Nna anyị na-akpọ ndị eze ka ha mee ikpe ziri ezi
Nna anyị zigara Jeremaya nʼụlọ eze nʼonwe ya. Josaya gbachitere ndị ogbenye, ihe gakwaara ya nke ọma; ụmụ ya ndị ikom ji osisi sida na ọrụ a na-adịghị akwụ ụgwọ ya ewu ụlọ. Shalum agaghị ahụ ụlọ ọzọ, a ga-eli Jehoiakim dị ka a na-eli ịnyịnya ibu, a ga-adọpụkwa Konaya dị ka mgbaaka akara.
22 1Ihe a bụ ihe Nna anyị kwuru: Gbadaa gaa nʼụlọ eze Juda ma kwuo okwu a nʼebe ahụ,
2ma sị: Nụrụ okwu Nna anyị, gị eze Juda, onye nọ nʼocheeze Devid—gị, ndị ozi gị, na ndị gị na-abanye nʼọnụ ụzọ ama ndị a. 3Ihe a bụ ihe Nna anyị kwuru: Mee ikpe ziri ezi na ihe ziri ezi; napụta onye a pụnarụ ihe nʼaka onye na-emegbu ya. Emejọla onye ọbịa ọbụla, nwa ogbenye na-enweghị nne na nna, maọbụ nwanyị di ya nwụrụ, emekwala ha ihe ike, awụfukwala ọbara onye aka ya dị ọcha nʼebe a. 4Ọ bụrụ nʼezie na i mee nke a, ndị eze nọ nʼocheeze Devid ga-abanye nʼọnụ ụzọ ama ndị a, na-agba ụgbọ agha na ịnyịnya—eze ahụ, ndị ozi ya, na ndị ya. 5Ma ọ bụrụ na ị gaghị ege ntị nʼokwu ndị a, eji m onwe m ṅụọ iyi, ka Nna anyị kwupụtara: ụlọ a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.
6Ihe a bụ ihe Nna anyị kwuru banyere ụlọ eze Juda: Ị dị m ka Gilead, ka elu Lebanọn—ma aga m eme gị ka ị ghọọ ọzara, obodo ebe ọ dịghị onye bi. 7Aga m edobe ndị mbibi iche imegide gị, onye ọbụla ya na ngwa agha ya; ha ga-egbutu osisi sida gị kacha mma ma tụba ha nʼime ọkụ.
8Ọtụtụ mba ga-esi nʼobodo a gafee ma jụrịta onwe ha, sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwu a ihe dị otu a?”
9Ha ga-aza, sị, “Nʼihi na ha gbahapụrụ ọgbụgba ndụ Nna ha, fee chi ndị ọzọ, ma jekwaara ha ozi.”
Nna anyị na-ekwu banyere Shalum
10Akwala akwa maka onye nwụrụ anwụ maọbụ ruo ya ụjụ; kama kwasie akwa ike maka onye na-apụ apụ, nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ ịhụ ala amụrụ ya.
11Ihe a bụ ihe Nna anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, eze Juda, onye ghọrọ eze nʼọnọdụ nna ya ma hapụ ebe a: Ọ gaghị alọghachi ọzọ. 12Ọ ga-anwụ nʼebe ha dọọrọ ya nʼagha ma ọ gaghị ahụkwa ala a ọzọ.
13Ahụhụ ga-adịrị onye ji ajọ omume wuo ụlọ ya, jirikwa ikpe na-ezighị ezi wuo ọnụ ụlọ elu ya, onye na-eme ka onye agbata obi ya rụọ ọrụ nʼefu ma ọ dịghị akwụ ya ụgwọ ọrụ ya, 14onye na-asị, “Aga m ewuru onwe m nnukwu ụlọ nwere ọnụ ụlọ elu sara mbara,” na-egwupụta oghereikuku sara mbara nye ya, jiri osisi sida machie ya, na-etekwa ya ụcha uhie na-egbu maramara.
15I na-achị dịka eze nʼihi na i ji osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị riri ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ma o mere ikpe ziri ezi na ezi omume, mgbe ahụ, ihe gaara ya nke ọma.
16O kwuchitere ọnọdụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, nʼihi ya, ihe gaara nke ọma. Ọ bụ na nke a abụghị ihe ọ pụtara ịmara m? ka Nna anyị kwupụtara. 17Ma anya gị na obi gị dị naanị nʼuru aghụghọ gị, nʼịwụfu ọbara onye aka ya dị ọcha, nakwa nʼime mmegbu na ihe ike.
18Ya mere, Nna anyị na-ekwu banyere Jehoiakịm nwa Josaya, eze Juda, sị: Ọ dịghị onye ga-eru ya ụjụ, sị, “Ewoo, nwanne m nwoke!” maọbụ “Ewoo, nwanne m nwanyị!” Ọ dịghị onye ga-eru ya ụjụ, sị, “Ewoo, onyenwe m!” maọbụ “Ewoo, ebube ya!” 19A ga-eli ya olili dịka olili ịnyịnya ibu—a dọkpụrụ ya, tụpụ ya nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem. 20Rigoro nʼelu Lebanọn tie mkpu; welie olu gị na Bashan; tie mkpu site nʼAbarim, nʼihi na a zọpịala ndị niile hụrụ gị nʼanya. a a v20 Abarim bụ ọtụtụ ugwu dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan, nso mbara ala Moab. 21Agwara m gị okwu nʼoge ahụ ihe gaara gị nke ọma, ma ị sịrị, “Agaghị m ege ntị.” Nke a bụụrụla ụzọ gị site na mgbe ị bụ okorobịa—ị geghị olu m ntị. 22“Ikuku ga-azụzasị ndị ọzụzụ atụrụ gị niile, a ga-adọtakwa ndị hụrụ gị nʼanya nʼagha; mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, a ga-emekwa gị ihere nʼihi ajọ omume gị niile. 23Gị onye bi na Lebanọn, onye mere akwụ nʼetiti osisi sida, lee ka ị ga-esi sụọ ude mgbe ihe mgbu ọmụmụ nwa ga-abịakwasị gị, oke ihe mgbu dịka nke nwanyị na-amụ nwa!”
24Dịka m na-adị ndụ, ka Nna anyị kwupụtara, ọ bụrụgodị na Konaya nwa Jehoiakịm, eze Juda, bụ mgbaaka akara dị nʼaka nri m, a ga m adọpụ gị. 25“Aga m enyefe gị nʼaka ndị na-achọ ndụ gị, ndị ị na-atụ egwu—Nebukadneza eze Babilọn na ndị Babilọn. 26Aga m atụba gị na nne gị, onye mụrụ gị, nʼala ọzọ, ebe a na-amụghị onye ọbụla nʼime unu—nʼebe ahụ ka unu ga-anwụ. 27Ma banyere ala ahụ ha na-agụ agụ ịlọghachi, ha agaghị alọghachi nʼebe ahụ ọzọ.”
28Nwoke a bụ Konaya, ọ bụ ite a ledara anya, nke tiwara etiwa, arịa ọ dịghị onye chọrọ ya? Gịnị mere e ji tufuo ya na ụmụ ya, tụba ha nʼala ha na-amaghị? 29Ala, ala, ala, nụrụ okwu Nna anyị!
30Ihe a bụ ihe Nna anyị kwuru: Dee nwoke a dịka onye na-enweghị nwa, nwoke na-agaghị enwe ọganihu nʼoge ndụ ya; nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla nʼime ụmụ ya ga-enwe ọganihu, ọ dịghị onye ga-anọdụ nʼocheeze Devid maọbụ chịakwa na Juda ọzọ.