Atalaya Weghara Ocheeze Ahụ
Atalaya gburu ezinụlọ eze, ma e zoro otu nwa ọhụrụ nʼụlọ Nna anyị afọ isii. Onye nchụaja bụ Jehoiada nyere ndị nche ngwa agha, kpube nwata ahụ okpueze, mee ka e gbuo eze nwanyị ahụ nʼezi ebe nsọ. A kwaturu ụlọ nsọ Baal, nwata dị afọ asaa wee nọkwasị nʼocheeze.
11 1Mgbe Atalaya, bụ nne Ahazaya, hụrụ na nwa ya anwụọla, o bidoro ibibi ezinụlọ eze ahụ niile. 2Ma Jehosheba, ada eze Joram na nwanne Ahazaya, kpọọrọ Joash nwa Ahazaya, zuru ya zopụ nʼetiti ụmụ eze ndị a na-achọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-azụ ya nʼime ọnụụlọ ihi ụra, zonarị ha Atalaya, ya mere e gbughị ya. 3O zoro onwe ya soro ya nọọ nʼụlọ Nna anyị afọ isii, mgbe Atalaya na-achị ala ahụ.
Nna Anyị Chebere Eze Ahụ Kwesịrị Ekwesị
4Nʼafọ nke asaa, Jehoiada ziga kpọọ ndịisi agha nke narị ndị agha, bụ ndị Karaịt na ndị nche, kpọbata ha nʼebe ọ nọ nʼụlọ Nna anyị. O na ha gbara ndụ, mee ka ha ṅụọ iyi nʼụlọ Nna anyị, ma gosi ha nwa eze ahụ. 5O nyere ha iwu sị, “Nke a ka unu ga-eme: otu ụzọ nʼụzọ atọ nʼime unu, bụ ndị na-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike, ga-eche obí eze nche, 6otu ụzọ nʼọnụ ụzọ ama Sọ, otu ụzọ nʼọnụ ụzọ ama dị nʼazụ ndị nche; unu ga na-echerịta obí ahụ nche. 7Ìgwè unu abụọ ndị ọzọ, bụ ndị na-apụ nʼọrụ nʼụbọchị izuike, ga-echere eze ụlọ Nna anyị nche. 8Gbaa eze gburugburu nʼakụkụ niile, onye ọbụla jidere ngwa agha ya nʼaka; gbuo onye ọbụla bịaruru nso usoro ndị agha. Soronụ eze ebe ọbụla ọ na-aga.”
9Ndịisi agha nke narị ndị agha mere ihe niile Jehoiada bụ onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọọrọ ndị ikom ya—ndị na-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike na ndị na-apụ nʼọrụ—bịakwute Jehoiada onye nchụaja. 10Onye nchụaja ahụ nyere ndịisi agha nke narị ndị agha ùbe na ọta nke eze Devid, bụ ndị e debere nʼụlọ Nna anyị. 11Ndị nche guzoro gburugburu eze, onye ọbụla jidere ngwa agha ya nʼaka, site nʼakụkụ ndịda nke ụlọ nsọ ahụ ruo nʼakụkụ ugwu, nʼakụkụ ebe ịchụ aja na ụlọ nsọ ahụ. 12Jehoiada kpọpụtara nwa eze ahụ, kpube ya okpueze, ma nye ya akwụkwọ ọgbụgba ama ahụ. Ha mara ọkwa na ọ bụ eze ma tee ya mmanụ, ndị mmadụ kụkwara aka ha, tie mkpu sị, “Ka eze dị ndụ ogologo ndụ!”
13Mgbe Atalaya nụrụ ụzụ ndị nche na ndị mmadụ, ọ gakwuru ndị mmadụ nʼụlọ Nna anyị. 14O lere anya—lee eze ka o guzoro nʼakụkụ ogidi dịka omenala si dị, ndịisi agha na ndị na-afụ opi nọ ya nʼakụkụ, ndị niile nọ nʼala ahụ na-aṅụrị ọṅụ na-afụkwa opi. Atalaya dọwara uwe ya, na-eti mkpu sị, “Nnupụisi! Nnupụisi!”
15Jehoiada onye nchụaja nyere ndịisi agha nke narị ndị agha na-achị ndị agha iwu sị, “Dupụ ya gafee usoro ndị agha; were mma agha gbuo onye ọbụla na-eso ya.” Nʼihi na onye nchụaja ahụ ekwuola na a gaghị egbu ya nʼụlọ Nna anyị. 16Ya mere, ha jidere ya, ọ gafee nʼọnụ ụzọ ịnyịnya na-esi abanye nʼobí eze, nʼebe ahụ ka e gburu ya.
17Mgbe ahụ, Jehoiada mere ọgbụgba ndụ nʼetiti Nna anyị na eze na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke Nna anyị; mekwaa ọgbụgba ndụ nʼetiti eze na ndị mmadụ. 18Ndị niile nọ nʼala ahụ gara nʼụlọ arụsị Baal kwatuo ya. Ha kụrisịrị ebe ịchụ aja ya niile na arụsị ya niile, gbuokwa Matan, bụ onye nchụaja Baal, nʼihu ebe ịchụ aja ndị ahụ. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ debere ndị nche ka ha chee ụlọ Nna anyị nche. 19O kpọọrọ ndịisi agha nke narị ndị agha, ndị Karaịt, ndị nche, na ndị niile nọ nʼala ahụ, ha sitere nʼụlọ Nna anyị kpọdata eze, gafee nʼọnụ ụzọ ama ndị nche ruo nʼobí eze, ebe ọ nọdụrụ ala nʼocheeze ndị eze. 20Ndị niile nọ nʼala ahụ ṅụrịrị ọṅụ, obodo ahụ dajụkwara, ebe e jirila mma agha gbuo Atalaya nʼobí eze.
21Joash gbara afọ asaa mgbe ọ ghọrọ eze.