Job Kwuru Okwu Ọzọ
Job na-echeta ihe ọ tụfuru: ụmụ ya gbara ya gburugburu, ọbụbụenyi Chineke kpuchiri ụlọ ikwu ya, nsọpụrụ nke obodo dum. Ọ bụ anya nye ndị ìsì na nna nye ndị nọ ná mkpa, o chekwara na ọ ga-anwụ n'agadi n'akwụ ya, ebube ya ka dị ọhụrụ.
29 1Job kwukwara okwu ọzọ sị: 2“Ọ gaara adị m mma ma ọ bụrụ na m dị ka m dịbu nʼọnwa ndị gara aga, dị ka nʼụbọchị ndị ahụ Chineke na-elekọta m, 3mgbe oriọna ya na-enwu nʼelu isi m, mgbe m jikwa ìhè ya na-aga ije nʼime ọchịchịrị; 4dị ka m dị nʼụbọchị oge m na-aga nke ọma, mgbe ọbụbụenyi miri emi nke Chineke dịgidere nʼelu ụlọikwuu m, a a v4 Job na-enwe mwute maka ịdị nso ahụ ọ maburu — ọbụbụenyi miri emi nke Chineke nʼelu ụlọ ya. Ọ ka amabeghị na Chineke ahụ ọ na-echeta bụ Nna ahụ obi ya na-ahapụghị ya; na ya onwe ya ga-ahụ ya tupu akwụkwọ a akwụsị. 5mgbe Onye pụrụ ime ihe niile ka nọnyeere m, mgbe ụmụ m gbara m gburugburu; 6mgbe nzọụkwụ m jupụtara na mmiri ara ehi, mgbe nkume wụpụtaara m iyi mmanụ. 7Mgbe m pụrụ gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo ma nọdụ ala nʼama ọha, 8ụmụ okorobịa hụrụ m wezuga onwe ha, ndị okenye biliri guzoro ọtọ; 9ụmụ eze kwụsịrị okwu ha ma were aka ha kpuchie ọnụ ha; 10olu ndị a ma ama dere jii, ire ha rapaara nʼelu ọnụ ha. 11Mgbe ntị nụrụ, ọ kpọrọ m onye a gọziri agọzi, mgbe anya hụrụ, ọ gbaara m ama, 12nʼihi na m napụtara ogbenye ahụ nke na-eti mkpu, na nwa ogbenye nke na-enweghị onye inyeaka. 13Ngọzi nke onye na-achọ ịla nʼiyi bịakwasịrị m, emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ nʼihi ọṅụ. 14Eyikwasịrị m onwe m ezi omume, ọ bụrụkwa uwe m; ikpe ziri ezi m dị ka uwe mwụda na akwa okpu nʼisi. 15Abụ m anya nye onye ìsì na ụkwụ nye onye ngwụrọ. 16Abụ m nna nye ndị nọ na mkpa, achọpụtakwara m okwu nke onye m na-amaghị. 17Agbajiri m eze onye ajọ omume ahụ ma dọpụta ihe ọ dọgburu site nʼeze ya. 18Ya mere m chere, sị, ‘Aga m anwụ nʼime akwụ nke m, mee ka ụbọchị m baa ụba dị ka aja.’ 19Mgbọrọgwụ m ruru na mmiri, igirigi dịgidekwara nʼalaka m ogologo abalị niile. 20Ebube m nọgidere dị ọhụrụ nʼime m, ụta m na-adịkwa ọhụrụ mgbe niile nʼaka m. 21Ụmụ mmadụ gere m ntị ma chere; ha gbara nkịtị na-eche ndụmọdụ m. 22Mgbe m kwuchara okwu, ha ekwukwaghị ihe ọzọ; okwu m dara nwayọọ nwayọọ nʼahụ ha. 23Ha chere m dị ka a ga-asị na ọ bụ mmiri ozuzo, saghekwa ọnụ ha dị ka ndị na-eche mmiri ozuzo oge opupu ihe ubi. 24Mgbe m mụmụrụ ha ọnụ ọchị, o siiri ha ike ikwere ya, ha jidesikwara ìhè nke ihu m ike. 25Ahọpụtaara m ha ụzọ ha ma nọdụ ala dị ka onyeisi ha; ebi m ndụ dị ka eze nʼetiti ndị agha ya, dị ka onye na-akasi ndị na-eru uju obi.”