Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Job 16 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

Ndị Nkasiobi Na-abaghị Uru

Job kpọrọ ha ndị nkasi obi na-ewute mmadụ, ma sị na ya onwe ya pụrụ ikwu okwu dị otú ahụ, ọ bụrụ na ọnọdụ ha gbanwere. Ọ kọwara Chineke dị ka dike agha jidere ya n'olu ma mee ya ihe a na-agba ụta. Ma ọ ka na-ekwusi ike na onye akaebe ya guzo n'eluigwe.

Isi 16.

Mgbe ahụ, Job zara sị: “Anụla m ọtụtụ ihe dị ka ndị a; unu niile bụ ndị nkasiobi na-abaghị uru. Ọ dịghị njedebe nʼokwu efu gị? Gịnị na-akpali gị nke mere i ji nọgide na-aza okwu? Mụ onwe m pụkwara ikwu okwu dị ka unu si ekwu, ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m; m pụrụ ịchịkọta okwu megide unu ma na-efegharị isi m nʼebe unu nọ. Ma m ga-eji ọnụ m gba unu ume, nkasiobi nke egbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ. Ọ bụrụ na m kwuo okwu, ihe mgbu m adịghị adajụ; ọ bụrụ na m jide ọnụ m, gịnị na-ahapụ m? Nʼezie, ugbu a, Chineke emeela ka ike gwụ m; ị bibiela òtù m niile. Ị kpọnwụọla m, nke a aghọọla ihe akaebe; ịta m ahụ na-ebili megide m ma na-agba akaebe nʼihu m. Iwe ya adọwaala m ma na-emegide m; o takwuola eze ya megide m; onye iro m na-elegide m anya. Ndị mmadụ asaghepụla ọnụ ha megide m; ha ji nleda anya kụọ m aka nʼagba; ha ejikọọla onwe ha ọnụ megide m. Chineke ewerela m nyefee ndị na-emeghị ihe ziri ezi, tụbakwa m nʼaka ndị ajọ omume. Anọ m nʼudo, ma ọ kụrisịrị m; o jidere m nʼolu ma tiwaa m ntiwa; o doola m ọtọ dị ka ihe ọ na-agba àkụ. Ndị ọ na-agba àkụ agbara m gburugburu; ọ na-ebọwa akụrụ m na-enweghị ọmịiko ma na-awụsa ọnụnụ m nʼala. Ọ na-eti m ihe otiti nʼelu ihe otiti; ọ na-agbakwu m ọsọ dị ka dike nʼagha. Adụkọọla m ákwà owu nʼakpụkpọ ahụ m ma lie egedege ihu m nʼájá. Ihu m achaala uhie uhie nʼihi ákwá, oké onyinyo dịkwa na mbubo anya m, ọ bụ ezie na ihe ike ọ bụla adịghị nʼaka m, ekpere m dịkwa ọcha. Ala, ekpuchila ọbara m, ekwekwala ka mkpu akwa m nweta ebe izu ike. Ọbụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe, onye na-ekwuchitere m okwu nọkwa nʼebe dị elu. Ndị enyi m na-akwa m emo; anya m na-awụpụ anya mmiri nʼebe Chineke nọ, ka ọ kwuchitere mmadụ ikpe ya nʼihu Chineke, dị ka nwa mmadụ si ekwuchitere onye agbata obi ya. Nʼihi na naanị afọ ole na ole ga-agafe, mgbe ahụ aga m aga nʼụzọ ahụ na-adịghị alọghachi.”