Job Welitere Olu Ya Ọzọ
N'ịṅụ iyi n'aha Chineke ahụ napụrụ ya ikpe ziri ezi, Job jụrụ ikweta na ndị enyi ya kwụ ọtọ; ọ ga-ejidesi iguzosi ike n'ezi omume ya ike ruo mgbe ọ nwụrụ. Mgbe ahụ ya onwe ya kọwara òkè onye ajọ omume: ọlaọcha a kpọkọtara nke ndị ezi omume ga-eyi, oké ifufe n'abalị, ụlọ dị ka ụlọ ududo.
27 1Job welitekwara okwu ya ọzọ, sị: 2“Dịka Chineke na-adị ndụ, onye napụrụ m ikpe ziri ezi m, na Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka mkpụrụobi m lụọ ilu, 3ogologo oge niile nkuume m dị nʼime m, Mmụọ nke Nna anyị dịkwa nʼimi m, 4egbugbere ọnụ m agaghị ekwu okwu ụgha, ire m agaghịkwa ekwu aghụghọ. 5Agaghị m ekweta ma ọlị na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m ahapụ izuoke m. 6Ana m ejidesi ezi omume m ike, agaghị m ahapụ ya; obi m adịghị ata m ụta nʼụbọchị ọbụla nʼime ndụ m.
7“Ka onye iro m dịrị ka onye ajọ omume, ka onye na-ebili megide m dịrịkwa ka onye na-emeghị ezi omume. 8Nʼihi na gịnị bụ olileanya onye na-asọpụrụghị Chineke, mgbe e bipụrụ ya, mgbe Chineke napụrụ ya ndụ ya? 9Chineke ọ ga-anụ mkpu ya mgbe nsogbu bịakwasịrị ya? 10Ọ ga-enwe obi ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile? Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile? 11Aga m akụziri unu banyere aka Chineke; agaghị m ezochi ihe dị nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. 12Lee, unu niile ahụworola nke a nʼonwe unu; gịnị mere unu ji ekwu okwu efu dị otu a? 13Nke a bụ oke onye ajọ omume si nʼaka Chineke, ihe nketa ndị mmegbu na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile: 14Ọ bụrụ na ụmụ ya dị ọtụtụ, ha ga-ada site na mma agha, ụmụ ya agaghịkwa enwe nri ga-ezuru ha. 15A ga-eji ọrịa na-efe efe lie ndị ya fọdụrụ ndụ karịa ya, ụmụ nwanyị ha di ha nwụrụ agaghịkwa akwa akwa. 16Ọ bụ ezie na ọ na-akpakọta ọlaọcha dịka uzuzu, na-ekpokọtakwa uwe dịka ụrọ, 17ọ pụrụ ịkpakọta ya, ma onye ezi omume ga-eyi ya, ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ahụ. 18Ọ na-ewu ụlọ ya dịka ụlọ nla, dịka ụlọ nche onye nche na-arụ. 19Ọ na-edina ala bụ ọgaranya, ma ọ gaghị emekwa otu a ọzọ; ọ na-emeghe anya ya, ihe niile efuola. 20Ihe egwu na-adakwasị ya dịka idei mmiri; nʼabalị, oke ifufe na-ebufu ya. 21Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebuli ya elu, ọ pụọkwa; ọ na-azachapụ ya site nʼebe ya. 22Ọ na-amakwasị ya na-enweghị ọmịiko; ọ na-achọsi ike ịgbanarị ike ya. 23Ọ na-akụ ya aka, na-afụkwa ya ọsụ ka o si nʼebe ya pụọ.”