Lee Ka Ọ Si Dị Mma Ịbụ Abụ Otuto
Nna anyị na-agụ kpakpando ma kpọọ nke ọ bụla aha ya, ọ na-ekechikwa ndị obi ha tiwara etiwa; ọ na-ezite snoo na mkpụrụ mmiri igwe, mgbe ahụ zite okwu na-agbaze ha. Ihe na-atọ ya ụtọ abụghị ike ịnyịnya ma ọ bụ ike mmadụ, kama ọ bụ ndị na-ele anya nʼịhụnanya ya.
147 1Haleluya! Lee ka ọ si dị mma ịbụku Nna anyị abụ otuto; lee ka ọ si atọ ụtọ ma kwesị ito ya.
2Nna anyị na-ewu Jerusalem; ọ na-achịkọta ndị Izrel a chụsasịrị achụsasị. 3Ọ na-agwọ ndị obi ha tiwara etiwa, na-ekekwa ọnya ha. 4Ọ na-agụ kpakpando niile ọnụ; ọ na-akpọ nke ọ bụla nʼime ha aha. 5Nna anyị, Onye na-achị achị, dị ukwuu, dịkwa ike nʼike; nghọta ya enweghị atụ. 6Nna anyị na-ebuli ndị dị umeala elu; ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
7Jirinụ ekele bụkuo Nna anyị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. 8Ọ na-eji igwe ojii kpuchie eluigwe; ọ na-ezite mmiri ozuzo nʼụwa; ọ na-eme ka ahịhịa too nʼugwu. 9Ọ na-enye anụmanụ niile nri ha, na-enyekwa ụmụ ugolọọma mgbe ha na-ebe akwa. 10Ọ naghị aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ịnyịnya, obi adịghịkwa ya ụtọ nʼihi ụkwụ mmadụ. 11Obi Nna anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, na nʼebe ndị na-atụkwasị obi nʼịhụnanya ọgbụgba ndụ ya nọ.
12Too Nna anyị, gị Jerusalem! Too Nna gị, gị Zayọn! 13Nʼihi na ọ na-eme ka mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị sie ike; ọ na-agọzi ụmụ gị nọ nʼime mgbidi gị. 14Ọ na-eweta udo nʼoke ala gị; ọ na-eji ọka wit kachasị mma mejupụta gị. 15Ọ na-ezipụ iwu ya nʼụwa; okwu ya na-agba ọsọ ngwa ngwa. 16Ọ na-enye snoo dịka ajị anụ; ọ na-efesasị igirigi oyi dịka ntụ. 17Ọ na-atụda mkpụrụ mmiri igwe ya dịka iberibe nri; onye pụrụ iguzo nʼihu oyi ya? 18Ọ na-ezipụ okwu ya mee ka mkpụrụ mmiri oyi gbaze; ọ na-akpali ikuku ya, mmiri na-asọkwa. 19Ọ na-ekwupụta okwu ya nye Jekọb, ụkpụrụ ya na mkpebi ya nye Izrel. 20O meghị ihe dị otu a nʼihi mba ọ bụla ọzọ; ha amaghị mkpebi ya. Haleluya!