitere m ka m sị: ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ si nʼòtù ndị amụma site nʼugwu Ifrem bịakwutere m. Biko, nye ha ihe dịka pound iri asaa na ise nke ọlaọcha na uwe abụọ e ji agbanwe.’”
23Neeman sịrị, “Biko, were ihe dịka narị pound na iri ise.” Ọ rịọsiri Gehazi ike, kee ihe dịka narị pound na iri ise nke ọlaọcha nʼime akpa abụọ, tinyekwa uwe abụọ, nyefee ha ndị ohu ya abụọ, ndị buuru ha gaa nʼihu Gehazi. 24Mgbe ha rutere nʼugwu ahụ, Gehazi naara ihe ndị ahụ nʼaka ndị ohu ahụ, dọba ha nʼime ụlọ, zilaga ndị ikom ahụ, ha wee laa. 25Ọ banyere guzo nʼihu onyenwe ya. Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i nọ, Gehazi?” Ọ zara sị, “Ohu gị agaghị ebe ọbụla.”
26Ma Ịlaisha sịrị ya, “Ọ bụ na obi m esoghị gị mgbe nwoke ahụ si nʼụgbọ ịnyịnya ya tụgharịa izute gị? Ọ bụ oge ịnara ego ọlaọcha, maọbụ uwe, maọbụ ubi oliv, maọbụ ubi vaịn, maọbụ atụrụ, maọbụ ehi, maọbụ ndị ohu ndị ikom na ndị inyom? 27Ọrịa ekpenta Neeman ga-arapara gị na mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi.” Gehazi si nʼihu ya pụọ, bụrụ onye ekpenta, akpụkpọ ahụ ya na-acha ọcha ka snoo.