Amamihe Na-ewu Ụlọ
Iwu ụlọ na ịnapụta. Amamihe ka e ji ewu ụlọ, onye ezi omume na-ada ugboro asaa ma na-ebili. Ọ jụrụ obi ụtọ nke ọdịda onye iro, jụkwa ihe ngọpụ nke ịsị na anyị amaghị mgbe a na-edu ndị mmadụ gaa ọnwụ. Ubi vaịn ahịhịa kpuchiri na-akụzi ya.
24 1Enwela ekworo nʼebe ndị ajọ mmadụ nọ, achọkwala ịnọnyere ha, 2nʼihi na obi ha na-atụ atụmatụ ime ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwukwa banyere nsogbu.
3Ọ bụ site nʼamamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa site na nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike; 4ọ bụkwa site nʼihe ọmụma ka ime ụlọ ya niile ji jupụta nʼakụ niile dị oké ọnụ ahịa ma na-atọ ụtọ.
5Onye maara ihe jupụtara nʼike, onye nwere ihe ọmụma na-abawanyekwa ike ya, 6nʼihi na ọ bụ site na ndụmọdụ amamihe ka ị ga-eji buo agha gị, mmeri na-abịakwa site nʼaka ọtụtụ ndị na-enye ndụmọdụ.
7Amamihe dị elu nke ukwuu nʼebe onye nzuzu nọ; nʼọnụ ụzọ ama, o nweghị ihe ọ ga-ekwu. 8Onye ọbụla na-ezube ime ajọ ihe ka a ga-akpọ onye na-agba izu ọjọọ. 9Nzube onye nzuzu bụ mmehie, onye na-akwa emo bụkwa ihe arụ nʼebe ndị mmadụ nọ.
10Ọ bụrụ na ị daa mbà nʼoge nsogbu, ike gị dị ntakịrị. 11Zọpụta ndị a na-adọkpụ aga ọnwụ, jidekwa ndị na-asụ ngọngọ na-aga ebe a ga-egbu ha. 12Ọ bụrụ na ị sị, “Lee, anyị amaghị nke a,” ọ bụ na onye na-atule obi anaghị aghọta ya? Ọ bụ na onye na-eche mkpụrụ obi gị nche amaghị ya? Ọ gaghịkwa akwụghachi onye ọbụla dịka omume ya si dị?
13Nwa m, rie mmanụ aṅụ, nʼihi na ọ dị mma, mmiri na-asọpụta site nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-atọkwa gị ụtọ nʼọnụ. 14Mara na amamihe dị otu a nye mkpụrụ obi gị; ọ bụrụ na ị chọta ya, ọdịnihu dị, olileanya gị agakwaghị agwụ.
15Gị onye ajọ omume, ezola onwe gị iche megide ụlọ onye ezi omume; ebibila ebe izuike ya, 16nʼihi na ọ bụ ezie na onye ezi omume na-ada ugboro asaa, ọ na-ebilikwa ọzọ, ma ndị ajọ omume na-asụ ngọngọ daa nʼime mbibi.
17Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dara, ekwekwala ka obi gị ṅụrịa mgbe ọ sụrụ ngọngọ, 18ka Nna anyị ghara ịhụ ya nke ọ ga-adịghị ya mma, si otu a wepụ iwe ya nʼebe ọ nọ.
19Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ajọ ihe, enwekwala ekworo nʼebe ndị ajọ omume nọ, 20nʼihi na onye ajọ omume enweghị ọdịnihu; a ga-emenyụ oriọna ndị ajọ omume.
21Nwa m, tụọ Nna anyị na eze egwu, esonyerela ndị na-enupụ isi megide ha, 22nʼihi na mbibi ha ga-ebili na mberede, onye kwanụ maara ịla nʼiyi nke ha abụọ pụrụ iweta?
Ikpe Na-adịghị Ele Mmadụ Anya
23Ndị a bụkwa okwu ndị maara ihe: Ile mmadụ anya nʼikpe adịghị mma. 24Onye ọbụla na-asị onye ikpe mara, “Ị bụ onye aka ya dị ọcha,” ndị mmadụ ga-abụ ya ọnụ, mba dị iche iche ga-akatọkwa ya, 25ma ọ ga-adịrị ndị na-ama onye ikpe mara ikpe mma, ngọzị bara ụba ga-abịakwasịkwa ha. 26Ọsịsa ziri ezi dị ka isusu ọnụ nʼegbugbere ọnụ. 27Kwadebe ọrụ gị nʼèzí, dozie ala ubi gị, emesịa wuo ụlọ gị. 28Aghọla onye akaebe megide onye agbata obi gị nʼefu; ị ga-eji egbugbere ọnụ gị aghọgbu mmadụ? 29Esila, “M ga-emeso ya dịka o si mesoo m; m ga-akwụghachi nwoke ahụ dịka omume ya si dị.” 30A gafere m nʼakụkụ ala ubi onye umengwụ, nʼakụkụ ubi vaịnị onye na-enweghị uche, 31lee, ogwu etopụtara ya nʼebe niile; ala ahụ ahịhịa ndụ kpuchiri, mgbidi nkume ya adakwaala. 32Mgbe ahụ, elere m anya tụgharịa ya nʼobi m; ahụrụ m ya wee nata ndụmọdụ. 33Obere ụra, obere ịda nye nʼụra, obere ịchịkọta aka zuru ike, 34ụbịam ga-abịakwasịkwa gị dịka onye ohi, ụkọ ga-abịakwa dịka onye ji ngwa agha.