Abụ Ákwà Maka Ndị Eze Izrel
Abụ olili ozu maka ndị eze Juda, nke e kwuru dị ka nne ọdụm nke e jidere ụmụ ya abụọ n'ọnyà, tinye ha n'ọba, na dị ka osisi vaịn e ruturu na mgbọrọgwụ ma sụọ ọkụ ruo mgbe ọ dịghị alaka fọdụrụ siri ike nke ga-eme mkpara eze. Ọ dịghị ihe e kwere na nkwa na njedebe. Ọ ka bụ abụ ákwá.
19 1“Ma gị onwe gị, bulie abụ ákwà maka ndị eze Izrel, 2sị: Gịnị ka nne gị bụ? Ọ bụ nne ọdụm. Nʼetiti ọdụm ka o dinara, nʼetiti ọdụm ndị na-eto eto ka ọ zụlitere ụmụ ya. a a v2 Nne ọdụm ahụ bụ ezinụlọ eze Juda, ụmụ ya bụkwa ndị eze ya — isi akwụkwọ a dum bụ abụ ákwà na-egosi ọdịda nke ndị ikpeazụ chịrị Juda. 3Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya, ọ ghọọ ọdụm na-eto eto. Ọ mụtara ịdọwasị anụ ọ na-egbu; ọ na-eri mmadụ. 4Mba dị iche iche nụrụ akụkọ ya; e jidere ya nʼolulu ha, ha ewere nko duru ya gaa nʼala Ijipt. 5Mgbe ọ hụrụ na ọ nọ na-eche nʼefu, na olileanya ya efuola, o were nwa ya ọzọ mee ya ọdụm na-eto eto. 6Ọ na-agagharị nʼetiti ọdụm; ọ ghọrọ ọdụm na-eto eto. Ọ mụtara ịdọwasị anụ ọ na-egbu; ọ na-eri mmadụ. 7Ọ kwadara ebe ha e wusiri ike mee ka obodo ha tọgbọrọ nʼefu. Ala ahụ na ndị niile bi nʼime ya tụrụ oke egwu nʼihi ụda mbigbọ ya. 8Mgbe ahụ mba dị iche iche si nʼógbè niile gbara ya gburugburu bịakwasị ya; ha gbasara ụgbụ ha nʼelu ya, e jidekwara ya nʼolulu ha. 9Ha were nko tinye ya nʼọkpọkọ, kpọrọ ya gakwuru eze Babilọn. Ha kpọbatara ya nʼebe e wusiri ike, ka a ghara ịnụ olu ya ọzọ nʼelu ugwu Izrel. 10Nne gị dị ka osisi vaịn nʼubi vaịn gị, nke a kụrụ nʼakụkụ mmiri, nke mịara mkpụrụ ma baa ụba na alaka nʼihi ọtụtụ mmiri. 11O nwere alaka siri ike kwesịrị ịbụ mkpara eze nke ndị na-achị achị. O toro ogologo nʼetiti alaka ndị gbara ọkpụkpụ, a na-ahụkwa ya nʼihi ịdị elu ya nʼetiti ìgwè alaka ya. 12Ma e ji oke iwe fopu ya mgbọrọgwụ tụpụ ya nʼala; ikuku ọwụwa anyanwụ mere ka mkpụrụ ya kpọnwụọ. A nyapụrụ alaka ya ndị siri ike, ha kpọnwụọkwa; ọkụ repịara ha. 13Ugbu a, a kụrụ ya nʼọzara, nʼala kpọrọ nkụ nke akpịrị na-akpọ nkụ. 14Ọkụ esitela nʼosisi ya na-ebewa repịa alaka ya na mkpụrụ ya, nke mere na ọ dịghị alaka siri ike fọdụrụ nʼime ya, ọ dịghịkwa mkpara eze maka ịchị achị. Nke a bụ abụ ákwà, ọ ghọọla abụ ákwà.” b b v14 Ahịrị ikpeazụ a pụtara na uri a, nke e dere dị ka amụma, emezuola ugbu a, a na-abụkwa ya dị ka ezigbo abụ olili ozu.