Abụ Iru Uju Maka Taịa
Abụ ákwá maka Taịa, dị ka ụgbọ mmiri mara mma nke ukwuu, nke nwere mbadamba osisi fia, osisi sida mere ya ogwe ụgbọ, na ákwà linin Ijipt mere ya ákwà ụgbọ, ndị mmekọ ahịa a kpọrọ aha site n'ebe niile na-arụ ọrụ n'ime ya ma na-eju ya ngwongwo. Ifufe ọwụwa anyanwụ tiwara ya n'etiti oké osimiri, ndị ọkwọ ụgbọ mmiri nọ n'ikpere mmiri efesa ájá n'isi ha ma bụọ abụ a.
27 1Okwu Nna anyị rutere m aka, sị:
2“Ugbu a, gị onwe gị, nwa nke mmadụ, welie abụ akwa banyere Taịa, 3ma gwa Taịa, bụ onye bi nʼọnụ ụzọ oke osimiri, onye na-azụrụ ndị dị iche iche gafere ọtụtụ mpaghara mmiri ahịa: Ihe ndị a ka Nna anyị Onye Kachasị Elu kwuru: ‘Taịa, ị sịrị, “Abụ m onye zuru oke nʼịma mma.” 4Oke ala gị dị nʼetiti oke osimiri; ndị na-ewu gị mere ka ịma mma gị zuo oke. 5Ha ji osisi fia sitere na Senia wuo mbadamba osisi gị niile; ha weere osisi sida site na Lebanọn mee gị osisi ụgbọ mmiri. 6Ha ji osisi ook nke Bashan mee mkpara eji akwọ gị; ha ji ọdụ enyí nke etinyere nʼosisi saịprọs sitere na mpaghara mmiri Saịprọs mee elu ụgbọ gị. 7Ákwà ụgbọ gị bụ ezigbo akwa ọcha nke e ji eriri dụnye site nʼIjipt, nke na-arụkwa ọrụ dị ka ọkọlọtọ gị; akwa mkpuchi gị bụ nke acha anụnụ anụnụ na nke odo odo site na mpaghara mmiri Elaịsha. 8Ndị Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọ gị; ndị ikom gị nwere nka, gị Taịa, nọ nʼime gị dị ka ndị na-anya gị. 9Ndị okenye Gebal na ndị ya nwere nka nọ nʼime gị, na-emechi ọnya dị gị nʼahụ; ụgbọ mmiri niile nke oke osimiri na ndị ọkwọ ụgbọ ha bịakwutere gị ịzụ ngwa ahịa gị. 10Ndị Peshia na Lud na Put nọ nʼetiti ndị agha gị, bụ ndị gị dike nʼagha. Ha kokwasịrị ọta na okpu igwe agha ha nʼelu mgbidi gị, na-enye gị ebube. 11Ndị ikom Avad na ndị agha nke gị nọ nʼelu mgbidi gị gburugburu, ndị Gamad nọkwa nʼụlọ elu gị. Ha kokwasịrị ọta ha nʼelu mgbidi gị gburugburu; ha mere ka ịma mma gị zuo oke.
12“Tashish na gị na-azụ ahịa nʼihi ụba akụ gị dị ukwuu nke ụdị niile; ha ji ọlaọcha, igwe, tịn, na led gbanwere ngwa ahịa gị.
13“Javan, Tubal, na Meshek na gị na-azụ ahịa; ha ji ndị ohu na ngwongwo bronz na-azụrụ gị ngwa ahịa.
14“Site na Bet-Togama ka ha ji ịnyịnya, ịnyịnya agha, na mul gbanwere ngwa ahịa gị.
15“Ndị ikom Dedan na gị na-azụ ahịa; ọtụtụ mpaghara mmiri bụ ebe ahịa gị; ha ji ọdụ enyí na osisi eboni na-akwụ gị ụgwọ.
16“Aram na gị na-azụ ahịa nʼihi ngwa ahịa gị bara ụba; ha ji nkume turkoiz, akwa odo odo, ákwà e ji eriri dụnye, ezigbo akwa ọcha, koral, na nkume rubi gbanwere ngwa ahịa gị.
