Ihe Niile E Kere Eke, Toonu Ya
Ọkpụkpọ aha otuto site nʼelu ruo nʼala: ndị mmụọ ozi, anyanwụ na ọnwa, mgbe ahụ ihe e kere eke dị nʼoké osimiri, ihu igwe, ugwu, osisi, anụmanụ, ndị eze na ụmụaka. E kere ihe niile a kpọrọ aha site nʼiwu, a na-arịọkwa ihe niile ka ha zaa otu aha: Nna anyị.
148 1Haleluya! Toonu Nna anyị site nʼeluigwe; toonu ya nʼebe dị elu. 2Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile; toonu ya, usuu ndị agha ya niile. 3Toonu ya, anyanwụ na ọnwa; toonu ya, unu kpakpando niile na-enwu enwu. 4Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu, na unu mmiri nke dị nʼelu eluigwe. 5Ka ha too aha Nna anyị, nʼihi na o nyere iwu, e wee kee ha. 6O mere ka ha dịgide ruo mgbe niile ebighị ebi; o nyere iwu nke na-agaghị agabiga.
7Toonu Nna anyị site nʼụwa, unu ihe niile bi nʼoké osimiri na ebe niile dị omimi nʼime ya, 8ọkụ na akụ mmiri igwe, snoo na alụlụ, oké ifufe nke na-emezu okwu ya, 9ugwu ukwu na ugwu nta niile, osisi na-amị mkpụrụ na osisi sida niile, 10anụ ọhịa na anụ ụlọ niile, ihe na-akpụ akpụ na nnụnụ na-efe efe, 11ndị eze nke ụwa na mba niile, ndị isi na ndị niile na-achị ụwa, 12ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ nʼotu aka, ndị okenye na ụmụaka.
13Ka ha too aha Nna anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị nʼelu ụwa na eluigwe. 14O buliela ike nye ndị nke ya, otuto nye ndị niile na-ekwesị ntụkwasị obi ya, nye ụmụ Izrel, ndị nọ ya nso. Haleluya!