Ihe Onye Na-egwu Ala Apụghị Igwupụta
Ndị na-egwu ala na-egwu ọwa n'ime nkume maka ọlaọcha na nkume safaya, na-aga ebe ọ dịghị egbe hụrụ. Ma a pụghị igwupụta amamihe ma ọ bụ zụta ya; ogbu mmiri na oké osimiri na-asị na ọ nọghị ebe a. Naanị Chineke maara ebe ọ dị, o wee gwa mmadụ: tụọ egwu Chineke, sikwa n'ihe ọjọọ wezụga onwe gị.
28 1“Nʼezie, e nwere ebe a na-egwuta ọlaọcha, na ebe a na-anụcha ọlaedo. 2A na-ewepụta igwe site nʼaja, a na-anụchakwa ọlakọpa site nʼnkume. 3Mmadụ na-akpa oke nye ọchịchịrị; ọ na-enyocha ruo nʼebe kachasị anya maka nkume igwe dị nʼọchịchịrị na nʼime oké onyinyo. 4Ọ na-egwu olulu miri emi nʼebe dị anya site nʼebe ndị mmadụ bi, nʼebe ụkwụ ọbụla na-azọbeghị; nʼebe ahụ, ha na-akwụfe ma na-amagharị, tere aka site nʼebe mmadụ ọbụla nọ. 5Ụwa—site na ya ka nri si abịa, ma a na-atụgharị ihe dị nʼokpuru ya dịka ọ bụ ọkụ. 6Nkume ya nwere nkume safaịa nʼime ha, aja ya nwekwara ọlaedo. 7Ọ bụ ụzọ nke nnụnụ na-adọgbu anụ na-amaghị, nke anya egbe na-ahụtụbeghị. 8Anụ ọhịa ndị na-anya isi azọtụbeghị ya, ọdụm agabigabeghịkwa nʼelu ya. 9Mmadụ na-atụ aka ya nʼelu nkume siri ike, na-akwatukwa ugwu ukwu site na mgbọrọgwụ ha. 10Ọ na-egwupụta ụzọ mmiri site nʼetiti nkume, anya ya na-ahụkwa ihe ọbụla dị oké ọnụ ahịa. 11Ọ na-egbochi iyi ndị na-asọ asọ, na-ewepụtakwa ihe ndị zoro ezo nʼìhè.
12“Ma amamihe—olee ebe a ga-achọta ya? Olee kwa ebe nghọta dị? 13Mmadụ amaghị ọnụ ahịa ya, a dịghịkwa achọta ya nʼala ndị dị ndụ. 14Ogbu mmiri na-asị, ‘Ọ dịghị nʼime m,’ oké osimiri na-asịkwa, ‘Ọ dịnyeghị m.’ 15A pụghị iji ọlaedo kacha mma zụta ya, a pụghịkwa iji ọlaọcha tụọ ọnụ ahịa ya. 16A pụghị iji ọlaedo nke Ọfịa tụnyere ya, maọbụ iji nkume ọniks dị oké ọnụ ahịa maọbụ safaịa. 17Ọlaedo na kristal enweghị ike iha ya, a pụghịkwa iji efere ọlaedo a nụchara anụcha gbanwere ya. 18Koral na kristal erughị ka a kpọtụ aha ha; ọnụ ahịa amamihe karịrị nkume rubi. 19Topaz nke Kush enweghị ike iha ya, a pụghịkwa iji ọlaedo a nụchara anụcha tụnyere ya.
20“Olee ebe, mgbe ahụ, amamihe si abịa? Olee kwa ebe nghọta dị? 21E zochiri ya site nʼanya ihe niile dị ndụ, e zokwara ya ọbụladị nʼebe nnụnụ nke mbara igwe nọ. 22Mbibi na Ọnwụ na-asị, ‘Anyị ejirila ntị anyị nụ asịrị gbasara ya.’
23“Chineke ghọtara ụzọ nke na-eduga na ya, ọ makwaara ebe ọ dị. 24Nʼihi na ọ na-ele anya ruo nʼoke nsọtụ ụwa, na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe. 25Mgbe o nyere ikuku ịdị arọ ya, ma tụọ mmiri niile nʼihe ọtụtụ, 26mgbe o nyere iwu maka mmiri ozuzo na ụzọ maka egbe eluigwe, 27mgbe ahụ, ọ hụrụ amamihe ma kwupụta ya; o hiwere ya ma nyochaa ya nke ọma.
28Ọ sịkwara ụmụ mmadụ, ‘Ịtụ egwu Chineke—nke ahụ bụ amamihe, ịsị nʼajọ omume wezuga onwe bụkwa nghọta.’”