17“Juda na Izrel na gị na-azụ ahịa: ọka wit site na Minit, ọka a kwọrọ akwọ, mmanụ aṅụ, mmanụ, na mmanụ ọgwụ.
18“Damaskọs na gị na-azụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị, na ụba akụ gị dị ukwuu nke ụdị niile, ya na mmanya Helbọn na ajị anụ nke Zaha. 19Vedan na Javan site nʼUzal ji ihe gbanwee ngwa ahịa gị; igwe a kpụrụ akpụ, kasia, na kalamọs so na ngwa ahịa gị.
20“Dedan na gị na-azụ ahịa site nʼakwa a na-adọkwasị nʼelu ịnyịnya maka ịnya ịnyịnya.
21“Arebia na ndị isi niile nke Keda bụ ndị ahịa gị; ha ji ụmụ atụrụ, ebule, na ewu na-azụ ahịa na gị.
22“Ndị ahịa Sheba na Raama na gị na-azụ ahịa; ha ji ụda kachasị mma niile, nkume dị oké ọnụ ahịa ọ bụla, na ọlaedo na-akwụ gị ụgwọ nʼihi ngwa ahịa gị.
23“Haran, Kanne, na Iden, ndị ahịa Sheba, Ashọ, na Kilmad, na gị na-azụ ahịa. 24Ndị a na gị na-azụ ahịa nʼezigbo uwe, nʼakwa acha anụnụ anụnụ na nke e ji eriri dụnye, na nʼakwa kapet nke agba dị iche iche nke e ji eriri kee ma mee ka o sie ike, nʼebe ahịa gị. 25Ụgbọ mmiri Tashish bu ngwa ahịa gị dị ka ìgwè ndị ahịa. Ya mere, i jupụtara ma buru oké ibu nʼetiti oke osimiri. 26Ndị na-akwọ gị kpọpụtara gị baa nʼoké mmiri; ifufe si nʼọwụwa anyanwụ tịwara gị nʼetiti oke osimiri. 27Akụ gị, ngwa ahịa gị, ihe ahịa gị, ndị ọkwọ ụgbọ gị na ndị na-anya gị, ndị na-emechi ọnya gị, ndị na-azụ ahịa ngwongwo gị, na ndị dike nʼagha gị niile nọ nʼime gị, ya na ndị ọzọ niile nọ nʼụgbọ, ga-emikpu nʼetiti oke osimiri nʼụbọchị ọdịda gị. 28Nʼụda mkpu akwa nke ndị na-anya gị, mbara ala na-ama jijiji. 29Ndị niile na-ejide mkpara eji akwọ ụgbọ, ndị ọkwọ ụgbọ na ndị niile na-anya ụgbọ nke oke osimiri, ga-arịdata site nʼụgbọ mmiri ha; ha ga-eguzo nʼelu ala, 30ha ga-eweli olu ha nʼebe ị nọ ma kwaa akwa dị ilu. Ha ga-awụsa ájá nʼisi ha ma tụrụgharịa na ntụ; 31ha ga-akpụcha isi ha nʼihi gị ma yiri uwe mkpe, ha ga-akwakwa akwa nʼihi gị site nʼobi ilu, jiri iru uju dị ilu. 32Nʼiru uju ha, ha ga-abụ abụ akwa maka gị ma ruo uju nʼihi gị, sị: “Onye dịịrị ka Taịa, dị ka onye e mere ka ọ dere jii nʼetiti oke osimiri?” 33Mgbe ngwa ahịa gị si nʼoke osimiri pụọ, i mere ka ọtụtụ mmadụ nwee afọ ojuju; site nʼụba akụ gị na ihe ahịa gị, i mere ndị eze ụwa ọgaranya. 34Ugbu a, oke osimiri etiwaala gị nʼebe miri emi nke mmiri; ngwa ahịa gị na ndị ọrụ ụgbọ gị niile esoronụ gị mikpuo. 35Ndị niile bi na mpaghara mmiri nọ nʼoke egwu nʼihi gị, ndị eze ha na-amakwa jijiji nʼegwu; ihu ha gbarụrụ agbarụ. 36Ndị ahịa nọ nʼetiti ndị mmadụ na-afụ gị ọsụ; ị ghọọla ihe oke egwu, ị gaghị adịkwa ọzọ, ruo mgbe ebighị ebi.’”