Nna Na-ekpe Taịa Ikpe
Taịa na-erite uru n'ọdịda Jerusalem, na-atụ anya ahịa karịa ebe ọ bụ na e tiwara ọnụ ụzọ ámá ahụ. Nna anyị sịrị na mba dị iche iche ga-abịakwasị ya dị ka ebili mmiri. Nebukadneza ga-awaba mgbidi ya, a ga-atụba nkume ya n'oké osimiri, ebe ahụ ga-aghọkwa nkume tọgbọrọ chakoo, ebe a na-akwanye ụgbụ ka ha kpọọ nkụ.
26 1Nʼafọ nke iri na otu, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa, okwu Nna anyị rutere m, sị:
2Nwa nke mmadụ, nʼihi na Taịa kwuru megide Jerusalem, sị, ‘Ahaa! Ọnụ ụzọ ama nke ndị mba agbajiela, e megheela ya nye m. Ọ tọgbọrọ nʼefu; aga m aba ọgaranya.’ 3Ya mere, otu a ka Nna, Onyenwe ihe niile, sịrị: Lee, emegidere m gị, Taịa. Aga m eme ka ọtụtụ mba bilie megide gị, dịka oké osimiri si eme ka ebili mmiri ya bilie. 4Ha ga-ebibi mgbidi niile nke Taịa, kwatuokwa ụlọ elu ya niile; aga m akpụcha aja ya, hapụ ya ka ọ bụrụ naanị oke nkume gbara ọtọ. 5Ọ ga-aghọ ebe a na-agbasa ụgbụ nʼoké osimiri, nʼihi na ekwuola m, ka Nna, Onyenwe ihe niile, kwupụtara. Ọ ga-aghọkwa ihe a kwatara nʼagha nye mba niile, 6a ga-ejikwa mma agha gbuo obodo nta ya ndị dị nʼelu ala. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Nna.
7Otu a ka Nna, Onyenwe ihe niile, sịrị: Lee, aga m esite nʼugwu kpọta Nebukadneza eze Babilọn megide Taịa, bụ eze ndị eze, ya na ịnyịnya, ụgbọ agha, ndị na-agba ịnyịnya, na oké igwe ndị agha dị ukwuu. 8Ọ ga-eji mma agha gbuo obodo nta gị ndị dị nʼelu ala, wulie mgbidi nnọchibido megide gị, wuokwa ugwu aja megide gị, welikwa ọta megide gị. 9Ọ ga-eji ihe ọ na-eji akụda mgbidi tigbuo mgbidi gị, jirikwa anyụike ya kwatuo ụlọ elu gị niile. 10Ịnyịnya ya ga-adị ọtụtụ nke na uzuzu ha ga-ekpuchi gị. Mgbidi gị ga-ama jijiji nʼihi mkpọtụ nke ndị na-agba ịnyịnya, ụgbọ ibu, na ụgbọ agha, mgbe ọ ga-aba nʼọnụ ụzọ ama gị dịka ndị mmadụ si aba nʼobodo nke e tiwara mgbidi ya. 11Ụkwụ ịnyịnya ya niile ga-azọtọ okporo ụzọ gị niile. Ọ ga-eji mma agha gbuo ndị gị, ogidi gị niile siri ike ga-adakwa nʼala. 12Ha ga-akwakọrọ akụ gị, kwakọrọkwa ngwongwo ahịa gị, kwatuo mgbidi gị niile, bibie ụlọ gị ndị mara mma, tụba nkume gị, osisi gị, na unyi ala gị niile nʼime oké osimiri. 13Aga m eme ka ụzụ abụ gị kwụsị; a gaghịkwa anụ ụda ụbọ akwara gị ọzọ. 14Aga m eme gị ka ị bụrụ naanị oke nkume gbara ọtọ, ebe a na-agbasa ụgbụ. A gaghị ewugharị gị ọzọ, nʼihi na mụ onwe m, bụ Nna, ekwuola, ka Nna, Onyenwe ihe niile, kwupụtara.
15Otu a ka Nna, Onyenwe ihe niile, gwara Taịa: Ọ bụ na ala niile dị nʼakụkụ oké osimiri agaghị ama jijiji mgbe ha nụrụ ụda ọdịda gị, mgbe ndị e merụrụ ahụ na-asụ ude, mgbe ogbugbu juru nʼime gị? 16Mgbe ahụ, ndị niile na-achị obodo dị nʼakụkụ oké osimiri ga-esi nʼocheeze ha rịdata, yipụ uwe mwụda ha, yipụkwa uwe ha ndị a kpara akwa. Ha ga-eyikwasị onwe ha ịma jijiji dịka uwe, nọdụ ala nʼala, na-ama jijiji mgbe niile, tụọ egwu nke ukwuu nʼihi gị. 17Ha ga-eweliri gị abụ akwa, sị, ‘Lee ka i si laa nʼiyi, gị obodo a ma ama, gị bụ obodo ndị si nʼoké osimiri wee bawanye nʼọnụ ọgụgụ—gị onye dị ike nʼoké osimiri, gị na ndị bi nʼime gị, bụ ndị mere ka ndị niile bi nʼebe ahụ maa egwu!’ a a v17 Taịa bụ obodo bara ụba nke dị nʼagwaetiti, nke a wuru ike ya na ọnụ ọgụgụ ndị bi nʼime ya site nʼazụmahịa oké osimiri. 18Ugbu a, ala niile dị nʼakụkụ oké osimiri na-ama jijiji nʼụbọchị ọdịda gị; agwaetiti ndị dị nʼoké osimiri na-amakwa jijiji nʼihi nlaa gị nʼiyi.
19Otu a ka Nna, Onyenwe ihe niile, sịrị: Mgbe m ga-eme gị ka ị bụrụ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo ndị a hapụrụ kemgbe ogologo oge, mgbe m ga-eme ka ogbu mmiri bilie kpuchie gị, oké mmiri kpuchiekwa gị, 20mgbe ahụ, aga m eme ka gị na ndị na-arịda nʼolulu rịdakọta, bụ ndị oge ochie. Aga m eme ka i biri nʼala ala, nʼetiti ebe ndị dara ada kemgbe ochie, gị na ndị na-arịda nʼolulu, ka ị ghara ịlọghachi maọbụ inweta ọnọdụ gị nʼala ndị dị ndụ. 21Aga m eme ka ọgwụgwụ gị bụrụ ihe dị egwu, ị gaghịkwa adị ọzọ. A ga-achọ gị ma a gaghị achọta gị ọzọ, ka Nna, Onyenwe ihe niile, kwupụtara.